Gaa na ọdịnaya

Stella Ikupa Alex

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Stella Ikupa Alex
mmádu
Ụdịekerenwanyị Dezie
Mba o sịTanzania Dezie
Aha enyereStella Dezie
Aha ezinụlọ yaAlex Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1 Ọktoba 1979 Dezie
Asụsụ obodoSwahili Dezie
Asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaEnglish, Swahili Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
Ọkwá o jiMember of the National Assembly of Tanzania Dezie
Ebe agụmakwụkwọMzumbe University Dezie
Onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịParty of the Revolution Dezie
Kọwara na URLhttp://www.parliament.go.tz/mps-list Dezie

 

Stella Ikupa Alex (amụrụ n'ụbọchị mbụ n'ọnwa Ọktoba n'afọ 1979), bụ onye na-ahụ maka ego na onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị na Tanzania, onye so n'òtù Chama Cha Mapinduzi (CCM). Ọ bụ osote minista ugbu a n'ọfịs praịm minista nke Tanzania, nke na-ahụ maka ndị nwere nkwarụ.[1][2] Ọ na-ejekwa ozi dị ka onye omeiwu, ebe a họpụtara ya n'oche pụrụ iche n'afọ 2015.[1]

Mmalite na agụmakwụkwọ

[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ ya n'ụbọchị mbụ n'ọnwa Ọktoba afọ 1979. Ọ gara "Minazi Mirefu Primary School", na Dar es Salaam, obodo kachasị ukwuu na Tanzania na ebe azụmahịa, gụsịrị akwụkwọ na afọ 1994. Site na afọ 1995 ruo na afọ 1998, ọ gara Jangwani Girls Secondary School, kwa na Dar es Salaam maka ọmụmụ O-Level ya. Ọ nọrọ na Jangwani maka agụmakwụkwọ A-Level ya, gụsịrị akwụkwọ na afọ 2001.[1]

N'afọ 2002, a nabatara ya na Tanzania Institute of Accountancy, na Dar es Salaam campus, iji nweta Advanced Diploma na Accountancy. Mgbe e mesịrị, site na afọ 2009 ruo na afọ 2011, ọ gara nke ọma na Master of Science degree na Accountancy na Finance, na Dar es Salaam campus nke Mahadum Mzumbe.[1]

Akụkọ ihe mere eme nke ọrụ ya

[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 2007, ọ malitere ịrụ ọrụ na Ministry of Energy and Minerals nke Tanzania dị ka onye na-ahụ maka ego, na-eje ozi na ikike ahụ ruo n'afọ 2014. N'afọ ahụ, a kpọfere ya na Ministry of Industry and Trade nke Tanzania, dị ka onye na-ahụ maka ego, na-eje ozi n'ebe ahụ ruo n'afọ 2015.[1]

Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị

[dezie | dezie ebe o si]

Stella Alex abụwo onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-arụsi ọrụ ike na obodo ya, na pati ndọrọ ndọrọ ọchịchị Cama Cha Mapiduzi na-achị, malite na 2003. Site mgbe ahụ ruo n'afọ 2015, ọ rụrụ ọrụ dị ka onye na-ahụ maka akụ nke alaka pati ya. N'afọ 2013, ọ rụrụ ọrụ dị ka onye otu CCM District Constitutional Council.N'afọ 2015, ọ ghọrọ onye omeiwu n'okpuru ndokwa oche pụrụ iche.[1]

N'abalị asaa n'ọnwa Ọktoba n'afọ 2017, onye isi ala John Magufuli họpụtara ya ka ọ bụrụ osote minista, n'ọfịs praịm minista, nke na-ahụ maka ndị nwere nkwarụ.[2][3]

Hụkwa nka

[dezie | dezie ebe o si]
  • Stella Martin Manyanya

Ebesidee

[dezie | dezie ebe o si]
  1. 1 2 3 4 5 6 POTAN (2 November 2017). Parliament of Tanzania: Profile of Honourable Stella Ikupa Alex. Parliament of Tanzania (POTAN). Archived from the original on 10 November 2017. Retrieved on 2 November 2017.
  2. 1 2 The Citizen Reporter (7 October 2017). Several New Faces in Dr. Magufuli's Team. Retrieved on 2 November 2017.
  3. Lamtey (9 October 2017). Magufuli swears in new ministers, deputies. Retrieved on 2 November 2017.

Njikọ mpụga

[dezie | dezie ebe o si]