Simidele Adeagbo

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Mkpúrù èdè íke

Simidele Adeagbo
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria, Njikota Obodo Amerika Dezie
obodo maka egwuregwuNaijiria, Njikota Obodo Amerika Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya29 Julaị 1981 Dezie
Ebe ọmụmụToronto Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụsụ Yoruba Dezie
Ọrụ ọ na-arụasọmpi egwuregwu, skeleton racer, bobsledder, marketing manager Dezie
ebe agụmakwụkwọUniversity of Kentucky Dezie
ụdị egwuregwuegwuregwu, skeleton, bobsleigh Dezie
ịdọ aka ná ntị egwuregwu asọmpi60 metres, 100 metres, 200 metres, long jump, triple jump Dezie
so na2018 Winter Olympics Dezie
onye nlereranyaSerena Williams Dezie
webụsaịtịhttp://www.simisleighs.com/ Dezie

Simidele Adeife Omonla Adeagbo (amụrụ na Julai 29, 1981 na Toronto, Ontario, Canada)[1] bụ onye Naijiria nke Canada na-eme egwuregwu ọsọ skeleton zọrọ asọmpi na 2018 Olympik. Ọ bụ nwanyị mbụ na Nigeria ma na Africa na-eme egwuregwu skeleton. Ọ bu nwaanyị oji nke mbụ zọrọ asọmpi Olympik maka egwuregwu a. Tupu ọ zọọ mpi skeleton, ọ zọrọ mpi egwuregwu iwụli elu nke ikpeazu na 2008.

Ndụ mmalite[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Adeagbo na Toronto, na Ontario, Canada, nne na nna ya bụ ndị Naijiria; ma ọ laghachiri Naịjirịa mgbe ọ ka bụ nwa ọhụrụ, nọrọ ebe ahụ ruo afọ isii.

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Adeagbo jere ozi dịka onye na-anochite Serena Williams anya na ihe nkiri Nike kere. Adeagbo bu onye njikwa ahia Nike na South Africa kemgbe 2012.

Na August 18, 2018, Adeagbo na ndị ọzọ ama ama okwu n'oge ihe mmeme TEDxLagos nke emere na Muson Centre.[2] Ya na onye ọkaiwu Supo Shasore, onye teknuzu, Ade Olufeko, onye nhazi ihe osise Tokini Peterside na onye mgbasa ozi bụ Banky W.. ya na ndị ọzọ.

Ọrụ egwuregwu[dezie | dezie ebe o si]

Adeagbo malitere egwuregwu ọsọ na-ubi mgbe ọ na ụlọ akwụkwọ sekondarị. Ọ lara ezumike nká na June 2008. N'oge ahụ, ekweghị ya ka ọ gaa Olimpik n'ihi na ogo ya foro 8-inch. ọ bụ onye na-ejide ọtụtụ ihe ndekọ gụnyere onye egwurewgu kachasị mma ụgbọrọ anọ yana ndekọ nke eguregwu iwụli elu maka Mahadum Kentucky.[3]

Adeagbo nwere mmasị n’egwuregwu nke skeleton n’ọnwa Disemba afọ 2016, mgbe ọ nụrụ banyere otu ndị otu egwuregwu bobsled na Naijiria na-achọ iru eru maka asọmpi Olimpik. Ọ malitere skeleton na Septemba 2017. Nike bụ ndị na-akwado ya maka egwuregwu a.[4][5]

Adeagbo sonyere na-asọmpi egwuregwu mbụ ya na 2018 Olympik na egwuregwu skeleton, dịka onye otu Naịjirịa bụrụ onye Naịjirịa izizi na-esonye na asọmpi Olymik a. Ọ bụ onye nnọchi anya Naijiria na emume mmechi nke Olymik na 2018[6].

Ndekọ nke kacha mma[dezie | dezie ebe o si]

Egwuregwu ọsọ na ubi[dezie | dezie ebe o si]

Mmemme Nsonaazụ Ebe Ụbọchị
N'èzí
100 mita 12.05 (ifufe: +1.7) Baton Rouge, Louisiana 13 Mee 2000
100 mita 11.96 (ifufe: +3.1) Coral Gables, Florida 17 Maachị 2001
Ogologo iwụli elu 6.20 m A (ifufe: +0,9 m / s) Eugene, Oregon 19 Jun 2004
Ogologo iwụli elu 6.36 m A (ifufe: +4.9 m / s) Austin, Texas 06 Eprel 2001
Iwụli elu ugbọrọ atọ 13.99 m A (ifufe: +2.0 m / s) Eugene, OR 27 Jun 2008
Ime ụlọ
60 mita 7.59 Lexington 13 Jenụwarị 2001
Ogologo iwụli elu 6.25 m Nampa, Idaho 28 Jenụwarị 2005
Iwụli elu ugbọrọ atọ 13.40 m Seattle 28 Jenụwarị 2006

Skeleton[dezie | dezie ebe o si]

Ndụ ya n'ime[dezie | dezie ebe o si]

Na Disemba 2017, Adeagbo ka bi na Johannesburg, South Africa, kemgbe afọ 2012.[7]

Ebe m si dee[dezie | dezie ebe o si]

  1. Sleigh, Simidele Adeagbo, Sleigh. Nike (9 January 2018).
  2. Olasupo Sasore, Bankole Wellington, Simi Adeagbo, others deliver inspiring talks at event co-sponsored by Union Bank. Retrieved on 17 September 2018.
  3. Sleigh, Simidele Adeagbo, Sleigh. Nike (9 January 2018).
  4. Sleigh, Simidele Adeagbo, Sleigh. Nike (9 January 2018).
  5. Simidele ADEAGBO. IBSF Athletes. International Bobsleigh and Skeleton Federation. Archived from the original on 2020-11-22. Retrieved on 2020-11-14.
  6. Steve Dede. "Nigeria’s bobsled and Skeleton women were looking glam at closing ceremony", Pulse Nigeria, 26 February 2018.
  7. Sleigh, Simidele Adeagbo, Sleigh. Nike (9 January 2018).