Sudanese National Academy of Sciences

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Sudanese National Academy of Sciences
otu
Oge/afọ mmalite2005 Dezie
onyeisi ocheMohamed Hag Ali Hassan, Ahmed Mohamed El Hassan Dezie
mba/obodoSudan Dezie
dị na ngalaba nhazi mpagharaKhartoum Dezie
Onye òtù nkeNetwork of African Science Academies, InterAcademy Partnership Dezie
webụsaịtịhttp://www.snas.org.sd/ Dezie

Ụlọ akwụkwọ Sudanese National Academy of Sciences (SNAS) bụ ụlọ ọrụ na-abụghị gọọmenti hiwere nke isi ụlọ ọrụ ha dị na Khartoum, Sudan, bu n'obi ịkwalite òtútó alaka sayensị na ime nnyocha na mba Sudan site n'inwe njikọaka na ngalaba agụmakwụkwọ, sayensị, teknụzụ na nnyocha.

Akụkọ Mmalite[dezie | dezie ebe o si]

Ọ bụ òtù ndị ọkachamara na ngalaba sayensị si mba Sudan hiwere ụlọ akwụkwọ a n'ọnwa Ọgọstụ afọ 2005 [1][2] nke gụnyere Ahmed Mohamed El Hassan. [3] na Muntaser Ibrahim.[4] Ahmed Mohamed El Hassan bụụrụ onye isi oche mmalite nke SNAS, [5][6] nke Mohamed Hag Ali Hassan nọchiri,[7][8] onye so hiwe ọtụtụ Kansụl sayensị ma bụrụkwa onye isi oche nkeThe World Academy of Sciences.[9] N'àgbàtà ọnwa Eprel 2023, osote onye isi oche SNAS bụ Muntaser Ibrahim,[10] ode akwụkwọ ukwu ya bụ Mustafa El Tayeb,[11] ébé onye njikwa ego ya bụ Suad Sulaiman.[12][13]

Ebumnobi Na Ọrụ Ya[dezie | dezie ebe o si]

SNAS bụ ụlọ ọrụ ehiwere n'abụghị maka irite uru kwụụrụ onwe ya nke ndị mejupụtara ya bụ ndị ọkachamara ọpụrụiche na ngalaba sayensị na mba Sudan ma na mba ofesi, ebe ndị ọkachamara sayensị si mba ndị ọzọ bụ ndị òtù ahụ anabatara anabata. Isi ụlọ ọrụ ya digodi naanị nwa oge ugbua na Mahadum Khartoum.[5]

A na-ahụta ụlọ ọrụ ahụ dịka ebe agụmakwụkwọ kacha dị elu ugbua na mba Sudan, wee na-arụ ọrụ ikwado na ịkwalite nnyocha na ikepụta ihe ọhụrụ na ngalaba sayensị na mba ahụ.[2] Ebumnuche bụ isi sekpụ ntị nke ụlọ akwụkwọ ahụ bụ iwegolite ógó, ma wulitekwuo ime nnyocha ederede na nke emere n'aka na Sudan gaa n'ihu, ya na kwa iguzobe ebe nlere anya sayensị, teknụzụ na mmepụta ihe ọhụrụ. [14]

SNAS na-adị emekọbawa emume nkuzi, ndụmọdụ na ọzụzụ ndị mmadụ dịka nke iwulite ngabasị maka ihiwe ebe nlere anya sayensị, teknụzụ na mmepụta ihe ọhụrụ na Sudan, na ilenyere anya nhazi na ị́tụ̀ mbawanye maọbu ọdịda nke ihe ndị na-egosipụta sayensị, teknụzụ na mmepụta ihe ọhụrụ.[15][16] SNAS so n'ịhazị ọtụtụ emume dịka ịhazi emume na nkuzi ihw nke sayensị, ịkwado nnyocha na ngalaba sayensị ma n'arọpụtakwa ihe ndị ọgụgụ maka ọzụzụ ndi mmadụ na ngalaba sayensị, teknụzụ na mmepụta ihe ọhụrụ.[17] Ụlọ Akwụkwọ ahụ mezuru ọrụ ya gbadoro ụkwụ na sayensị kacha buo ịbu nke United States Agency for International Development (USAID) wetara ego ya, nke bụ òkù akpọrọ maka ime ọmụmụ ihe gbasara Ahụekere Sayensị Aflatoxin na ịmịpụta ọ́là ọcha site n'ime ala na mba Sudan.[18][19]

SNAS nọrịị n'eme mmemme ncheta Izu Sudan nakwa ịhazi nkuzi ihe nke atọ nke ọbọdọ na njikọaka Khartoum Institute for Scientific Research.[20]

