Tunde and Wunmi Obe

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Tunde and Wunmi Obe
married couple
aha pseudonymTWO Dezie
Ọrụ ọ na-arụtelevision personality, onye ọchụ̀nta ego Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum nke Lagos Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)1988 Dezie
mba osiNaijiria Dezie

  Tunde na Wunmi Obe bụ ndị a maara n'ihu ọrụ dị ka T.W.O (Tunde, Wunmi Obe) bụ di na nwunye ndị eme Naijiria na - eme ihe ngosi na akpa ndị mmadụ ọchị, ndị na-eme ntụrụndụ na ihe onyonyo, na ndị ọchụnta ego. Ha zutere ma malite ọrụ ịkụ egwu ha dị ka ụmụ akwụkwọ na 90s.

Tunde na Wunmi Obe bu ụzọ banye n'ime ihe ntụrụndụ na ihe egwuriegwu Naijiria na The Charlie Boy Show, mmemme ana egosi na ihe onyonyo na 90s. Mgbe ngosi nke The Charlie Boy Show gasịrị, ha wepụtara abọm egwu mbụ ha Sealed n'afọ1999, nke T.W.O sochiri anya n'afọ 2003, T.W,O 4 real n'afọ 2007, T.W., Legit n'afọ 2010 na T.W.O PLUS n'afọ 2015.[1]

Ọrụ ha[dezie | dezie ebe o si]

Nchịkọta na abọm izizi ha[dezie | dezie ebe o si]

Wunmi Aboderin zutere Tunde Obe mgbe ọ na-agụ akwụkwọ na Mahadum Lagos (UNILAG) na 1988 ebe ọ na-achọ nzere na nkà ihe ọmụma ana-kpo Filọsọfi .Tunde, onye na agụ kwa akwụkwọ na Mahadum Lagos State (LASU) na-agbaso nzere na History Education. Wunmi zutere ya mgbe ọ sonyeere otu egwu UNILAG a na -kpọ Turning Point nke Tunde bụ onye ndu na-agụ egwú. Ha abụọ ghọrọ enyi. Otu egwu ahụ kewara mgbe ndị otu ya gụsịrị akwụkwọ mana Tunde na Wunmi nọkọtara ọnụ.

Ha bu ụzọ kụọ egwu dịka mmadụ abụọ na Sealed. Ọ gara nke ọma ma ha kpebiri ịrụ ọrụ na abọm. T.W.O. Ha nwetara nkwekọrịta ndekọ mbụ ha site na Zmirage n'afọ 1997 ma wepụta Abọm Sealed mbụ ha n'afọ 1998. Ọ bụ Albert Kalu mepụtara abọm ahụ.. Egwu ndị a dị na abọm ahụ "Tomorrow", "The Way", na "Jafunmi", nke bụ egwu King Sunny Adé.

Tupu e nwepụta Sealed, T.W.O gosipụtara na The Charlie Boy Show ihe dị ka afọ isii ebe Tunde gosipụtara na ihe nkiri Naijiria ole na ole. N'oge ahụ, ha na-anwa ịgbanwe onwe ha dị ka ndị na-agụ egwú kama ịbụ ndị na-eme ihe nkiri.

Afọ 2002: T.W.O.[dezie | dezie ebe o si]

Mgbe ezumike afọ anọ gasịrị, T.W.O wepụtara abọm ha akpọrọ T.W'O; abọm ahụ bụ ọkwa ha jiri gwa ọha na eze na ha agbanweela ka ha mere ka anụm di na nwunye ha pụta ìhè . Nke a bụ abọm mbụ ha dekọrọ dị ka di na nwunye. Ha wepụtara abọm ahụ n'afọ 2002. Omololu Ogunleye mepụtara abọm ahụ ma wepụta ya n'okpuru akara ha KopyKats Entertainment.

Abọm ahụ nwere egwu ndi a "Show Luv", "Voice Mail", "Ope Mi", na remix nke egwu Fela Kuti "Palava". Abọm ahụ nwere nsogbu ahịa ole na ole. E nwepụtara T.W.O n'oge enweghị akara ndekọ ma ọ bụ ụlọ ọrụ a haziri ahazi na ihe gbasara ịkụ egwu Naịjirịa.

Afọ 2006: T.W.O 4 Real[dezie | dezie ebe o si]

Mgbe afọ anọ gasịrị, T.W.O wepụtara abọm ọhụrụ n'okpuru akara ndekọ egwu Alec. Nkọcha sochiri abọm ikpeazụ ha Nkea sitere na ndị mmadụ ndị na-enweghị mmasị n'echiche nke ikụgharị egwu nke ha kuburu na mbụ. Ebumnuche ha bụ ịsọpụrụ ndị nduzi ha na ụlọ ọrụ ahụ site n'ịmegharị egwu ha na nke ọ bụla n'ime abọm ha, mana ọha na eze amaghị mkpebi ha. Ndị nkatọ hụrụ T.W.O dị ka onye ndị na enweghị anya nka ide egwu nke ha.

T.W.O 4 Real nwere ọtụtụ ndị na-emepụta egwu ha dị ka: Rymzo bụ onye mepụtara egwu ha ana-kpo "Adupe", "Like a Fool", "Let me be the one", "Tribute 2 Jay" (nke a kụrụ nye ncheta ọnwụ nke nwanne nwoke Wunmi nke obere Jaiyejeje Aboderin), "I Need Someone", na "What You Give". Pufffy T bụ onye mepụtara egwu "Mo Gbo Mo Ya" na "It's About Us". Charles Duke bụ onye mepụtara "Mo Gbo Mo Ya" remix; ebe Olaitan Adebowale mepụtara "I Need Someone".

Abọm ahụ nwere njikọrịta aka ụfọdụ ndị ọzọ na akụ egwu bụ ndị gụnyere Rymzo, Segun Obe, Mode 9, Ruggedman na Freestyle.T.W.O 4 Real bụ otu n'ime abọm ha kacha gaa ahịa, na ọnụ ọgụgụ ahịa na-enweta ọtụtụ nde.kwuru nde. Abọm ahụ ka na - aga kwa ahịa rue ugbua

  1. We can never break up - Tunde and Wunmi Obe - Premium Times Nigeria (en-GB). Premium Times Nigeria (2015-05-08). Archived from the original on 2016-06-06. Retrieved on 2016-05-28.