Shannon Esra

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Shannon Esra
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịSouth Africa Dezie
Aha enyereShannon Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1 Febụwarị 1984 Dezie
Ebe ọmụmụJohannesburg Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụomee, omee ihe nkiri Dezie

Shannon Esra (amụrụ n'abali mbụ nke ọnwa Febrụwarị 1984 dị ka Shannon Esrechowitz ) bụ onye ome ihe nkiri na onye ọbụ abụ nke South Africa.

Ndụ mbido[dezie | dezie ebe o si]

Ndụ mmalite na mmalite ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Esra nwere “mmasi mbụ ya nke ime ihe mgbe ọ dị afọ Anọ, na-akọ akụkọ egwu ụlọ akwụkwọ ọta akara Purim . O mechara mee ihe ngosi Elvis Presley na asọmpi ngosipụta ọ natara na chi mpaghara.

Esra nwere ọkachamara mbụ ya na-eme ihe nkiri mgbe ọ dị afọ iri na isii mgbe ọ pụtara na fim bụ I Dreamed of Africa (nke bụ Kim Basinger ), na-egosiputa agwa aha ya bụ Siri. O mechara mụọ Dramatic Arts na Mahadum Witwatersrand na- enweta nzere BA (Hons) ya na 2003.

O meriri ihe nrite Naledi Theater Award maka ome ihe omume kacha mma site na onye ohuru ma ọ bụ onye ihe na agara nke ọma nwanyị), na mmepụta ihe nkiri Dorothy Ann Gould Japes maka ihe ngosi ya nke Neets . Ọ nwetakwara nhọpụta Fleur du Cap maka ọrụ a.

Ihe mmepụta nkwago ndị ọzọ gụnyere ihe nkiri nwanyị atọ ndị ntọ ọchị Six Inches (2018) nke Kristy Suttner dere ma duzie ya, yana cabaret Homebound na 2004.

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Ngosipụta nke telivishọn[dezie | dezie ebe o si]

Esra nwetara akụkọ ihe mere eme na Bollywood site na ngosipụta ya nke Stephanie na ihe nkiri Salaam-e-Ishq: A Tribute to Love site n'ịbụ otu n'ime ndị na- eme ihe nkiri caucasian mbụ na-edu ndú. [1] ma wụọ ntutu isi agba ocha n'asụ asụsụ na-olu okwu Amerika bụ American Accent Esra gosipụtara ka onye si Canada gara njem na India ịkwụsị enyi ya nwoke (nke Kushal Punjabi gosipụtara) ịlụ nwanyị. Mgbe ọ rutere India, ọ zutere Raju, onye ọkwọ ụgbọ ala taxi ( nke Govinda gosipụtara) bụ onye na-abịa enyere ya aka ma emesịa ọhụ Raju n'anya.

Na 2005,o mere ngosipụta obia tinyere Eric Stoltz, n'egosi dị ka nwunye mbụ ya, na Sci Fi Channel miniseries The Triangle . Ọ gbakwara onye ndu ihunanya dị ka Katie na ihe nkiri Darrell Roodt gbasara rugby, Nọmba 10 .

Na 2005 Esra rụrụ ọrụ ndu nke Caz O'Donough, onye uwe ojii zoro ezo, na ihe nkiri South Africa nke mkpali mmụọ ọnọdụ echiche / ihe nkiri aghụghọ ndị uwe ojii . Caz bụ nne nanị ya dị afọ iri abụọ, chọpụtara na nna nke nwa ya nwanyị, Lawrence Carter, bụ onye òtù ezinụlọ mpụ ụdị mafia nke nna ya "siri ike" bụ Chisel, na-agbalị ịkwatu.

Ọ na-egosipụta ugbu a na Tim Greene's n'ọtụtụ ihe nkiri South Africa na Televishon ahọpụtara maka ihe nrite nke ihe omume ebiputara, dị ka onye nta akụkọ nyocha Kim Smollen . Kim bụ nwa agbọghọ Juu dị n'etiti afọ iri abụọ nke malitere dị ka onye na-ede akụkọ ntụrụndụ na akwụkwọ akụkọ siri ike bụ Bulletin . N'ime oge nke atọ, a na-enye Kim ohere maka ịkọ akụkọ "dị njọ", na ugbu a emegharịrị sleazy tabloid The Bullet . [2]

Ihe nkiri[dezie | dezie ebe o si]

Afọ Aha Ọrụ Ihe ndetu
2000 I Dreamed of Africa Siri
2004 Yizo Yizo 3
2004 Isidingo Yvette Meyer
2005 The Triangle Sally Miniseries TV na ọwa Sci Fi
2006 Hard Copy Kim Smollen Ihe nkiri Igwe onyonyo
2006 Snitch Caz O'Donough
2006 Nọmba 10 Katie
2007 Life is Hard Lauren Character na-emegharị ugboro ugboro na usoro CW
2007 Salaam-e-Ishq Stephanie Ihe nkiri Hindi Bollywood India
2015 Isidingo Angelique Scott
2017 The Queen Sandra Stein
2019 The Throne Sandra Stein
2019 The River Sandra Stein
2020 Gomora Sandra Stein

Ndụ onwe onye[dezie | dezie ebe o si]

Esra bi na Sandton ya na nne na nna ya na nwanne ya nwoke nke obere. Ọ bụ "onye nkwado ime ụlọ" nke asompi ịma aka nke ping-pong. [3]

Nrụtụaka[dezie | dezie ebe o si]

 

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]

  1. Tonight | Hollywood next for Shannon Esra?. tonight.co.za.
  2. Shannon Esra | Tvsa. tvsa.co.za.
  3. [1]