Sammy Oziti

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Sammy Oziti
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereSammy Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1 Jenụwarị 1983 Dezie
Ọrụ ọ na-arụamateur wrestler Dezie
ụdị egwuregwuwrestling Dezie

Sammy Oziti (onye nke amụrụ na ụbọchị mbụ n'ọnwa Jenụwarị n'afọ 1983) bụ onye Naịjirịa na agba mgba ụdị nke akpọrọ freestyle O ritere ihe nrite abụọ na Egwuregwu nke All-Africa Games n’agbata afọ 2003 na 2007. O nwetara akara isii na African Championship n’etiti 2006 na 2012. Ọ ritekwara ọla ọcha abụọ na Commonwealth Wrestling Championship n'afọ 2005 na 2013. [1]

Ọrụ egwuregwu[dezie | dezie ebe o si]

Sammy Oziti bidoro ịgba mgba n'afọ 1998. Oge nke mbụ o sonyere na egwuregwu Africa bụ n'afọ 2003 na Abuja . Na emume a, o meriri ma nwee ihe nrite ọla edo mgbe o meriri onye ya na ya gbara mgba, onye obodo Tunisia nke aha ya bụ Bejaoui, Nour El Houda. [2] N'afọ sochirinụ, o sonyere n'egwuregwu asọmpi maka ntozu ịga Olympics mana ọ gbatara onye nke itoolu.[3]

Na afọ 2005, Sammy gbara asọmpi mbụ ya na Commonwealth Wrestling Championship na Stellenbosch, South Africa . Ọ gbatara onye nke abụọ wee nweta ihe nrite ọla ọcha, onye ya na ya sọrọmpi ahụ bụ Meena onye si India. [4]

N'egwuregwu ịgba mgba nke Afrịka n'afọ 2006, o meriri ma nweta ihe nrite ọla edo mgbe o meriri Feten, Ghanmi na mmemme nke 48kg n'arọ nke emere na Pretoria, South Afrịka. N'afọ sochirinụ, o sonyekwara ọzọ n'otu asọmpi ahụ wee bata dịka onye nke abụọ mgbe Sambou, Isabella si Senegal gbara onye nke mbu. O nwetakwara ihe nrite ọla ọcha na Egwuregwu Afrịka nke emere n'afọ ahụ na Algeir. N'afọ 2008, Sammy sonyere n'asọmpi ịgba mgba nke Afrịka ọzọ ebe o mechara nweta nrite ọla ọcha ọzọ site na mmemme nke 48kg n'arọ.

Na afọ 2010, ọ bara asọmpi ọzọ wee merie ma rite ọla ọcha. [5] Na asọmpi Afrịka nke afọ 2011 na 2012, Sammy nwetara nzere ọla kọpa abụọ. [6] [7] Mmeri ya na afọ 2012 dugara ya isonye na Asọmpi Olimpik ebe ọ nwetara ọkwa nke atọ na asọmpi nke 48kg n'arọ. [8]

Na afọ 2013, ọ sonyere na asọmpi Commonwealth nke emere na Johannesburg, RSA. Ọ gbatara onye nke abụọ mgbe Nirmala Devi si India meriri ya. Ha gbara aka na ihe mmeme nke 48kg n'arọ Sammy weere ihe nrite ọla ọcha. [9]

Ntụrụaka[dezie | dezie ebe o si]

  1. International Wrestling Database. www.iat.uni-leipzig.de. Retrieved on 2020-11-21.
  2. International Wrestling Database. www.iat.uni-leipzig.de. Retrieved on 2020-11-21.
  3. International Wrestling Database. www.iat.uni-leipzig.de. Retrieved on 2020-11-21.
  4. International Wrestling Database. www.iat.uni-leipzig.de. Retrieved on 2020-11-22.
  5. International Wrestling Database. www.iat.uni-leipzig.de. Retrieved on 2020-11-22.
  6. International Wrestling Database. www.iat.uni-leipzig.de. Retrieved on 2020-11-22.
  7. International Wrestling Database. www.iat.uni-leipzig.de. Retrieved on 2020-11-22.
  8. International Wrestling Database. www.iat.uni-leipzig.de. Retrieved on 2020-11-22.
  9. International Wrestling Database. www.iat.uni-leipzig.de. Retrieved on 2020-11-22.