Uche Ogah

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Uche Ogah
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya22 Disemba 1969 Dezie
Ebe ọmụmụSteeti Abia, Uturu Dezie
ŃnàWilson Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye ọchụnta ego Dezie
Ọkwá o jiMinister of State, Mines and Steel Development Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum nke Lagos, Mahadum nke Nigeria, Mahadum Olabisi Onabanjo Dezie

Uchechukwu Sampson Ogah// (na-ege ntị) (amụrụ na abali iri abuo na abuo, n'ime onwa iri na abụọ, na afọ otu puku, nari iteolu na iri isii na iteolu (22/12/1969) bụ Onye-ozi nke Naijiria ugbu a maka Mines na Steel Development.[1][2] Onye na-emepụta mmanụ, onye ọchụnta ego, onye na-etinye ego na onye ọrụ ebere. Ogah bụ onye isi oche nke Master Energy Group, otu ụlọ ọrụ nwere ngalaba, ụlọ ọrụ ndi enyemake ihe karịrị ụlọ ọrụ iri na ise (15), na mmasị gafee ụlọ ọrụ dị iche iche, n'etiti ya bụ Masters Energy Oil na Gas Ltd.[3] Ogah nwere nsọpụrụ mba Naijiria, onye isi nke Order of the Niger (OON).[4] Onye isi ala Muhammadu Buhari họpụtara ya maka nhọpụta nke Onye-ozi ma mesịa họpụta ya dị ka Onye-ozi nke Steeti, Mines na Steel Development na ubochi Wednesday, ọnwa asatọ, abalị iri abuo na otu, na afo puku abụọ na iri n'iteolu (8/21/2019).[5][6][7][8]

Mbido ndụ na agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Ogah na ezinaụlọ Chief Wilson, onye nnyocha ahụike na ndị ọrụ ụzọ ụgbọ oloko lara ezumike nká na Ezinne Pauline Ogah nke Onuaku Uturu, Isuikwuato Local Government Area nke Abia State.[9][10]

Ndụ ezinụlọ na ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Ogah lụrụ Ngozi Sabina Ogah, onye nyocha ego. Ogah nọrọ afọ iri na ngalaba ụlọ akụ. Ọ malitere na ife ala nnaya na NAL Bank PLC. Mgbe nke ahụ gasịrị, ọ malitere ọrụ zuru oke na ụlọ akụ All States Trust Bank ma nọrọ ihe dị ka afọ abụọ na ụlọ akụ ahụ tupu ọ banye Zenith Bank na afo otu puku, nari iteolu na iri iteolu na asaa (1997), ebe ọ rịgooro n'ọkwa onye inye-aka nke onye isi oche tupu ọ gbaa arụkwaghịm na afo puku abụọ na asaa (2007).[9]

Ọrụ ebere[dezie | dezie ebe o si]

A na-ekwu na ọ na-enye obodo nta ọkụ eletrik na Uturu Community, wuru ụlọ prototypal maka obodo dum ma wuo ụlọ nzukọ puku ise (5,000) na Mahadum steeti Abia (ABSU) Uturu.[11]

ndọrọ ndọrọ ọchịchị[dezie | dezie ebe o si]

Ogah esonyewo n'ịzọ ọchịchị maka oche gọvanọ nke steeti Abia, ugboro abụọ, nke mbụ n'okpuru Peoples Democratic Party na All Progressives Congress na-achị ugbu a.

Onye isi ala Muhammadu Buhari họpụtara Ogah maka nhọpụta onye-ozi na abalị iri na atọ nke onwa asaa, na afọ puku abụọ na iri na iteolu, (23/3/2019} ya na mmadu iri anọ na abụọ (42) ndị ọzọ a họpụtara.[12] N'oge nyocha ya dị ka onye omeiwu na abaị iri abụọ na anọ n;ọnwa asaa (24/7), ọ kọwaputara atụmatụ ya banyere otu esi arụ ọrụ na refineries Naijiria yana atụmatụ ya maka ego ọnụego Naijiria.[13][14] Senate kwadoro Ogah maka nhọpụta Ony-ozi na July 30 na August 21, 2019 ka a kwadoro ma ṅụọ iyi dị ka Onye-ozi nke Steeti maka Mmanụ na Mmepe Steel.[15][16]

Ebemsidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. Uchechukwu Ogah: Champion Extraordinaire (en-US). THISDAYLIVE (2019-04-28). Retrieved on 2020-09-25.
  2. About Ministers – Nigeria Mining Cadastre Office (en-GB). Retrieved on 2022-02-15.
  3. Masters Energy - Welcome to our World. Archived from the original on 2016-10-08. Retrieved on 2023-05-08.
  4. "The 2014 National Award List", ThisDayLive, 29 September 2014
  5. "JUST IN: Full List: Buhari assigns portfolios to new Ministers", Oak TV Newstrack, 21 August 2019. Retrieved on 26 August 2019.
  6. Nigeria (2019-07-23). Buhari New Ministers List 2019 (en-US). Daily News Nigeria. Archived from the original on 2020-04-24. Retrieved on 2019-07-26.
  7. FOR THE RECORD: Official citations of Buhari’s ministers, SGF - Premium Times Nigeria (en-GB) (2019-08-21). Retrieved on 2022-06-21.
  8. Omokri (May 2, 2022). 2023: Uchechukwu Ogah Joins Abia Gubernatorial Race. THISDAYLIVE. Retrieved on June 21, 2022.
  9. 9.0 9.1 Uchechukwu Sampson Ogah biography, net worth, age, family, contact & picture. www.manpower.com.ng. Retrieved on 2022-02-16.
  10. Nigerian Biography: Biography Of Uchechukwu Sampson Ogah. www.nigerianbiography.com. Archived from the original on 2017-02-11.
  11. CLOSE-UP: Who is Uche Ogah, the 'prayer warrior' otherwise known as Ikpeazu's nightmare? (en-US). TheCable (2016-07-04). Retrieved on 2022-02-15.
  12. "BREAKING: Amaechi, Akpabio, Akume, 40 others makes Buhari's 2019 ministerial list", Oak TV Newstrack, 23 July 2019. Retrieved on 31 July 2019.
  13. Television. "Nigeria's 3 refineries can work again, Ministerial Nominee assures Senate", OAK TV, 24 July 2019. Retrieved on 31 July 2019.
  14. Television. "Current value of naira is okay, Ministerial Nominee tells Senate", OAK TV, 24 July 2019. Retrieved on 31 July 2019.
  15. Television. "Full Video: Senate confirms Buhari's 43 ministers", OAK TV, 30 July 2019. Retrieved on 31 July 2019.
  16. FULL LIST: Buhari Assigns Portfolios To Ministers. Sahara Reporters (2019-08-21). Retrieved on 2019-08-22.