Shina Peller

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Shina Peller
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereShina Dezie
aha ezinụlọ yaPeller Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya14 Mee 1974 Dezie
Ebe ọmụmụIseyin Dezie
Dị/nwunyeAyọ̀bọ́lá Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaAsụsụ Yoruba Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
Ọkwá o jionye otu ulo nnochite anya Naijiria, onye otu ulo nnochite anya Naijiria Dezie
ebe agụmakwụkwọLadoke Akintola University of Technology Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịAll Progressives Congress Dezie
Ụcha ime anyabrown Dezie
ụcha ntụtụ isiNtụtụ ojii Dezie

Shina Abiola Peller (a mụrụ ya na mkpụrụ ụbọchị iri na anọ nke ọnwa Mee n'afọ 1976) bụ onye ọchụnta ego Naijiria, onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị, onye na-emepụta ihe, na onye otu nke itenanị nke National Assembly. Ọ bụ onye isi oche na onye nduzi nke Aquila Group of Companies na Club Quilox.[1] Shina Peller chịrị echichi nke Ayedero nke ala Yoruba na Akinrogun nke Ala Epe, Lagos Nigeria.[2]

Ihe ndị mere n'oge gara aga[dezie | dezie ebe o si]

Shina Abiola Peller bụ nwa Alhaja Silifat na Prọfesọ Moshood Abiela Peler.[3] Ọ tolitere n'ụlọ ndị Alakụba. Ọ malitere na Iseyin, Oyo State na South-Western Naịjiria. Ọ gụrụ injinia kemịkal na Ladoke Akintola University nke Teknuzu, Ogbomosho, Nigeria, ebe ọ nwetara akara ugo mmụta mbụ ya n'afọ 2002.[4] N'ikpeazụ, ọ nwetara nzere masta na Business Management site na Ladoke Akintola University of Technology n'afo 2013. Ọ rụrụ ọrụ na Abia State n'afo 2003 iji mezuo ọrụ otu afọ nke National Youth Service Corps (NYSC) ana-eme maka ndị niile gụsịrị akwụkwọ na Naijiria.[5]

Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị[dezie | dezie ebe o si]

Peller bụ onye otu All Progressive Congress (APC), ma kwupụta ebumnuche ya ịsọ mpi n'okpuru ikpo okwu nke All progressives Congress dị ka onye nnọchi anya ụlọ maka mpaghara Iseyin / Itesiwaju / Iwajowa / Kajola Federal Constituency na Oyo Steeti.[6][7][8][9]

N'ụbọchị nke ise n'ọnwa Ọktoba n'afọ 2018, Shina Peller meriri na ntuli aka nke onye nnọchi anya ụlọ maka mpaghara lseyin /ltesiwaju / Kajola /lwajowa Federal na ikpo okwu nke All Progressive Congress (APC) maka ntuziaka 2019 Nigeria General wee merie oche ahụ. Ọ meriri oche maka House of Representatives na mpaghara ya na ụbọchị nke iri abụọ na atọ nke onwa Febụwarị n'afọ 2019 mana a tụfuru ya ka ọ laghachi dị ka onye omeiwu.[10][11] Ọnọ ugbu a maka Senate nke Naijiria n'okpuru nchebe nke Accord Party.[12]

Ebensidee[dezie | dezie ebe o si]