Stella Ifeanyi Smith
ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
Aha enyere | Stella |
aha ezinụlọ ya | Smith |
Ụbọchị ọmụmụ ya | 28 Jenụwarị 1965 |
Ebe ọmụmụ | Lagos |
Ọrụ ọ na-arụ | biotechnologist, researcher, medical researcher |
onye were ọrụ | Nigerian Institute of Medical Research |
ebe agụmakwụkwọ | Mahadum nke Lagos, Mahadum nke Ilorin |
Onye òtù nke | Nigerian Academy of Science |
Ihe nrite | Fellow of the Nigerian Academy of Science |
Stella Ifeanyi Smith bụ onye sayensị dibịa bekee nke Naịjirịa nwere mmasi na bayoloji na teknụzụ soo ya. Smith sonyeere Nigeria Institute of Medical Research na afọ 1988, e mere ya onye isi nyocha na afọ 2013. [1] Ka ọ dị na, na ọnwa Septemba n'afọ 2018, o nwere goo amaokwu otu puku, narị asaa na iri atọ na itoolu na ọkà mmụta Google nke ahụ na-egosi na a'na ahụ ọrụ agụmakwụkwọ ya. [2]
Ndụ onwe onye na agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]
Amụrụ na ọnwa Jenụwarị ụbọchị iri abụọ na asatọ, n'afọ 1965, Smith nwere akara ugo mmụta mbụ ya na microbiology na Mahadum Ilorin na afọ 1986. Mgbe nke a gasị, o nwetara nzere masters na Medical microbiology na Mahadum Lagos. Ọ gụsịrị akara ugo mmụta doctorate site n'otu ụlọ akwụkwọ ahụ na afọ 1996. [3]
Mbipụta[dezie | dezie ebe o si]
N’afọ 2001, ọ mere nyocha banyere ndị mmadụ narị anọ na iri ise na itoolu na-arịa afọ ọsịsa na Lagos. A kọwara na ndị ọrịa ahụ bụ ndị dịpụrụ iche achọpụta nwere Shigella spp. na Escherichia coli . Site na ihe ọ chọpụtara, ọ tụrụ aro na ọrịa ihe ga agwọ ọrịa ahụ bụ ampicillin, tetracycline, co-trimoxazole. Ọ chọpụtakwara na ekwesịrị izere ọgwụ streptomycin na usoro izizi nke ịgwọ shigellosis n'ihi na achọpụtara na akụrụngwa ya na nguzogide ya nwere ike inwe mmetụta na usoro ọgwụgwọ ọrịa ahụ. O choputara na acid nke Nalidixic, ciprofloxacin na ofloxacin bụ ọgwụ ndị di nma enwere ike iji nọchie anya ndị ọzọ maka ọrịa ahụ. [4]
Ọrụ ya akachasị kpọtụrụ aha na ọkà mmụta Google bu nke ọrụrụ na afọ 2006, ebe ọ nyochara mmetụta nke ihe na egbu ma ọbụ gbochie nje nke a'na akpọ antibacterial na asụsụ bekee nke a'na ewepụta kwa na mkpụrụ osisi. Ọrụ ya nyochaa ka nke a si adi ire ebe escherichia coli 0157: H7 nọ. N'ime ọrụ ya, osisi anọ dị iche iche (Entada africana (akụkụ nke osisi ahụ), Terminalia avicennoides (akụkụ nke osisi ahụ), Mitragyna stipulosa (akụkụ nke osisi ahụ) Lannae acida (akụkụ nke osisi ahụ) ka etinyere ya na nke a'na akpọ ethanol na asụsụ bekee na mmiri na usoro mgbasa di iche maka ịchọpụta mmeghachi omume ha na ebe nke E coli 0157: H7 (EHEC). Nsonaazụ dịgasị iche iche dabere na ngwakọta ejiri maka ime ule ahụ. [5]
Ntụrụaka[dezie | dezie ebe o si]
- ↑ 10 Nigerian Women Pulling Their Weights In The Sciences (November 10, 2017).
- ↑ Stella Ifeanyi Smith.
- ↑ Stella Ifeanyi Smith. Archived from the original on 2019-01-23. Retrieved on 2020-11-10.
- ↑ Epidemiology of Shigellosis in Lagos, Nigeria: Trends in Antimicrobial Resistance. Archived from the original on 2019-04-13. Retrieved on 2020-11-10.
- ↑ Antibacterial Effect of Edible Plant Extract on Escherichia coli 0157:H7.