Ruth Mompati

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Ruth Mompati
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịSouth Africa Dezie
Aha enyereRuth Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya14 Septemba 1925 Dezie
Ebe ọmụmụNorth West Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya12 Mee 2015 Dezie
Ebe ọ nwụrụCape Town Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị, professor, diplomat Dezie
Ọkwá o jiambassador Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịAfrican National Congress Dezie

Ruth Segomotsi Mompati (14 Septemba, na afọ 1925, 12 Mee, na afọ 2015) bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị South Africa na onye guzobere Federation of South African Women (FEDSAW) na afọ 1954.[1] Mompati bụ otu n'ime ndị isi nke Women's March na 9 Ọgọst, na afọ 1956.[2]

Mbido ndụ na agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Ruth Segomotsi Mompati n'ebe ugwu nke Cape Province (North West Province taa). Mompati tolitere na Ganyesa, obodo nta dị na mpaghara North West. Nne na nna ya, Oriakụ Seli Babe Seichoko na Maazị Gaonyatse Seichoko, bụ ndị isi ụka na London Missionary Society Church (LMSC), Vryburg. Mgbe ọ gụsịrị Standard 6, ọ rụrụ ọrụ maka ezinụlọ ndị ọcha dị ka onye na-elekọta ụmụaka ma mesịa gaa Tigerkloof Teachers Training College ebe ọ nwetara diplọma onye nkuzi ụlọ akwụkwọ praịmarị na afọ 1944.[3][4]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 1944, Mompati malitere ịkụzi na Dithakwaneng Primary School dị nso na Vryburg. O mechara kwaga Vryburg Higher Primary School, ebe ọ bụ onye nkuzi ruo na afọ 1952.[5] A kwụsịrị Mompati n'ọrụ nkuzi ya na afọ 1952 mgbe ọ lụrụ di n'ihi na iwu ịkpa ókè agbụrụ machibidoro ndị nkuzi nwanyị ojii ịlụ di.[6] Mompati kwagara Johannesburg na afọ 1952, obere oge mgbe mkpọsa Defiance malitere.[4] Ọ gara ụlọ akwụkwọ onwe onye iji mụọ mkpirisi na ịpị mkpụrụ akwụkwọ[5]

Site na afo 1953 ruo na afọ 1961 ọ rụrụ ọrụ dị ka onye na-ede akwụkwọ maka Nelson Mandela na Oliver Tambo na ọrụ iwu ha na Johannesburg.[7] Ọ sonyeere African National Congress na afọ 1954, a họpụtakwara ya na National Executive Committee nke Women's League.[2]

N'afọ 1990, a họpụtara Mompati ka ọ bụrụ otu n'ime ndị nnọchi anya ANC nke sooro gọọmentị South Africa kwurịta maka mgbanwe udo na ọnọdụ ndị a ga-ezute iji kwụsị esemokwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị na South Africa na Groote Schuur.[5][8] A họpụtara ya dị ka onye omeiwu na ntuli aka ọchịchị onye kwuo uche ya mbụ nke South Africa na afọ 1994, ebe ọ jere ozi na National Assembly ruo 1996.[5] A họpụtara ya ka ọ bụrụ onye nnọchi anya na Switzerland site na afo 1996 ruo afọ 2000. Mgbe o si Switzerland lọta, a họpụtara ya ka ọ bụrụ onye isi obodo Vryburg, North West. Mompati jere ozi dị ka onye isi nke Umkhonto we Sizwe Veteran's Association.[2][7][5]

Ọnwụ[dezie | dezie ebe o si]

Mompati nwụrụ na 12 Mee 2015 mgbe ọ rịara ọrịa n'ụlọ ọgwụ Cape Town.[9][2]

Ebenside[dezie | dezie ebe o si]

  1. Premier David Makhura pays tribute to struggle stalwart, Dr Ruth Mompati (12 May 2015). Retrieved on 29 December 2019.
  2. 2.0 2.1 2.2 2.3 Ruth Mompati - South African History Online. sahistory.org.za. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "sah" defined multiple times with different content
  3. Turok, Karina. (2006). Life and soul: portraits of women who move South Africa, Orford, Margie., Cape Town: Double Storey, 50. ISBN 1-77013-043-8. OCLC 70536542. 
  4. 4.0 4.1 Ruth (1970). The road to democracy: South Africans telling their stories. South African democracy education trust: Tsehai publisher and distributors, 307.  Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name ":0" defined multiple times with different content
  5. 5.0 5.1 5.2 5.3 5.4 Ruth Mompati | South African History Online. www.sahistory.org.za. Retrieved on 2019-12-29. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name ":1" defined multiple times with different content
  6. Premier David Makhura pays tribute to struggle stalwart, Dr Ruth Mompati | South African Government. www.gov.za. Retrieved on 2019-12-29.
  7. 7.0 7.1 The Spirit of Freedom. cdlib.org. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "cdlib" defined multiple times with different content
  8. Talks between the government and ANC on negotiations proceed | South African History Online. www.sahistory.org.za. Retrieved on 2019-12-29.
  9. South Africa mourns struggle stalwart Ruth Mompati. southafrica.info.