Uche Kalu

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Uche Kalu
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
obodo maka egwuregwuNaijiria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya16 Mee 1986 Dezie
Ebe ọmụmụAbá Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye otu egwuregwu bọọlụ Dezie
ọnọdụ egwu na otu / ọpụrụichegaa n'ihu Dezie
ụdị egwuregwuFootbọl Dezie
Uche Kalu

Uche Kalu onye amụrụ n'abalị̀ iri na isii n'ime ọnwa Mee n'afọ 1986 [1] bụ nwaafọ Nigeria n'agba bọọlụ, ọ na-agbara ndị Altyn Asyr FK na Turkmenistan Higher League [2] .

Ya na onye buburu onye otu Enyimba bụ Henry Uche ma ọ bụ onye otu egwuregwu Naịjirịa bụ midfilda na-agbara mba ụwa nọ India bụ Kalu Uche abụghị nwanne.

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

N’afọ 2007, akpọrọ ya  dị ka "ọgba bọọlu kachasị dị mkpa na premịa Liigi Naịjirịa dịka o sonyechere Enyimba site na otu ọkwa nke abụọ bụ Bussdor United FC [3] N'afọ ole na ole sochirinụ ọ nọ na-ejikwa mmerụahụ ọ nwere.Ka Mgbalị igafe na otu Botola na Wydad Casablanca na February 2012, [4] ọ laghachiri Enyimba.

Ọ gawara otu Turkish nke abụọ bụ Çaykur Rizespor na August 2012, wee nye goolu ma nye aka na nwulite okwe mbụ ya. [5]

Na Jenụwarị 2014, Uche Kalu sonyeere Adanaspor ná nkwekọrịta mbinye ego. [6]

N'ọnwa Jenụwarị 2015, Kalu gàrà nwale na Kazakhstan Premier League wezugaFC Tobol, [7] Ọ binyere aka nkwekọrịta otu afọ na klọb a n'abalị isii n'ime ọnwa February 2015. [8]

Kalu laghachiri na Adanaspor na Jenụwarị 2016, wee debanye nkwekọrịta otu afọ na ụmia ise.

Na 24 Eprel 2016 Adanaspor wetara ikike isonye na okwe mbụ Turkish ka afọ iri na abụọ gachara. Kalu Uche sonyere gba nnukwu mbọ na akụkọ ọma a. [9]

Na August 2019, Uche Kalu nke Niger na Kenya Peter Opiyo binyere aka na nkwekọrịta FC Altyn Asyr si Turkmenistan [10] . Nke a bụ onye egwuregwu bọọlụ mbụ si mba ofesi na akụkọ gbasara klọb a na 2019 Ýokary Liga .

Ọrụ mba ụwa[dezie | dezie ebe o si]

Ọ bụ onye otu B Naịjirịa ndị meriri na WAFU Nations Cup 2010 . Nkwudosike ya mere ka onye nchịkwa klọb Naịjitịa bụ Stephen Keshi kpọlite ya na 2012. Ọ gbara okwe mbụ ya na Eagles n'enweghị goolu ọbụla,megide Angola na Jenụwarị 2012. O nyere goolu nke mbụ ya na egwuregwu enyi na enyi ha gbara n'afọ ahụ megide Egypt .

Nrụtụaka[dezie | dezie ebe o si]