Raquel Naa Ayorkor Ammah

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Raquel Naa Ayorkor Ammah
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịGhana Dezie
Aha enyereRaquel Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya12 Ọgọọst 1987 Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye egwu Dezie

Raquel Naa Ayorkor Ammah (a mụrụ n'abalị iri na abụọ nke ọnwa Ọgọstụ n'afọ 1987) amaara aha nkwago ihe omume ya dị ka Raquel, bụ onye Ghana na-eti egwu, onye na-ede egwu, onye na-echeputa ma hazie egwu, onye na-eme ihe nkiri na onye edemede.[1][2] A maara ya nke ọma maka egwu ya bụ bu "Sweetio" nke gosipụtara Sarkodie.[1][2][3]

Mmalite ndụ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Raquel na United Kingdom site n'ọmụmụ nne na nna si Ghana.[1] O tolitere na West London ya na nne ya, ụmụnne ya nwoke abụọ na nwanne ya nwanyị.[2] Raquel gara ọtụtụ ụlọ akwụkwọ n'ihi na ezinụlọ ya kwahariri n'ọtụtụ ụlọ ugboro ole na ole. Otú ọ dị, ụlọ akwụkwọ kachasị amasị ya ka bụ Hogarth Primary School nke dị na Chiswick, na West Thames College.[2]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Raquel batara n'otiti egwu n'afọ 2005 ma kemgbe ahụ, ya na ndị n'eti egwu na mba ụwa dịka Mario, Movado, Young (U.S) Lloyd (U.S), Kas (Nigeria), Cabbo Snoop (Angola), Duncan Mighty (Nigeria), Stephanie Benson (UK / Ghana) na akụkọ ka egwu.[2][1] O wepụtara "Odo" dị ka egwu ya kachasịnụ n'ọnwa July 2010.[1]

Nnyeraka ọhaneze[dezie | dezie ebe o si]

Dị ka akụkụ nke ya na ntunye ọrụ mmekọrịta mmadụ na ibe ya, Raquel ewepụtala onwe ya ịbụ onye ndụmọdụ maka ọrụ ebere onwe ya n'ime obodo ya n'ime Ghana nke a na-akpọ Christ Humanitarian Foundation (CHF). Ọ na-arụ ọrụ dị ka onye na-akwado ọha na eze maka ntọala ahụ iji nyere ha aka inweta ego kwa afọ.[1]

Ihe nrite na nhọpụta[dezie | dezie ebe o si]

O ritere ihe nrite nke nwanyị nwere nka n'egwu kacha mma nke afọ 2012 bụ Best Female Artist 2012, na YFM All Star Weekend Awards, December, 2012. O nwekwara otu nhọpụta na Hip Hop na RnB Awards 2011.[1]

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 1.4 1.5 1.6 Raquel Profile. ghanaweb.com. Retrieved on 4 September 2017. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "profile" defined multiple times with different content
  2. 2.0 2.1 2.2 2.3 2.4 One-on-one interview with Raquel. modernghana.com. afromusion (2014-05-10). Retrieved on 4 September 2017. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "interview" defined multiple times with different content
  3. Adinkra (2014-06-25). Raquel – Sweetio (Feat Sarkodie). ghanandwom.net. Retrieved on 4 September 2017.