Tetsuko Kuroyanagi

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Tetsuko Kuroyanagi
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịJapan Dezie
aha n'asụsụ obodo黒柳 徹子 Dezie
Aha enyereTetsuko Dezie
aha ezinụlọ yaKuroyanagi Dezie
aha otutuトットちゃん, チャック Dezie
name in kanaくろやなぎ てつこ Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya9 Ọgọọst 1933 Dezie
Ebe ọmụmụTokyo City Dezie
ŃnàMoritsuna Kuroyanagi Dezie
ŃnéChō Kuroyanagi Dezie
nwanneMari Kuroyanagi, Noriaki Kuroyanagi Dezie
IkwuShūji Taguchi Dezie
Asụsụ obodoJapanese Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaJapanese Dezie
Asụsụ ọ na-edeJapanese Dezie
Ọrụ ọ na-arụomee, Onye na-ede akụkọ ndụ onwe ya, seiyū, Odee akwụkwọ, tarento Dezie
onye were ọrụUNICEF Dezie
Ọkwá o jiUNICEF Goodwill Ambassador Dezie
ebe agụmakwụkwọTokyo College of Music Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)1953 Dezie
agbụrụ Dezie
blood typeA Dezie
Ọrụ ama amaTetsuko's Room, The Best Ten, Totto-Chan: The Little Girl at the Window, Q11616153, Mayuko Hitori Dezie
Ihe nriteKikuchi Kan Prize, Person of Cultural Merit, Kikuta Kazuo engeki shō, Kikuta Kazuo engeki shō Dezie
webụsaịtịhttps://totto-chan.jp/ Dezie

Tetsuko Kuroyanagi (黒柳 徹子, Kuroyanagi Tetsuko, amụrụ n'abali afọ itoolu nke ọnwa Ọgọstụ , 1933) but ome Ihe nkiri si Japan, onye ama ama n'eme ihe onyonyo na onye ndụmọdụ nye World Wide Fund for Nature advisor, onye nnọchiteanya nye UNICEF bụ Goodwill Ambassador for UNICEF.[1][2] O Sonyeere ulọ ọrụ Nkwago ndị mgbasa ozi NHK dị ka ome Ihe nkiri nwanyị mbụ n'afọ 1953. N'afọ 1954, omere ngosi mbụ ya dika onye ndụ ihe ngosi ejije redio bụ radio drama Yambō Nimbō Tombō. N'afọ 1976, ihe ngosi Tetsuko Room TV Asahi's (Tetsuko no Heya)" malikltere ime n'ikuku. Ihe omume a bụ nke Guinness World Records hụtaara n'afọ 2011 maka inwe mgbasa ozi kachasị site n'aka òtù onye mgbasa osi. Ọ malitere ime ngosi na ikuku ná kwa ụbọchị izu na ehihie,ma a ka o wetere aka na 2023, Ọ gafee la ngosi oge puku iri na otu na afọ iri anọ na asatọ ya. Akwụkwọ nkọwa ndụ ya bụ , Totto-Chan: The Little Girl at the Window, nke n' egosi ndụ ya na nwata, họọrọ WW2 gara aga efere karịa nke nwere mbiputa Nde asatọ ereelara. Agbakwunyela ya na ihe ngosi televishonu ugboro abụọ.

A makwaara ya n'ihi ọrụ ebere ya, a na-ewerekwa ya dị ka otu n'ime ndị ama ama na Japan mbụ nwetara nkwado nke mba ụwa. N'afọ 2006, Donald Richie rụtụrụaka na Kuroyanagi n'akwụkwọ ya Japanese Portraits: Pictures of Different People dị ka "nwaanyị kachasị ewu ewu na nke a na-enwe mmasị na Japan".[3]

Oge ọ malitere[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Kuroyanagi na obodo mepere emepe Tokyo, bụ Tokyo Prefecture (nke bụzi Tokyo). Nna ya bụ onye na-akpọ vaolin na onye na-eduzi egwu.[4] Aha njirimara ya dị ka nwatakịrị bụ Totto-chan, dị ka akwụkwọ akụkọ ndụ ya nke afọ 1981 si kwuo.[4]

Mmụta[dezie | dezie ebe o si]

Kuroyanagi gụrụ akwụkwọ na Tokyo College of Music, na-agụ akwụkwọ opera, ebe ọ bu n'obi ịghọ onye na-agụ egwu opera. Otú ọ dị, mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ, ọ dọtara mmasị ya na ime ihe nkiri na ụlọ ọrụ ntụrụndụ telivishọn site na isonyere Tokyo Hoso Gekidan. N'ikpeazụ, ọ ghọrọ onye na-eme ihe nkiri Japan mbụ nke e nyere nkwekọrịta nke ụlọ ọrụ Japan Broadcasting Corporation (NHK).[4][5]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Kuroyanagi na mmalite afọ

