Rubanda-Mayonza

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

 

Rubanda-Mayonza
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya23 Eprel 1992 Dezie
Ebe ọmụmụUganda Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụpersonal stylist Dezie

Rubanda-Mayonza, nke a makwaara dị ka Rutabatiina Mwene Busingye Emanzi Etahunga, bụ onye na-emepụta ejiji nke Uganda, onye ọchụnta ego nakwa onyeisi na ihe gbasara ichurutu nta ego. Ọ bụ onye guzobere ejiji Rubanda Mayonza, akara ejiji e-commerce nke Africa na Uganda.

Mbido ndụ na agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

Rubanda Mayonza gara ụlọ akwụkwọ Ntare na Mbarara maka agụmakwụkwọ sekondiri nke nta nakwa nke ukwuu. . N'afọ 2013 ọ sonyeere Mahadum Makerere ma n'afọ 2018 gụsịrị akwụkwọ na nzere bachelọ nke sayensị na nri na-edozi ahụ. Ọ bụ mgbe ọ nọ na Mahadum makerere ka mmasị ya maka ejiji na ime ihe ngosi malitere ịmalite ka ọ malitere isonye na ihe ngosi ejiji gburugburu ụlọ akwụkwọ.[1][2]

Na Makerere, ọ bụ onye isi otu ndị ntorobịa na-eto eto na mpaghara Afrịka nke a maara dị ka Waharakati Africa. o na-egosipụta nguzo Pan African ya n'ụzọ ọ na-esi eme ejiji. Ka ọ na-erukwa ngwụcha ụbọchị Mahadum ya, ọ malitere iweta ejiji ndị ọzọ n'ime uwe ejiji nke Afrịka bụ(Bitenge) site n'ịmepụta uwe ejiji Pan African.

Azụmaahịa na ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Rubanda mayonzà malitere ọrụ ejiji ya site na iweputa ebe ndị Africa ga enwe ike na zukota na interneti ,ebe ndị ana azu ahia ihe ndi eji eme ejiji na akara e commerce sites no na Kampala Uganda na afọ 2015. na afọ 2017 obidoro Mmepụta ba uwe elu nke ina emepụta Kwa maka umu nwoke na ime interneti jumia shop uzo Mmepụta ejiji ya bidoro banyewa nke na obidoro mmeputawa uwe umunwanyi nakwa ihe ndi ọzọ dika okpu, nnukwu akwa eji ekpuchi oyi, nakwazi jakeeti..Àtụ:CnaÀtụ:Cn

Nchịkọta Rubanda-Mayonza na-enwekarị mmetụta nke ejiji nke Pan Africanists na subcultures nke Uganda ma na-ere ahịa na njikọ ya na pan Africanism. Ọ bụ onye nwe ya na onye isi na-emepụta ụlọ ọrụ ahụ, na-eduga ndị otu ha na emepụta ejiji ma na-elekọta usoro okike niile.[3]

Ndetu[dezie | dezie ebe o si]

  1. Inside The Life of A campus Pan Afrikanist. campusbee. Retrieved on 2 July 2016.
  2. PIX! How the Africa Hall Fashion and Talent night went down (en-US). Campus Bee (2016-04-29). Retrieved on 2021-05-01.
  3. RUBANDA-MAYONZA FASHION :: Uganda :: OpenCorporates. opencorporates.com. Retrieved on 2021-05-01.