Taiwo Aladefa

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Taiwo Aladefa
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
aha gọọmentiTaiwo Aladefa Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya19 Disemba 1974, 19 Disemba 1971 Dezie
Ebe ọmụmụIbadan Dezie
Asụsụ obodoAsụsụ Yoruba Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụsụ Yoruba Dezie
Ọrụ ọ na-arụasọmpi egwuregwu Dezie
ebe agụmakwụkwọAlabama Agricultural and Mechanical University Dezie
Ụcha ime anyabrown Dezie
ụcha ntụtụ isiNtụtụ ojii Dezie
ụdị egwuregwuegwuregwu Dezie
so na1996 Summer Olympics Dezie
nnọchiaha nkeonweL484 Dezie

Taiwo Aladefa (amụrụ na !9 disemba 1971) bụ onye ọsọ egwuregwu Naijiria lara ezumike nká. Ọ gara Mahadum Alabama A&M site na 1989 ruo 1993. Ọ ka bụ onye na-ejide ihe ndekọ ụlọ akwụkwọ ya na ọsọ 100Mita (13.19sec) ma bụrụ NCAA All American athlete ugboro iri na isii. Taiwo Aladefa so na otu ụmụ akwụkwọ kọleji ndị ojii mbụ merịrị asọmpi egwuregwu nke NCAA haziri (1992). Ọ zọrọ mpị na asọmpi olympik nke ụmụ nwaanyị emere na 1996.[1]

Taiwo bụ otu n'ime ndi ọsọ egwuregwu iri kachasị ọsọ nke 100mita na Afrika. O ritere ọla edo na egwuregwu nke mba Afrika niile emere na 1995 na ọla ọcha na 1991 na asọmpi nke 1993[2] ma merie Egwuregwu Africa niile na 1995 ya na ndekọ mmeri ọhụrụ nke 12.98 sekọnd.[3]

E jiri onyinye nke Africa Legend in Athletics were kwanyeere Taiwo Aladefa ugo na-afọ 2011 ma tinye aha ya na Alabama A&M University Hall of Fame na August 2012. Nwanne ya nwoke bụ Kehinde Aladefa sonyere na-asọmpi 400mita na 1996 Olympik[4] ma nweta ọla ọcha na ọla nchara na egwuregwu nke mba Afrika niile na 1995 ma na 1999.[5]

Ebe m si dee[dezie | dezie ebe o si]

Njikọ dị na mpụga[dezie | dezie ebe o si]

  • Taiwo Aladefa-Darden at World Athletics