Rasheedat Ajibade

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Rasheedat Ajibade
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
obodo maka egwuregwuNaijiria Dezie
aha ezinụlọ yaAjibade Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya8 Disemba 1999 Dezie
Ebe ọmụmụMushin, Lagos Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye otu egwuregwu bọọlụ Dezie
ọnọdụ egwu na otu / ọpụrụichegaa n'ihu Dezie
ụdị egwuregwuFootbọl Dezie
so na2018 WAFU Women's Cup, 2017 Nigeria Women Premier League, 2018 Africa Women Cup of Nations, 2019 FIFA Women's World Cup Dezie

Àtụ:Infobox football biographyRasheedat Ajibade onye amụrụ na abalị asatọ n'ime ọnwa Disemba n'afo1999[1] bụ nwaafọ Naịjirịa maara egwuregwu bọọlụ na- agbara Avaldsnes IL bọọlụ na Toppserien na otu Nigeria women's national football team . Ajibade nọchitere anya Nigeria na asọmpi oyi ebiri, tupu ịgba asọmpi mbụ ya maka ndị otu egwuregwu na 2018 WAFU Cup na Côte d'Ivoire. Na 2017, a họ́pụ̀tàrà ya dịka otu n'ime mmadụ iri nke ndị egwuregwu bọọlụ na-eto eto kachasị mma na mpaghara Africa site na Goal.com . [2]

Rasheedat Ajibade

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Ajibade anọchitela anya Naịjirịa n'ogo afọ iri na asaa, ndị na- erubeghi afọ iri abụo nakwa ndị otu egwu bọọlụ sinịọ [3] Ọ nọọrọ-ndị òtù bọọlụ FC Robo n'egwu kemgbe oge Nigeria Women Premier League 2013 . Na 2014, edepụtara ya dị ka otu n'ime ndị N'eto eto ụ́kwụ́ na aghọ nko na ngalaba egwuregwu a. [4] N'ọ́nwa Septemba 2018, o meriri n'asọmpi egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị Naịjirịa nke ugboro abụọ áchàghị̀ acha. [5]

Ọrụ klọb[dezie | dezie ebe o si]

N'ime oge egwuregwu 2015 Nigeria Women Premier League izu nke abụọ, e depụtara aha Ajibade dịka ndị nlereanya nke izu ahụ, nke Soccerladuma South Africa chịkọbara, n'agbanyeghị na Confluence Queens meriri ha n'oge agba egwuregwu a. [6] N'oge 2017 Nigeria Women Premier League, emere Ajibade dịka kaptin ndị otu FC Robo . [7] Ajibade bụ otu n’ime ndị nyere akara ya na mmeri Robos n’ụlọ ha megide ndị Ibom Angels n’oge a. [8] Na 13 Julaị 2017, mgbe ndị ọbịa bịara bụ Rivers Angels merichara ndị òtù ya, Ajibade bụ onye SuperSport hotara iji mee ka ndị otu ya nwee ike iru Super 4, n'ihi ọdịiche dị na ákàrà na ọnụ ọgụgụ egwuregwu ole na ole fọdụrụ. [9] Ajibade meriri ḿbípụ̀tá mbụ nke Nigeria National Freestyle Championship, nke bụ asọmpi iji kwalite onyinye amara ònyé n'egwu bọọlụ . [10] Na 2017, agbanyeghị na Robo esoghị na otu egwuregwu ndị mechara, Ajibade bụ onye bọọlụ elegaara anya nke oge a ka o nyechara goolu asatọ iji zọpụta ndị otu ya. [11] Na Mee 2018, a họpụtara ya ka ọ bụrụ onye kacha mma n'egwu ball na 2017 Nigeria Women Premier League na Nigeria Pitch Awards . [12] Na Disemba 2018, a kọrọ na Ajibade bịanyere aka na nkwekọrịta afọ abụọ na akụkụ Norwegian, Avaldsnes IL, otu egwuregwu na -agba na Toppserien . [13] [14]