Mgbe okwupụtara gbasara Lady Penelope na usoro ihe nkiri Thunderbirds TV, Kuroyanagi ghọrọ onye a ma ama n'afọ 1975 mgbe o guzobere mmemme telivishọn ya nke ehihie Room, nke bụ ihe ngosi okwu mbụ na telivisheneng nke Japan.[6][4][7] Ụlọ ọrụ telivishọn nkeonwe Television Asahi na-agbasa ihe ngosi ahụ, ma gosipụta mkparịta ụka Kuroyanagi na ndị ama ama si n'akụkụ dị iche iche, gụnyere telivisheneng, egwuregwu na ndọrọ ndọrọ ọchịchị.[5][7] Ụlọ Tetsuko nwere ihe ịga nke ọma, a malitekwara ịkpọ Kuroyanagi "ihe omume" na Japan, na-emegide onyinyo nke ụmụ nwanyị "na-eje ozi" na "na-arụ ọrụ" na telivishọn Japan.[8] Ndekọ ọnụ ọgụgụ na-egosi na, site na mbido afọ 1990, Kuroyanagi gbara ihe karịrị puku ndị ọbịa Japan na ndị mba ọzọ ajụjụ ọnụ.[7][9] A na-ekweta na obi ụtọ ya dị ka onye na-agba ajụjụ ọnụ na nkà ikwu okwu bụ ihe mere ka mmemme TV dị ogologo.[10][5] Ọ makwaara ndị na-ege ntị na Japan site n'ịpụta ya mgbe niile na ihe ngosi telivishọn "World Mysteries".[5][11]

Afọ 1981 gosipụtara oge mgbanwe n'ọrụ ya, dịka Kuroyanagi bipụtara akwụkwọ ụmụaka ya Totto-Chan: The Little Girl at the Window, nke Kuroyanaji dere banyere ụkpụrụ nke agụmakwụkwọ na-abụghị nke omenala nke ọ nwetara na ụlọ akwụkwọ elementrị Tomoe Gakuen n'oge Agha Ụwa nke Abụọ, na onye nkuzi ya Sosaku Kobayashi. A na-ewere akwụkwọ ahụ dị ka akwụkwọ ncheta nwata ya, mgbe a tọhapụrụ ya, ọ ghọrọ akwụkwọ kacha ere ahịa n'akụkọ ihe mere eme nke Japan.[8] Dorothy Britton sụgharịrị akwụkwọ ahụ n'asụsụ Bekee na 1984, e bipụtakwara ya n'ihe karịrị mba 30.[4]

Ọrụ ebere[dezie | dezie ebe o si]

Mụ na Kōichirō Gemba (na Ministry of Foreign Affairs na 5 July 2012)

A maara Kuroyanagi n'ụwa niile maka ọrụ ebere na ịnakọta ego enyemaka ya ọ na-eme. O guzobere otu Totto Foundation, nke akpọrọ aha onye na-ede akụkọ ndụ ya Totto-chan, Little Girl at the Window.[4][1] Ntọala ahụ na-azụ ndị na-eme ihe nkiri ntị chiri, na-etinye n'ọrụ ọhụụ Kuroyanagi nke iweta ihe nkiri nye ndị ntị chiri.

N'afọ 1984, n'ịghọta ọrụ ebere ya, a họpụtara Kuroyanagi ka ọ bụrụ onye nnọchi anya Goodwill maka UNICEF, ịbụ onye mbụ si Eshia iji jide ọnọdụ a.[1] N'ime ngwụcha afọ 1980 na n'afọ 1990, ọ gara ọtụtụ mba na-emepe emepe n'Eshia na Africa maka ọrụ ebere na ọrụ obiọma, na-enyere ụmụaka ndị nwere ọdachi na agha aka yana ịkwalite mmata mba ụwa banyere ọnọdụ ụmụaka nọ na mba ndị dara ogbenye.[10][4][11] Nleta ya na Angola na 1989 bụ nleta VIP mbụ e dekọrọ site na Japan gaa mba a, ma bụrụ ihe dị ịrịba ama maka mmekọrịta mmekọrịta dị n'etiti Japan na Angola.[12] Kuroyanagi enwetala ihe karịrị nde $ 20 maka mmemme UNICEF nke ọ na-etinye aka na ya, site na mkpọsa ego telivishọn. O jikwa ego sitere n'akwụkwọ ya kacha ere ahịa, Totto-chan, nye aka na UNICEF.[13] Kuroyanagi sonyekwara na mkpọsa mba ụwa UNICEF 'Say Yes for Children', ya na ndị ọzọ ama ama.[1]

N'afọ 1997, Kuroyanagi bipụtara akwụkwọ akpọrọ "Totto-chan's Children", nke dabeere na ahụmịhe ya na-arụ ọrụ dị ka onye nnọchiteanya omume ihe ọma UNICEF site n'afọ 1984 ruo 1996.[11] Kuroyanagi bụ onye nduzi nke alaka Japan nke World Wildlife Fund.

