Rimini Makama

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Rimini Makama
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1980 Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye ọka iwu, onye ọchụnta ego Dezie
ebe agụmakwụkwọUniversity of London, University of Reading, University of Jos Dezie
Ebe obibiLagos Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)2007 Dezie

Rimini Haraya Makama, bụ onye ọkàiwu na onye nduzi nke mmekọrịta ọha na gọọmentị na Microsoft Naijiria.[1]

Ndabere na agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

Amụrụ ya na Jos, Plateau[2] steetị Naijiria[3]. Ọ gụrụ akwụkwọ ọkàiwu na Mahadum Jos, ma nweta nzere mastas na Mahadum Reading[4].

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Rimini Haraya Makama bụ Onye Nchịkwa ihe gbasara gọọmentị na Microsoft MEA. Ọ bu onye ọkachamara n'ihe metụtara gọọmentị na ịhaziri ndị ọha ihe teknụzụ na otu ojiji ya na-emetụta ndi oha.

Ọ na-ahụ maka ijikwa mmepe na mmejuputa atumatu ndị Microsoft na ngalaba obodo niile ebe ha metụtara mmekọrịta nke ụlọ ọrụ ahụ. Ọ na-eme ka mmekọrịta nke ụlọ ọrụ ya dịkwuo omimi na ndị isi gọọmentị, ndị na-achịkwa usoro iwu, ndị ome iwu, nzukọ mba na ndị agụmakwụkwọ[5][6][7]

Tupu ọ banye na Microsoft, ọ bụ onye isi maka okwu mkparịta ụka, Africa Practice ebe ọ webatara ụfọdụ ụlọ ọrụ mba buru ibu na EMEA bata n'ahịa Naijiria ma na-enyere aka ịhazi ha dịka ndị mmekọ dị mkpa na ahia ọrụ ha ma gbaa ndị mba ọzọ ume itinye ego na n'ahia ahụ. Ọ bụbụ onye isi na-enyere aka maka iwu na Office nke Iwu na International Criminal Police Organization - ICPO - INTERPOL na Lyon, France.

Rimini nwere LLB na Mahadum Jos, Nigeria, BL na ụlọ akwukwo ọkọaiwu nke Naijiria, LLM na International Law & World Order si Mahadum Reading, UK, yana CIM Diploma na London School of Marketing. Na 2014, Forbes matara ya dị ka otu n'ime ụmụ agbọghọ iri abụọ na-erubeghi afọ iri anọ ma si ike na mba Afrika. Ọ bụ onye isi hụrụ maka ihe nkiri 2016 Green White Green nke pụtara n'ọtụtụ memme nkiri mba dị iche iche gụnyere Toronto International Film Festival. Mmasị ya gụnyere mmepụta ihe nkiri na ụlọ ahịa ejiji.

Ihe ndị ọzọ[dezie | dezie ebe o si]

Na ọnwa Disemba 2014, Forbes dere na Rimini Makama bụ otu n'ime ụmụ nwanyị iri abụọ kachasị ike n'Africa.[8]

Hụ kwa[dezie | dezie ebe o si]

Ebe m si dee[dezie | dezie ebe o si]

  1. The Editor (8 October 2016). Microsoft Nigeria appoints Makama, Amah as director, CTO.
  2. Rimini Makama from Gindiri appointed into the executive board of Microsoft Nigeria. View Point Nigeria (VPN) (8 October 2016). Archived from the original on 1 December 2017. Retrieved on 26 November 2017.
  3. Nsehe, Mfonobong (4 December 2014). The 20 Youngest Power Women Under 40 In Africa 2014. Retrieved on 26 November 2017.
  4. Makama, Rimini (26 November 2017). Rimini Makama: Head of Corporate & Government Affairs, Microsoft Nigeria. LinkedIn. Retrieved on 26 November 2017.
  5. The Editor (8 October 2016). Microsoft Nigeria appoints Makama, Amah as director, CTO.
  6. Makama, Rimini (26 November 2017). Rimini Makama: Head of Corporate & Government Affairs, Microsoft Nigeria. LinkedIn. Retrieved on 26 November 2017.
  7. Jaiyesimi, Adedoyin (12 October 2016). ICYMI: Ms. Rimini Haraya Makama is Microsoft Nigeria’s new company’s Corporate Affairs Director. Leading Ladies Africa Organization. Retrieved on 26 November 2017.
  8. Nsehe, Mfonobong (4 December 2014). The 20 Youngest Power Women Under 40 In Africa 2014. Retrieved on 26 November 2017.