Reman Malay
obere ụdị nke | Malay ![]() |
---|---|
mba/obodo | Malaysia, Thailand ![]() |
ụmụ amaala ka | Baling, Padang Terap, Q1884759, Yan ![]() |
dialect of | Malay ![]() |
ụdị asụsụ | agglutinative language ![]() |
usoro ederede | Malay alphabet ![]() |
Ọkwa asụsụ Ethnologue | no value ![]() |
Reman Malay (Reman: Cakak Reman/Ulu, Jawi: بهاس ملايو رمان, Malay: Bahasa Melayu Reman), nke a makwaara site na ọtụtụ aha dịka Patani, Baling, Grik na Tukugho, bụ asụsụ Malay nke a na-asụ na steeti Kedah na Perak na ugwu Peninsular nke Malaysia. Na steeti Kedah, a na-asụ ya na mpaghara Baling, Padang Terap, Sik na Yan ebe na Perak a na- asụ ya na Hulu Perak [1] kamakwa n'ebe ụfọdụ n'ime mpaghara Kerian na Larut, Matang na Selama, ọkachasị n'obodo Batu Kurau na Bukit Gantang. [2]'Agbanyeghị na ọ dị n'ime steeti abụọ a, Reman Malay enweghị njikọ doro anya onwer metụta udi Khoda na Perakian dị nso kama ọ bụ ihe jikọrọ ya na ya ma ọ bụ nkewa nke Kelantan-Patani Malay.
Akụkọ ihe mere eme na mmalite
[dezie | dezie ebe o si]Aha Reman sitere na alaeze Malay nke Reman, alaeze n'enwechaghị onwe ya nke bụ akụkụ confedrashon nke Greater Patani . Reman dị site na mmalite narị afọ nke iri na itoolu ruo mgbe a gbasara ya na afọ 1902. Alaeze a chịrị ihe bụzi ugwu Perak (Hulu Perak) yana ndịda Yala (nke bụzi akụkụ nke Thailand). Mgbe Nkwekọrịta 1909 gasịrị, e kewara alaeze ahụ ụzọ abụọ, ebe ugwu ghọrọ akụkụ nke Siam ebe ndịda ghọrọ akụkụ nke Perak. Nke a kewara obodo Reman Malay. A ka na-eji aha Reman eme ihe taa dị ka aha mpaghara dị na mpaghara Yala. Esemokwu na-aga n'ihu n'etiti Siam na Patani na narị afọ nke iri na asatọ na nke iri na itoolu mere ka ọtụtụ ndị Patani Malay (gụnyere ndị si Reman) kwaga n'ebe ọdịda anyanwụ, n'ime steeti Kedah. [3][2] Ha ghọrọ ihe ka ọtụtụ n'ọtụtụ mpaghara nke steeti ahụ ma ana-agwakọta ya na ndị obodo Khoda na Perakian, nke mepụtara olundị Baling na Gerik nke oge a.
Ụdị dị iche iche
[dezie | dezie ebe o si][1]Agbanyeghị obere mpaghara ogige ya na ọnụ ọgụgụ ndị bi na ya, Reman Malay na-egosipụta ụdị dị iche iche dị elu nke dị iche ọ bụghị naanị n'etiti steeti na mpaghara kamakwa n'etiti obodo na obodo nta. Enweghị nkwekọrịta banyere ụdị Reman ole dị ebe ahụ mana a na-ekewa ha dabere na nkewa ala nke bụ Baling, Grik ma ọ bụ Hulu Perak na Batu Kurau. Nke ọ bụla n'ime ụdị ndị a nwere okwu pụrụ iche na ụdaolu nke ha mana ha ka nwere njikọ doro anya metụta ibe ha. N'ihi nnọpụiche ya na ọnụ ọgụgụ dị nta nke ndị na-asụ asụsụ a, ndị na-asụ asụsụ Khoda na Perakian yana ndị na-asụ asụsụ Standard Malay anaghị aghọta ya.
Ntụnyere
[dezie | dezie ebe o si]N'okpuru ebe a bụ ụfọdụ n'ime ntụnyere dị n'etiti udi asụsụ Reman Malay yana asụsụ Malay na olundị ndị ọzọ na Peninsular Malaysia.
Standard Malay | Reman (Gerik/Hulu Perak) | Reman (Baling) | Kelantan-Pattani | Terengganu | Pahang | Kedah | Perak | Transliteration |
---|---|---|---|---|---|---|---|---|
Pergi | Gi | Gi | Gi | Gi | Gi | Pi | Pegi, Gi | Went |
Mereka | Demã | Demã | Demo | Deme | Deme | Depā, Lepā | Deme | They |
Kamu | Mikã | Mohã, Humã | Mung | Mung | Aok | Hampā, Hang | Mike, Kome | You |
Kami | Khumã | Khumã | Kami, Kito | Kaming, Kite | Kome | Sepā | Keme | We |
Tidak Mahu | Tak Moh | Tak Mboh | Tok Sey | Tak Mboh | Tak Mboh | Tak Mau | Tak Sio | Do Not Want |
Faham | Paha | Paha | Pehe | Pahang | Paha | Paham | Paham | Understand |
Sangat Manis | Manih Letting | Manih Letting | Manih Letting | Manih Letting | Manih Meletiang | Manih Melecaih | Manih Meletin | Very Sweet (taste) |
Edensibia
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ 1.0 1.1 Nur Habibah C. H. (2020). "Varian Hulu Perak Utara: Fenomena Digerik dan Pengkalan Hulu" (in ms). Jurnal Melayu 19 (2): 216–243.
- ↑ 2.0 2.1 Mohd Noor Aswad (2 November 2019). Getting to Know the Unique Baling Dialect (en). New Straits Times. Retrieved on 27 January 2022.
- ↑ Nor Hashimah Jalaluddin (2015). "Penyebaran Dialek Patani di Perak: Analisis Geolinguistik (The Dissemination of Pattani Dialect in Perak: A Geolinguistics Analysis)" (in ms). Melayu: Jurnal Antarabangsa Dunia Melayu 8 (2): 310–330.