Na 21 Septemba 2023, SNAS rịọrọ arịrịọ nye ụlọ akwụkwọ ndị dịgasị na mba ụwa, agba ha ume ka ha nyere ngalaba mahadum ahụ na ụmụ akwụkwọ ha niile aka bụ ndị ọgbaghara ike na-aga n'ihu n'obodo ahụ ugbua chụpụlara n'ọnọdụ ha .[21] Agha ahụ, ona-aga n'ihu kemgbe Eprel, ememilaala ime nnyocha na Sudan, mebie ihe karịrị mahadum na ebe a na-eme nnyocha dị otu narị n'ọnụ ọgụ. Arịrịọ ahụ na-asị ka ndị òtù ha nọ na ụlọ akwụkwọ gọọmenti etiti gasị rọpụtara ndebanye aha n'ụzọ dị mfe nye ụmụ akwụkwọ na ndị ọkammụta ndị na-achọ ha, ma chọọ ntụkọta akụnụba ọnụ iji wugharịa akụrụngwa ndi agha ahụ mebirila. Akọwaala ọnọdụ ahụ dịka nke "ọnwụ na ndụ" nye ndị ọkachamara akwụkwọ na Sudan, ebe a na-ele anya na mwughachi na idozigharị ihe ndi emebiri ga-eri opekata mpe afọ ise, ebe ọtụtụ ndị ọkachamara akwụkwọ na ụmụ akwụkwọ ga-agbasasị n'akụkụ mba ahụ ndị na-enweghi akụrụngwa mkpakọrịta ọgbaraọhụrụ.[22][23]

Ndị Òtù Ya[dezie | dezie ebe o si]

Àtụ:Main category

SNAS ahọpụtala ndị ọkachamara sayensị si mba Sudan ama ama dịka ndị òtù ya. Ndị òtù SNAS gụnyere Elfatih Eltahir (H.M. King Bhumibol Ọkammụta n'isi ọmụmụ Ihe Gbasara Mmiri na Ihu Igwe n'ụlọ akwụkwọ MIT),[24][25] Mohamed El-Amin Ahmed El-Tom (Ọkammụta n'isi ọmụmụ math na onye bụ Minista n'ahụ maka Agụmakwụkwọ nke mbụ mgbe Nnwogha Sudan) mechara n'afọ 2007,[26] Ahmed Hassan Fahal (ọkàmmụta n'isi ọmụmụ Ịwa ndị mmadụ ahụ na Mahadum Khartoum) n'afọ 2007,[27] na Nimir Elbashir Ọkammụta na Mahadum Texas A&M dị na Qatar n'afọ 2022.[28][29]

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. "Academies as agents of change in the OIC", SciDev.Net, 3 October 2007. Àtụ:ProQuest.
  2. 2.0 2.1 Sudanese National Academy of Sciences (SNAS).
  3. Error on call to Template:cite web: Parameters url and title must be specified (ar) (2022-11-10).
  4. (11 March 2019) "Renowned Sudanese geneticist behind bars for opposing regime". Science. DOI:10.1126/science.aax2972. 
  5. 5.0 5.1 News & Events (en-gb). Archived from the original on 2022-11-20. Retrieved on 2023-12-07.
  6. (8 July 2011) "Sudan splits and science community divides". Nature. DOI:10.1038/news.2011.408. 
  7. Mohamed H.A. Hassan (en).
  8. Mr. Mohamed H. A. Hassan | Department of Economic and Social Affairs.
  9. Partnership (IAP), the InterAcademy. Sudanese National Academy of Science (SNAS) (en-GB).
  10. 11 Sudanese Scientists You Should Know About (en-US).
  11. Sciences (TWAS), The World Academy of (12 September 2017). Sudan: Building a Reputation (en).
  12. Professor Suad Sulaiman.
  13. Suad Mohammed Sulaiman.
  14. Letter from President (en-gb). Archived from the original on 2022-12-08. Retrieved on 2023-12-07.
  15. SNAS Strategic Plan (en-gb). Archived from the original on 2022-12-08. Retrieved on 2023-12-07.
  16. in partnership with Organization for Women in Science for the Developing World. Archived from the original on 2023-04-13. Retrieved on 2023-12-07.
  17. 1st Sudanese Swiss Science Forum | DNDi (en-GB).
  18. Science for peace (STEM Sudan) (en-gb). Archived from the original on 2022-12-08. Retrieved on 2023-12-07.
  19. (7 September 2018) "Smart Artisanal Gold Mining from a Sudanese Perspective". Biomedical Journal of Scientific & Technical Research 8 (5). DOI:10.26717/BJSTR.2018.08.001704. 
  20. 2023 Celebrate Sudan Week || KICS 3rd Community Lecture (en-gb). Archived from the original on 2023-04-05. Retrieved on 2023-12-07.
  21. Partnership (IAP), the InterAcademy (2023-09-26). SNAS appeals for solidarity with the Sudanese people (en-GB).
  22. Nordling, Linda (2023-09-28). Sudan’s scientists plead for help as war ravages research – Research Professional News (en-GB).
  23. War forces Sudanese science academy to appeal for help (2023-10-04).
  24. s.r.l, Interfase (21 November 2022). TWAS elects 50 new Fellows (en).
  25. Eltahir CV.
  26. El-Tom Mohamed El-Amin Ahmed | The AAS. Archived from the original on 2023-01-02. Retrieved on 2023-12-08.
  27. Editorial Board. Archived from the original on 2022-11-15. Retrieved on 2023-12-08.
  28. StackPath.
  29. Tamuq faculty member elected to Sudanese National Academy of Sciences (en) (2022-04-01).

Njikọ Mpụga[dezie | dezie ebe o si]