Skistosomiasis

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Skistosomiasis
ọrịa ọrịa, class of disease
obere ụdị nkedistomatosis, parasitic helminthiasis infectious disease, neglected tropical disease, disease Dezie
A gụrụ ahaTheodor Bilharz Dezie
ihe kpatara yaSchistosoma Dezie
health specialtyinfectious diseases Dezie
mgbaàmà na akarahematuria, afọ ọsịsa, nausea, chills Dezie
ICD-9-CM120.8 Dezie
ICPC 2 IDD96 Dezie
NCI Thesaurus IDC35000 Dezie
Skistosomiasis
Nhazi na ihe ndị enwetara n’ime
Nwatakịrị nwoke dị afọ 11 gbakọrọ n'afọ ya nanke mere n'iku ume ya di elu n'ihi ọrịa Skistosomiasis(Agusan Del Sọ Filipin).
ICD-10B65
ICD-9120
DiseasesDB11875 1188211856
MedlinePlus001321
MeSHD012552

Skistosomiasis, nke amakwa dịka nje esi n'ejula ebuta, bụ nke ihe n'akpata ya bụ njen'erikarị ihe site n'ahụ anụ ndịọzọ iji nọgide n'adị ndụ nke akpọrọ skistosom. Awara mamịrị si aga maọbụ mgbarị afọ n'enwetekarị ya ngwa ngwa. Ihe ndị n'egosi na mmadụ enwetala ya gụnyere mgbu nke ime afọ,afọ pịrịpịrị, , maọbụ ọbara ịdị na mamịrị. Ndị ọrịa ji n'enwekarị nsogbu na umeji ha, akụrụ, ,amụghị nwa, maọbụ ọrịa kansa nke mgbarị afọ. N'ebe ụmụaka nọ, onwere ike ime ka ha ghara, inwe ezi ahụike na enweghị ụbụrụ akwụkwọ.[1]

A na-ebutekarị ya site n'ịga na mmiri ebe nje ahụ nọ. Nje a n'agbasakarị site ejula nọ na mmiri enwere ya. Ebe a na-ahụkarị ya bụ n'etiti ụmụaka nọ n'obodo ka n'emepe emepe, n'ihina ha n'egwukarị egwu na mmiri nje a nọ. Ndịọzọ nwere ike inweta nje a gụnyere ndịọrụ ugbo, ndịọkụ azụ na ndị n'eji mmiri adịghị ọcha eme ihe oge niile.[1]Ha nọ n'ogo helmintiasis.Ha nọ n'ogo okpo ọjọọ ndị n'eri mmadụ ihe nnukwu n'ime ahụ bụ helmintiasisel helmint.[2] Enwere ike iji ọgwụ nke ga-alụso nje a ọgụ nke nọ n'ime ọbara mee ihe.[1]

Iji gbochie inweta nje a, ọdịmma iji mmiri dị ọcha eme ihe, n'ibelata ọnụọgụgụ ejula nọ ebe obibi nso. Ebe enwere nje a nnukwu, ekwesịrị inye ndị niile bi ebe ahụ ọgwụ prazikwụantelotu ugbo n'afọ. Ihe eji eme nke a bụ iji belata ọnụọgụgụ ndị nwere nje a na ibelata mgbasa ya ebe n'ebe ndịọzọ. Prazikwụatel bụ ọgwụ ndị Wọld Helt Ọganaịzeshọn (WHO) nyere ntụziaka ka ewere n'agwọ ndị nwere nje a.[1]

Mmadụ dị nde 210 butere ọrịa Skistosomiasis n'ụwa niile na afọ 2012.[3] Ihe dịkwa ka mmadụ puku 12 ruo narị puku abụọ n'anwụ na ya kwa afọ[4].[5] A na-ahụkarị ya n'etiti ndị bi na Afrịka, Eshia na ndị Sawụtụ Amerịka.[1] Ihe dịka nde mmadụ 700, na mba karịrị 70, bi ebe enwere nje a n'ihe ndị n'akpata ya.[5][6] Na mba ndị mmiri gbara gburugburu, Skistosomiasis n'esochiịba bụ ọrịa ndị n'eri ọtụtụ ego na nke n'emetụta ọnọdụ akụnụba nke mba.[7] Skistosomiasis so na nje agụnyere eleghaara anya nke ndị bi ebe mmiri nọ nso n'arịakarị.[8]

Ebe akpọtụrụ uche[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 1.4 Schistosomiasis Fact sheet N°115. World Health Organization (3 February 2014). Retrieved on 15 March 2014.
  2. Chapter 3 Infectious Diseases Related To Travel (1 August 2013). Retrieved on 30 November 2014.
  3. Fenwick, A (Mar 2012). "The global burden of neglected tropical diseases.". Public Health 126 (3): 233–6. DOI:10.1016/j.puhe.2011.11.015. PMID 22325616. 
  4. Lozano, R. (15 December 2012). "Global and regional mortality from 235 causes of death for 20 age groups in 1990 and 2010: a systematic analysis for the Global Burden of Disease Study 2010". Lancet 380 (9859): 2095–128. DOI:10.1016/S0140-6736(12)61728-0. PMID 23245604. 
  5. 5.0 5.1 Thétiot-Laurent, S. A. (27 June 2013). "Schistosomiasis Chemotherapy". Angewandte Chemie International Edition in English 52 (31): 7936–56. DOI:10.1002/anie.201208390. PMID 23813602. 
  6. Schistosomiasis A major public health problem. World Health Organization. Retrieved on 15 March 2014.
  7. The Carter Center. Schistosomiasis Control Program. Retrieved on 17 July 2008.
  8. Neglected Tropical Diseases (6 June 2011). Retrieved on 28 November 2014.