Uzo Egonu

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Uzo Egonu
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya25 Disemba 1931 Dezie
Ebe ọmụmụOnịchạ Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya14 Ọgọọst 1996 Dezie
Ebe ọ nwụrụLondon Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye ese, printmaker, designer Dezie
ebe agụmakwụkwọCamberwell College of Arts Dezie
onye nnọchite anya nwebiisinkareproduction right not represented by CISAC member Dezie
Nwere ọrụ na mkpokọtaTate, Metropolitan Museum of Art Dezie
ikike nwebiisinka dị ka onye okikeỌrụ nwebiisinka chekwara Dezie
nnọchiaha nkeonweL485 Dezie

Uzo Egonu (25 December 1931 ruo 14 August 1996) bụ nwaafọ Nigerian na-ésè ihe òsìsè ,onye biri na Britain na afọ 1940 gụrụ gawa, [1] naanị otu ugboro ka ọ laghachitere n'ala nna ya n'ihi nọ ụbọchị abụọ na 1970, ọ bụ ezie na ọ nọgidere na-enwe nchegbu banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị Afrịka [2] Dị ka Rasheed Araeen si kwuo, Egonu bụ "ikekwe onye mbụ si Africa, Eshia ma ọ bụ Caribbean bịara Britain mgbe Agha gachara iji bụrụu onye nka." [3] Dị ka onye nyocha Molara Wood si kwuo, "Ọrụ Egonu jikọtara ọdịnala ndị Europe na nke Igbo mana nke pụtara ìhè bụ, o dowere Afrịka dị ka ihe ngosipụta nke ọgbara ọhụrụ. Na ijikọta asụsụ a na-ahụ anya nke nka Western na Afrika, o nyeere aka ịkọwapụta ókè nke oge a, wee si otú a na-agbagha akụkọ ọdịbendị na-adịghị mma nke Europe, na nke onye omenkà Africa oge gboo. " [4]

Akụkọ Ndu[dezie | dezie ebe o si]

Amụrụ ya na Onitsha, [1] Naịjirịa, Egonu dị na mmalite afọ iri na ụma ya na 1945 nke bụ mbụ ya ịga England. Obidola ise ihe tupu ọmalite Sacred Heart College, Calabar [5] tupu ọ gawa UK, ọ mechara gụọ Fine Arts na Taipografi na Camberwell School of Arts and Crafts, London, [2] site na 1949 ruo 1952, [6] o wee gaa isonye n'ọtụtụ ngosi.

Na 1977, o so na ndi ojii ndi n’ese ihe na ndi n’ese foto ndị ọrụ ha nochitere anya UK na Emume Second World Festival of Black Arts and African culture (Festac ’77) na Lagos, Nigeria (ndi ozo bu ndi Winston Branchn,Ronald Moody, Mercian Carrena, Armet Francis, Emmanuel Taiwo Jegede, Neil Kenlock, Donald Locke, Cyprian Mandala, Ossie Murray, Sue Smock, Lance Watson na Aubrey Williams ). [7] [8] Na 1983 otu International Association of Art kpọrọ ya ka ọ nye ya ugwu maka oge ndụ ya niile, nsọpụrụ nke ya na ndị na-ese ihe na ndị opịpị dịka Henry Moore, Joan Miró na Louise Nevelson. E tinyekwara Egonu na ngosi abụọ bụ isi nke centuri iri abụọ nke gosipụtara ndị isi ojii bụ Omenka nke British: na 1989 ihe ngosi dị ịrịba ama egosipụtara na ụlọ ngosi bụ Hayward Gallery, dị na London na ihe ngosi bụ The other Story, na afọ asaa ka nke ahụ gasịrị Transforming the Crown, nke Caribbean Cultural Center na New York City chịkọtara. Ọ bụ onye otu egwurugwu nka Rainbow Art group, atụmatụ e hiwere na 1978, nke ghotara isi nsogbu dị na njikọ gbasara ọrụ na ebumnuche agbụrụ nta niile gbasara nka , tinyere nke ha. [9]

N'afọ ndị sochirinụ ọ nwere nkụchi obi na , nsogbu anya,na abalị iri na anọ n'ọnwa ògọstụ,1996 ọ nwụrụ na London. [10]

Nhọrọ odide na Ntọala ahapụrụ[dezie | dezie ebe o si]

Isiokwu nke ọmụmụ ihe nke Olu Oguibe dere nke a kpọrọ Uzo Egonu: Onye Omenka nke Africa na West (1995), akọwakwala Egonu dịka " onye kachasị ukwuu n'ise ihe n'oge a nke Afrika". [6] Eddie Chambers ekwunyela gbasara"ike dị ịtụnanya nke Egonu iji ọdịdị ala na ụlọ dị na obodo dị iche iche mere nhazi usoro geometrik na-akpali ma na-enye mmasị, ma nke ọ bụla dị iche na nnọchi anya ya." [11] E gosipụtara ọrụ ya na ngosi ihe ngosi 2015–16 No Colour Bar: Black British Art in Action 1960–1990 na Guildhall Art Gallery, Obodo London .

Ihe Ngosi ahọrọ[dezie | dezie ebe o si]

Ngosi nke Otu onye
  • 2004: Uzo Egonu's London, Museum of London, London
  • 1997: Uzo Egonu: Past and Present in the Diaspora, InIVA
  • 1986: Uzo Egonu Now 1986: Stateless People, Royal Festival Hall, London
Ngosi nke Otu
  • 2015: No Colour Bar: Black British Art in Action 1960–1990, Guildhall Art Gallery, London
  • 2001: The Short Century, Villa Stuck, Munich, Germany; House of World Cultures, Berlin, Germany
  • 1997: Transforming the Crown: African, Asian and Caribbean Artists in Britain 1966–1996, New York City
  • 1990: Herbert Art Gallery and Museum, Coventry
  • 1989: The Other Story: Afro-Asian Artists in Post-War Britain, Hayward Gallery, London
  • 1986: Third World Within, Brixton Art Gallery, London (31 March–22 April)
  • 1975: Ljubljana Graphic Art Biennial, Graphic Art Biennial, Ljubljana, Slovenia
  • 1973: Commonwealth Institute Art Gallery, London

Nrụtụaka[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 "Uzo Egonu", Diaspora Artists.
  2. 2.0 2.1 "Uzo Egonu, Artist", InIVA.
  3. Rasheed Araeen, "Recovering Cultural Metaphors", The Other Story catalogue, 1989, p. 86.
  4. Molara Wood, "Uzo Egonu's Vision of London", 30 September 2005. First published in The Guardian, Lagos, on 19 December 2004.
  5. Rasheed Araeen, "Uzo Egonu 1931–1996", Third Text, Volume 10, Issue 36, 1996, pp. 105–106. DOI:10.1080/09528829608576634.
  6. 6.0 6.1 " The Creative Case for Diversity in Britain > Further reading on the Artists", Third Text: Critical Perspectives on Contemporary Art and Culture.
  7. "Festac (Second Festival of Black Arts and Culture)", Tate.
  8. Eddie Chambers, Black Artists in British Art: A History Since the 1950s, I.B. Tauris, 2014, pp. 42–43, 58.
  9. "Rainbow Art Group", Diaspora Artists.
  10. "Monographs on African Artists| Egonu, Uzo, 1931-1996", Smithsonian Libraries.
  11. Chambers (2014), p. 60.