Ọrụ mba ụwa[dezie | dezie ebe o si]

N'asọmpi ndị mmeri n'Afrịka, ka ha na-aga asọmpi iko mba ụwa FIFA FIFA U-17 nke afọ 2014, Ajibade nwetara ọkpụ goolu abụọ maka mmeri mbụ Naịjirịa meriri Namibia. [15] ka asọmpi malitere, Ajibade nyere goolu mmeri na egwuregwu mbụ Naịjirịa na China . [16] N’egwuregwu bọọlụ ikpeazụ ha na Mexico, Ajibade nyere goolu na Naịjirịa, mmeri ọkpụ goolu abụọ iji kwalite ndọrọ ndọrọ ịbụ onye mmeri agba nke anọ ha na ndị Spen[17]

A kpọrọ Ajibade na Coach Bala Nikiyu 21-man squad maka 2016 FIFA U-17 Women World Cup, ma yiri jeesi nọmba 10. [18] [19] Na asọmpi a, Ajibade bụ kaptin ndị Naịjirịa, wee gwa FIFA.com na mkpebi nke otu a bụ ime nke ọma karịa agba nke anọ na nke ikpeazụ ha mechara n'afọ 2014. [20] Ajibade sokwa na ndị egwuregwu Naịjirịa na 2016 FIFA U-20 Women's World Cup, akpọrọ ya onye nwe-egwu n'otu egwuregwu nke abụọ ha na Canada . [21]

N'egwuregwu agba mbụ emere iji chọpụta onye nnọchi anya Afrịka na 2018 FIFA U-20 Women's World Cup, Ajibade nwetara ọkpụ goolu abụọ n'asọmpi mbụ ha gbara na Tanzania, nke nyere Naịjirịa ohere ọkpụ goolu atọ tupu agbaa bọọlụ na Dar e Sallam. [22] Na nlọghachite ịgbagharị egwuregwu, nke emere na Ọktoba 2017, Ajibade nyere goolu abụọ nke Naịjirịa ji ọkpụ goolu isii merie ndị be ha. [23] Na 27 Jenụwarị 2018, Ajibade nyere goolu abụọ na mmeri isii nke Nigeria meriri South Africa, mmeri ahụ gosipụtara ntozu Nigeria maka 2018 FIFA U-20 Women World Cup na France. [24]

Na February 2018, Ajibade n'akụkụ Joy Jegede, Osarenoma Igbinovia na ndị egwuregwu iri na asatọ ndị ọzọ họpụtara site n'aka onye isi nchịkwa, Thomas Dennerby ka ọ nọchite anya Nigeria na mbipụta mmalite nke WAFU Cup na Côte d'Ivoire. [25] N'egwuregwu bọọlụ nke abụọ n'asọmpi mpaghara ahụ, Ajibade gbaturu ọkpụ atọ butere Naịjirịa na ọkara-ikpeazụ ya na-agba egwuregwu mbụ. [26] [27]

Ajibade so na otu egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị mba 2018 Afrịcan Nations Championship Nigeria women's national football team ebe o meriri asọmpi a tinyere ndị otu ahụ. [28]

Mgbali[dezie | dezie ebe o si]

Nke onwe[dezie | dezie ebe o si]

  • League Bloggers Award - 2017 Nigeria Women Premier League Player of the season [29]
  • Nigeria Pitch Awards - 2017 Nigeria Women Premier League Player of the season [30]
  • Nwanyị Naịjirịa Premier League nke afọ 2017 - Onye kacha nye goolu ( ya na Reuben Charity ) [31]
  • Nigeria Football Federation - young player of the year 2018 [32]
  • 2018 WAFU women's Cup onye nke kachasị nye goolu (ejikọtara Ines Nrehy na Janet Egyir )

Otu[dezie | dezie ebe o si]

  • 2014 FIFA U-17 Women's World Cup - Nkeji nke ikpeazụ
  • WAFU Cup nke ụmụ nwanyị 2018 - nke atọ [33]

