Rebecca Naa Dedei Aryeetey
| Ụdịekere | nwanyị |
|---|---|
| Mba o sị | Ghana, Gold Coast Colony |
| Aha enyere | Rebecca |
| Aha ezinụlọ ya | Aryeetey |
| Aha pseudonym | Dedei Ashikishan |
| Ụbọchị ọmụmụ ya | 1923 |
| Ebe ọmụmụ | Osu |
| Ụbọchị ọnwụ ya | 22 Jụn 1961 |
| Ebe ọ nwụrụ | Ho |
| Ụdị ọnwụ | Ịgbụ mmadụ |
| Ihe kpatara ọnwụ | abdominal pain, poison |
| Onye dị ịrịba ama | Kwame Nkrumah |
| Asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | English, Ga |
| Ọrụ ọ na-arụ | onye ọchụnta ego, Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị, feminist, political activist |
| Ebe obibi | Kokomlemle |
| Ebe ọrụ | Accra |
| Onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị | Convention People's Party |

Rebecca Naa Dedei Aryeetey (1923 – 22 June 1961) nke a makwaara dị ka Dedei Ashikishan bụ nwanyị ọchụnta ego Ghana, onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị na onye na-akwado nwanyị. A maara ya nke ọma maka azụmahịa ntụ ọka ya na Accra . Ọ bụkwa nwanyị nọ na mkpụrụ ego Pesewas iri ise nke Ghana. [1] [2]
Mbido Ndụ
[dezie | dezie ebe o si]A mụrụ Rebeca Naa Dedei na 1923, na Osu o wee tolite na James Town, Accra. Nne ya bu onye Ga Asere ebe nna ya bụ onye Osu.
Ọrụ
[dezie | dezie ebe o si]Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ praịmarị, Naa Dei banyere azụmahịa ntụ ọka. [2] Ọ ghọrọ ọgaranya na onye nwere mmetụta site na azụmahịa ntụ ọka ya nke mere ka ọ bụrụ 'Ashikishan', okwu Ga nke pụtara ntụ ọka. [1] A maara ya dị ka onye isi n'ahụ maka ihe gbasara ego nke pati CPP mgbe ahụ ma duru ihe omume ụmụ nwanyị CPP n'ụlọ ya na Kokomlemle - Accra. Dịka onye ndọrọndọrọ ọchịchị nke CPP, ọ ma kwadoro Nkrumah na pati CPP [2] wee rụọ nnukwu ọrụ n'oge Ghana Ghana na-agba mgba iji nweta nnwere onwe. [1] O nyere Nkrumah ego ka o nweta oche kansụl omebe iwu Ashiedu Keteke nke mere ka ọ bụrụ onye isi ala Ghana mbụ. [2] [3]
Ọnwụ
[dezie | dezie ebe o si]Ịbịaru Nkrumah nso mere ya ka ọ bụrụ onye iro nke otu ndọrọndọrọ ọchịchị nke ekwuru na ọ bu ya mere ka ọ nwụọ n'oge. Ọ nwụrụ n'ụzọ dị mwute n'ọgbakọ CPP na Ho na 22nd June 1961 mgbe ọ dị afọ 38. [3] E boro ebubo na ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ndị na-ahụ maka nkwado nwanyị bụ ndị enyere ihe na-egbu egbu n'ọgbakọ ahụ mgbe ha ṅụchara tii dị ọkụ ọ malitere mewe mkpesa maka afọ mgbu. [2]
Nkwanye ugwu
[dezie | dezie ebe o si]Ụgbọ ala abụọ nke Harry Sawyer butere na Accra bụ aha ya 'Auntie Dedei', o nwekwara ihe oyiyi ya na stampụ mba yana na mkpụrụ ego pesewa iri ise nke Ghana, ha niile na-asọpụrụ ya. [3]
Ebensidee
[dezie | dezie ebe o si]- 1 2 3 Rebecca Naa Dedei Aryeetey, a woman whose image is on 50 Pesewas Coin – Her Profile And Death (en-US). Ghana News Punch (2020-04-07). Archived from the original on 2020-04-08. Retrieved on 2020-04-08.
- 1 2 3 4 5 Rebecca Naa Dedei Ayitey: The lady on Ghana's 50pesewas and an Independence shero (en-US). Bra Perucci Africa (2020-04-07). Retrieved on 2020-04-08.
- 1 2 3 Tetteh. Rebecca Naa Dedei Aryeetey: The Illustrious Ga Woman Celebrated On The 50 Pesewas Coin - Kuulpeeps - Ghana Campus News and Lifestyle Site by Students (en-US). Retrieved on 2020-04-08.