Kuroyanagi ewetawo ebe ngosipụta ihe nkiri ndị ntị chiri nke Amerika akpọrọ America's National Theater of the Deaf na Japan ugboro abụọ, na-eso ha na-eme ihe nkiri n'asụsụ ndị ogbi.[14][15][2]

Nsọpụrụ[dezie | dezie ebe o si]

Maka itinye aka na mgbasa ozi na ntụrụndụ nke ihe ngosi telivishọn, Kuroyanagi ritere onyinye mgbasa ozi ọdịnala nke Japan, nke bụ nsọpụrụ telivisheneng kachasị elu na Japan. Kemgbe ahụ, a họpụtala ya ugboro iri na anọ dị ka onye n' ihe omume telivishọn kachasị amasị Japan, maka ihe ngosi Room.Tetsuko [1]

N'afọ 2000, Kuroyanagi ghọrọ onye mbụ natara onyinye ihe nrite Global Leadership for Children Award, nke UNICEF guzobere na ncheta afọ iri nke nzukọ Mbà Ụwa gbasara Ụmụaka afọ 1990 akpọrọ 1990 World Summit for Children.[1] N'ọnwa Mee afọ 2003, Kuroyanagi natara Order of the Sacred Treasure iji kwado afọ iri abụọ nke ozi ya maka ụmụaka ụwa.[1][16][17]

Ihe nkiri[dezie | dezie ebe o si]

Nke a bụ ndepụta nke ihe nkiri.

  • Thunderbirds (onye na-eme ihe nkiri) (1965-1966) - Lady Penelope Creighton-Ward (Japanese dub)
  • Jack na Witch (onye na-eme ihe nkiri) (1967)[18]
  • Breaking of Branches Is Forbidden (onye na-eme ihe nkiri) (1968, dir. Kihachirō Kawamoto)[19]
  • Ndị agha oge okpomọkụ (1972)[20]
  • Anne no Nikki (The Diary of Anne Frank) dị ka Mrs. Petronella Van Daan (onye na-eme ihe nkiri) (1995)
  • The Book of the Dead (onye na-eme ihe nkiri) (2005)

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 1.4 1.5 1.6 UNICEF: Goodwill Ambassador Kuroyanagi
  2. 2.0 2.1 "Distinctions Blur as Deaf Actors Share a Stage," New York Times. August 29, 1988.
  3. Japanese Portraits: Pictures of Different People Book by Donald Richie. Limited preview at Google Books.
  4. 4.0 4.1 4.2 4.3 4.4 4.5 4.6 Kuroyanagi Tetsuko profile from kyoto-su.ac.jp.
  5. 5.0 5.1 5.2 5.3 Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; no text was provided for refs named metro
  6. 黒柳徹子が47年ぶりに『サンダーバード』声優へ「徹子の部屋と違うでしょ」 from mynavi.jp/news
  7. 7.0 7.1 7.2 Gender, Language and Culture: A Study of Japanese Television Interview Discourse Book by Lidia Tanaka. Limited preview at Google Books.
  8. 8.0 8.1 Little Girl at the TV Window from Time magazine
  9. History of Asahi National Broadcasting Company, Ltd. – FundingUniverse. www.fundinguniverse.com. Retrieved on March 21, 2023.
  10. 10.0 10.1 Famous People of Japan: Tetsuko KUROYANAGI Teaching materials. Archive by Institute for Japanese Studies, at Ohio State University.
  11. 11.0 11.1 11.2 Limp prose from an angel of mercy from The Japan Times Online.
  12. Japan-Angola Relations. Ministry of Foreign Affairs of Japan. Retrieved on March 21, 2023.
  13. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; no text was provided for refs named unicef pdf
  14. National Theater of the Deaf (US): NTD moves to ASD in West Hartford, CT (2004);
  15. NTD/ASD press release: NTD moves to ASD campus
  16. L'Harmattan web site (in French), Order with gold rays and cross
  17. UNICEF to give award to actress Kuroyanagi for advocacy work Archived at Findarticles.com
  18. 少年ジャックと魔法使い. www.jmdb.ne.jp. Retrieved on March 21, 2023.
  19. 黒柳徹子の出演作品一覧. みんなのシネマレビュー. Retrieved on March 21, 2023.
  20. "Tetsuko Kuroyanagi - Trailer - Showtimes - Cast - Movies & TV - NYTimes.com", The New York Times, July 15, 2009. Retrieved on March 21, 2023.

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]

 

Àtụ:WWFN