Jump to content

Ronke Doherty

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Queenie Ronke Doherty bụ onye ndú ụmụ nwanyị Naijiria bụ onye isi oche nke mba kansul nke umu nwanyi obodo site na 1976 ruo 1980. Ọ bụ otu n'ime ụmụ nwanyị ole na ole a họpụtara n'ọkwa ndọrọ ndọrọ ọchtịchị n'afọ ndị 1970.[1]

Ọ bụ nwunye Richard Adeeyo Doherty, onye bụbu onye isi oche nke ulo nzuko odida anyanwu .[2]

Ndụ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Doherty (onye a mụrụ Williams) n'ihe dị ka n'afọ 1916 n'ezinụlọ Nathaniel Fehintola Williams onye sitere n'ihe nketa Egba, ọ gụrụ akwụkwọ na ulo akwukwo umu nwanyi nke CMS tupu ọ gaa Queen's College, Lagos na 1930, na-emecha akwụkwọ na 1934.[2][3] Ọ bụ ezie na, Doherty tolitere na Lagos ochie, ebe ụmụ agbọghọ nwere ohere ole na ole karịa ụmụ nwoke nke afọ ya, otu n'ime ndị nkuzi ụlọ akwụkwọ sekọndrị ya mere ka ọ gaa mba ọzọ iji nweta diplọma nkuzi.[3] Mgbe ọ nwetara asambodo nkuzi na England na-esote ọmụmụ na Southlands koleji na King's koleji, London, ọ laghachiri Lagos wee sonye na ndị ọrụ ulo akwukwo umu nwanyi nke CMS Lagos dị ka onye nkuzi. N'afọ 1940, ọ lụrụ, Richard Doherty, onye ọka iwu nke na-arụ ọrụ n'oge ahụ na Ibadan, ọ hapụrụ ulo akwukwo nke umu nwanyi nke CMS wee soro di ya gaa Ibadan ebe ọ nọ ruo mgbe agha ahụ biri. Mgbe ọ nọ na Ibadan, ọ bụghị onye na-anọgide na Ibadan mana ọ na-etinye aka nke ukwuu n'òtù ndị ọrụ afọ ofufo gụnyere òtù enyemaka ndị ekpenta na nke kachasị mkpa obe uhie.[3] N'agbata afọ 1945 na 1960, ọ rụrụ ọrụ na ulo akwukwo agumakwukwo goomenti na Lagos, ọ bụ odeakwụkwọ nke omumu mpaghari western kansu ma laghachi n'ọrụ nkuzi na alma mater ọzọ, Queens koleji.[3]

Doherty bụ onye nduzi nke alaka Ibadan nke obe uhie nke Naijiria ma tinye aka na mbọ nzukọ ahụ na ọgụ iji chịkwaa obere ọrịa pox na Ibadan ma nye aka na Asaba n'oge Agha Obodo Naijiria. O mechara bụrụ onye isi oche nke mba kansu nke umu nwanyi obodo.[3]

N'afọ 1976, ọ ghọrọ onye isi oche nke mba kwanu nke umu nwanyi obodo[2]

Ihe odide[dezie | dezie ebe o si]

  1. Udoh (1999). The feminization of development processes in Africa : current and future perspectives, James Etim, Westport, Conn.: Praeger, 27. ISBN 978-0-313-02496-2. OCLC 654811725. 
  2. 2.0 2.1 2.2 Ojewusi (1996). Speaking for Nigerian women : (a history of the National Council of Women's Societies, Nigeria). Abuja, Nigeria: All State Pub. and Print. Co, 299-301. ISBN 978-32382-0-5. OCLC 42714200.  Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name ":0" defined multiple times with different content
  3. 3.0 3.1 3.2 3.3 3.4 Osindele. "Humanitarian with no Regrets", Daily Sketch, June 15, 1969. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name ":1" defined multiple times with different content