Sebastian Kind

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Sebastian Kind
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịArgentina Dezie
Aha enyereSebastian Dezie
aha ezinụlọ yaKind Dezie
ebe agụmakwụkwọNational Technological University Dezie
Sebastian Kind

  Sebastian Alejandro Kind (amụrụ n'afọ 1979) bụ onye injinia na mba Argentina na ngalaba nke ike na-enwogha enwogha. Ọ bụ onye na-eme iwu, onye ndụmọdụ na onye ọrụ ọha na eze nyere onyinye nke jere ozi dịka odeakwụkwọ nta na ngalaba Ike na-enwogha enwogha na Ministrị n'ahụ maka ike na Argentina n'etiti afọ 2016 na 2019, ebe o duziri mgbanwe ike nke mba ahụ gaa na matrik dị ọcha site na mmemme na-aga nke ọma na nke ọhụrụ a na-akpọ RenovAr.[1] N'afọ 2018, a họpụtara ya dị ka Onye isi oche Council of the International Renewable Energy Agency (IRENA).

Ọrụ na agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

Kind bụ injinia na-arụ ọrụ na Mahadum National Technological nke Buenos Aires (Argentina).

N'afọ 2010 o guzobere MS na ngalaba Ike na-enwogha enwogha na Mahadum National Technological (Argentina) ma jee ozi dị ka onye nduzi ruo n'afọ 2017.

N'agbata afọ 2013 na afọ 2015, ọ rụrụ ọrụ dị ka onye ndụmọdụ na Senate ma dee Iwu 27,191, nke ndị Congress ji otu olu kwado.[2] Iwu a setịpụrụ usoro iwu na ebumnuche ọ na-etinye n'ọrụ ugbu a dị ka onye ọrụ gọọmentị.

N'oge niile ọ nọ n'ọrụ dị ka osote odeakwụkwọ nke ngalaba Ike na-enwogha enwogha, ọ bụ ya na-ahụ maka idepụta usoro nchịkwa niile maka ihe ndị na-enwogha enwogha ndị gụnyere mmemme RenovAr, ego ntụkwasị obi FODER na iwu PPA, n'etiti ndị ọzọ. N'oge Ọ bụ onye isi G20 nke Argentina n'afọ 2018, ọ duziri nzukọ mbụ maka ike na arụmọrụ ike na nzukọ Energy Transitions Working Group (ETWG) na Buenos Aires.

Ọrụ ike na-agbanwe agbanwe na Argentina

Kind nwetara MS na ngalaba Ike na-enwogha enwogha site na ụlọ ọrụ EUREC na Brussels (Belgium) / NTUA na Athens (Greece) / Mahadum nke Zaragoza (Spain).

Onyinye na mkpakọrịta[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 2018, a họpụtara ya dị ka Onye isi oche nke Council of the International Renewable Energy Agency (IRENA), a họpụtakwara ya dịka Fellow nke Eisenhower Foundation (EF) na Philadelphia na dịka Onye ndu ụwa nke World Economic Forum (WEF) na Geneva iji kwado ihe ọ rụzuru. N'afọ 2019, ọ natara Onyinye Ike Dị Ọcha nke Latin American na Caribbean Council on Renewable Energy (LAC- CORE) na Onyinye Climate Breakthrough (ihe omume nke Packard Foundation na nkwado nke Oak, Good Energies, na IKEA Foundations) maka ịzụlite GREENMAP (Global Renewable energy Mass Adoption Program).

Ndụ onwe onye[dezie | dezie ebe o si]

Kind na nwunye ya na ụmụ abụọ ha bi na Buenos Aires.

Edensibịa[dezie | dezie ebe o si]

  1. Kind (19 January 2018). Undersecretary of Renewable Energy.
  2. Infoleg (October 15, 2015). Ley 27.191.