Remi Vaughan-Richards

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Remi Vaughan-Richards
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
aha n'asụsụ obodoRemi Vaughan-Richards Dezie
Aha ọmụmụRemi Vaughan-Richards Dezie
Aha enyereRemi Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya20. century Dezie
Ebe ọmụmụNaijiria Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye nhazi ndu ihe nkiri Dezie
ebe agụmakwụkwọRoyal College of Art, Kingston University Dezie
okpukpere chi/echiche ụwaEfefe Kraịst Dezie
Ụcha ime anyabrown Dezie
ụcha ntụtụ isiNtụtụ ojii Dezie
nnọchiaha nkeonweL484 Dezie

Remi Vaughan-Richards bụ onye na-eme ọrụ ihe nkiri na Naijiria.

Mmalite ndu na mmuta[dezie | dezie ebe o si]

Amụrụ Remi na Naijiria[1], otu n'ime ụmụ anọ amụrụ Alan Richards, onye Britain na-ese ụkpụrụ ụlọ, na Ayo Vaughan (1928-1993)[2], onye nọọsụ nke sitere n’ezinaụlọ Lagos a ma ama bụ onye nna nna ya bụ onye ọrụ aka America oge ochie bụ Scipio Vaughan[3].

Ọ gụrụ akwukwo na Mahadum Kingston[4] na Royal College[5] dị na London.

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Vaughan-Richards malitere ọrụ nkiri ya na ngalaba ihe ọsịse, ebe ọ rụrụ ọrụ na fim dịka Judge Dredd (1995) na Eyes Wide Shut (1999)[6].

N'afo 2015, Remi Vaughan-Richards duziri ihe nkiri The Department nke egosiri na mmemme fim the Lights, Camera Africa!!! emere na Lagos. Ndi BBC kpọọrọ ya ọrụ iduze ọtụtụ ihe nkiri dịka Wetin Dey na One Small Step. Na 2015, Pulse magazin kpọrọ ya dịka otu n'ime ụmụ nwanyị itoolu "ndị isi nchịkwa ihe nkiri na Naịjirịa ị kwesịrị ịma" na ụlọ ọrụ ihe nkiri Nollywood[7].

Vaughan-Richards nọrọ afọ isii na-eke Faaji Agba (2016), ihe nkiri banyere akụkọ ihe mere eme nke ịtị egwu na Lagos, dị ka ndị na-akụ egwu ochie kwuru site na onye nwe ụlọ ahịa ihe egwu bụ Kunle Tejuoso[8]. Ọ na-arụ ọrụ dika onye okike na nduzi na ụlọ ọrụ ya, Singing Tree Films[9]. A họpụtara ka-egosi ihe nkiri Unspoken na ogbako nke gbasara ndị ọrụ fim na mba Afrika (AFRIFF) emere na na Lagos[10]. N'afo 2019, e gosịpụtara Vaughan-Richards na ndị otu ọrụ ihe nkiri na Polaris katalọgụ[11].

Ndụ ya n'ime[dezie | dezie ebe o si]

Vaughan-Richards bi n’ụlọ akpọrọ Alan Vaughan-Richards House na Lagos, nke nna ya Alan wuru. Ọ nọkwa na-arụsi ọrụ ike na ichekwa ụlọ ahụ na akwụkwọ nna ya, na ihe gbasara ese ụkpụrụ ụlọ na Lagos. Ndị nna nna ya gụnyere Yoruba, British na Cherokee.

Hụ kwa[dezie | dezie ebe o si]

Ebe m si dee[dezie | dezie ebe o si]

  1. "We need to create our own stories: Remi Vaughan-Richards" British Council Arts.
  2. Alan Vaughan-Richards African Modernism Archive, Edinburgh College of Art satellite sites (2012).
  3. Darlene Gavron, "Ayo Vaughan-Richards: 'I was Taught that I Can Do Whatever a Man Can Do'" Chicago Tribune (29 May 1988).
  4. Remi Vaughan-Richards. Retrieved on February 27, 2018.
  5. Beti Ellerson, "British-Nigerian Remi Vaughan-Richards talks about “Faaji Agba”, her passion for cinema, and the two cultures she embraces" African Women in Cinema Blog (19 October 2015); blog of the Centre for the Study and Research of African Women in Cinema.
  6. About the Director, African Film Festival New York.
  7. 9 Nigerian female movie directors you should know. Pulse. Retrieved on 20 September 2016.
  8. Otsholeng Poo, "Remi Vaughan Richards Discusses Her Award Winning Documentary, ‘Faaji Agba’" Konbini (February 2016).
  9. Beti Ellerson, "British-Nigerian Remi Vaughan-Richards talks about “Faaji Agba”, her passion for cinema, and the two cultures she embraces" African Women in Cinema Blog (19 October 2015); blog of the Centre for the Study and Research of African Women in Cinema.
  10. "6th AFRIFF announces festival programmes" AFRIFF (17 October 2016).
  11. "Shehab, Bobby, Tosin Oshinowo, others featured on Visual Collaborative", 2 April 2019. Retrieved on 2 May 2019.