Nrụtụaka[dezie | dezie ebe o si]

  1. R. AJIBADE.
  2. Top 10: African most promising women footballers to watch in 2018.
  3. Costa Rica 2014: Nigeria’s U17 Women Coach names 21 players.
  4. The Top Young Talent In Nigerian Women's Football (19 June 2014).
  5. Oludare, Shina. Rasheedat Ajibade retains Nigeria women freestyle crown.
  6. NWPL Team Of Round Two (12 May 2015). Archived from the original on 20 February 2018. Retrieved on 13 November 2020.
  7. Champions Rivers Angels stay in touch with Bayelsa Queens after easy win at Robo Queens (13 July 2017). Archived from the original on 20 February 2018. Retrieved on 13 November 2020.
  8. Ogbonda rues loss at FC Robo.
  9. Ajibade unsure of NWFL Super Four.
  10. McCarthy Obanor, Rasheedat Ajibade emerge Nigeria Freestyle Football Champions (25 July 2017). Archived from the original on 3 June 2019. Retrieved on 13 November 2020.
  11. LBA 2017 Takes Centre Stage in Lagos (24 November 2017).
  12. Mikel, Moses lead nominations for fifth edition (11 May 2018).
  13. Norwegian outfit Avaldsnes sign Rasheedat Ajibade from FC Robo Queens (26 December 2018).
  14. Rasheedat Ajibade: Nigeria's rising star moves to Norway.
  15. FIFA U-17 Women’s World Cup Qualifiers: Flamingoes Whip Namibia’s Baby Gladiators. Archived from the original on 2018-12-26. Retrieved on 2020-11-13.
  16. Under 17 Women’s World Cup: Nigeria Edge China.
  17. FIFA U-17 Women’s World Cup: Nigeria beat Mexico 3 – 0, to take on Spain in quarter-final.
  18. NFF Announces Kit Numbers : Rasheedat Ajibade 10, Patience Dike 3, Omokwo 9.
  19. Prolific Strikers Rasheedat Ajibade, Aku Headline Nigeria 21-Player World Cup.
  20. Flamingoes Captain Ajibade: We Must Score Vs Korea And Advance. Archived from the original on 2018-02-20. Retrieved on 2020-11-13.
  21. Rasheedat Ajibade Shines As Nigeria Win 3–1 Against Canada.
  22. Rasheedat Ajibade at the double as Falconets thrashed Tanzania in Benin-city (16 September 2017).
  23. Nigeria demolish Tanzania 6–0 in World Cup qualifier.
  24. South Africa proved no match for Nigeria, says Rasheedat Ajibade. Archived from the original on 2019-07-02. Retrieved on 2020-11-13.
  25. Samuel, Ahmadu (12 February 2018). FC Robo Queen's Rasheedat Ajibade tops Nigeria women squad for 2018 Wafu Women's Cup.
  26. WAFU: Falcons thrash Senegal 3–0 to qualify for semi-finals (17 February 2018).
  27. Rasheedat Ajibade hat-trick fires Super Falcons to WAFU Cup semis. Archived from the original on 2018-02-17. Retrieved on 2020-11-13.
  28. Published. Coach names final Super Falcons squad for 2018 Women AFCON (en-US).
  29. Okpotu Wins LBA/NPFL Player Of The Season Award + Full List Of Winners. Eagle Online. Retrieved on 17 February 2018.
  30. Mikel miss out as Moses, Ndidi, others win 2017/2018 Nigeria Pitch Awards. Retrieved on 28 July 2018.
  31. Top 10: African most promising women footballers to watch in 2018. Archived from the original on 20 February 2018. Retrieved on 18 February 2018.
  32. Moses, Oshoala Win at Maiden Aiteo/NFF Awards. Retrieved on 23 February 2018.
  33. Super Falcons Outscore Mali To Claim WAFU Women’s Cup Bronze. Archived from the original on 2018-02-27. Retrieved on 2020-11-13.