Victoria Nalongo Namusisi

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Victoria Nalongo Namusisi
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịUganda Dezie
Aha enyereVictoria Dezie
aha ezinụlọ yaMukasa Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya19 Jenụwarị 1956 Dezie
Ebe ọmụmụUganda Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaLuganda, Bekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụsports journalist, Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị, Presidential Adviser, philanthropist, political reporter Dezie
ụdị egwuregwufield hockey Dezie

Victoria Nalongo Namusisi (mgbe ụfọdụ a na-akpọ Victoria Okoth Nalongo Namumisi[1]) (amụrụ na onwa 19 Jenụwarị na afọ 1956) bụ onye nta akụkọ egwuregwu na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke Uganda, onye nchịkwa ndọrọ ndọrọ ọchịchị na onye ọrụ ebere. A na-ewere Namusisi dị ka nwanyị mbụ na-ede akụkọ egwuregwu na Uganda na mgbakwunye na ije ozi dị ka onye isi oche nke mpaghara Mpigi n'etiti na afọ 1991 na 1997.[2] N'afọ 2010, ọ natara Nalubaale Medal.

Mmalite na agụmakwụkwọ ya[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Namusisi na Paul Mukasa, onye ọrụ ugbo na onye ọkụ azụ na Miriam Nalunga na onwa 19 Jenụwarị nke afọ 1956.[2] N'ime afọ ndị ọ malitere, Namusisi gụrụ akwụkwọ na Kisubi Girls School na Entebbe na Old Kampala Senior Secondary School. O mechara sonye na Institute of Public Administration (IPA) maka ọrụ odeakụkọ n'afọ 1975 wee gụchaa akwụkwọ ahụ n'afọ 1977.[2]

Ọrụ aka ya[dezie | dezie ebe o si]

Akụkọ egwuregwu[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 1976, Namusisi bụ naanị nwanyị na-ede akụkọ egwuregwu na Uganda Times . Ọ rụkwara ọrụ na Voice of Uganda na afọ 1984 mgbe ọ lọtara na Kenya. N'afọ 1988, mgbe ọ na-arụ ọrụ na akwụkwọ akụkọ Ngabo, Namusisi kọọrọ egwuregwu Olimpik nke afo 1988 na Seoul dị ka onye nta akụkọ egwuregwu na mgbakwunye na ịbụ onye na-elekọta otu ahụ.[3]

Akụkọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 1986, Namusisi gbanwere gaa na akụkọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma kenye ya na Nzukọ Ndị Omeiwu na Ụlọ Steeti.Ọ bụ site n'ọkwa a ka a họpụtara ya ka ọ bụrụ Kọmishọna Mpaghara (RDC) maka Mpaghara Mpigi.[4]

Nchịkwa ndọrọ ndọrọ ọchịchị[dezie | dezie ebe o si]

N'agbata afọ 1991 na afọ 1998, a họpụtara Namusisi ma jee ozi dị ka onye isi obodo (RDC) maka mpaghara Mpigi nke oge ahụ.[2]Ọ bụkwa onye otu National Steering Committee na 1998 n'ihi ọnọdụ ya na gọọmentị ime obodo.[5]

Ọrụ ebere ya[dezie | dezie ebe o si]

Mgbe ọ gbara arụkwaghịm dị ka onye ndụmọdụ onye isi ala na 2003, Namusisi na Manuel Pinto guzobere ogige ụmụ mgbei, Bright Kids Uganda[4][6]

Onyinye nke ya[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 2010, Namusisi bụ onye natara ihe nrite Nalubaale Medal nke a na-enye ndị ọrụ obodo niile nyere aka na mmepe ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke Uganda ma ọ bụ site na ọgụ agha ma ọ bụ nnupụisi obodo na n'ụzọ ọzọ site n'oge ọchịchị ruo taa. Ka e mesịrị na Mee 2019, ọ natara nzere nsọpụrụ nke Doctor of Humane Letters na Mahadum Carlow, USA, nke dị ka ebe nrụọrụ weebụ nke nzukọ ya si kwuo bụ "ịghọta ọrụ enyemaka ya na ndị na-adịghị ike na Uganda".[7]

Ndụ onwe onye ya[dezie | dezie ebe o si]

Namusisi lụrụ onye bụbu odeakwụkwọ ukwu nke National Council of Sports, Martin Okoth, ruo 1984 mgbe ha kewara.[2] Ha nwere ụmụ atọ.[4]

Ebesidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. This is not Museveni I knew – Luweero Bush War reporter (en). Monitor (9 January 2021). Retrieved on 9 March 2022.
  2. 2.0 2.1 2.2 2.3 2.4 Namusisi was Uganda's first female sports journalist (en). New Vision. Retrieved on 9 March 2022.
  3. Zziwa. H.B ZZIWA: Olympic shame (en-gb). The Observer – Uganda. Archived from the original on 9 March 2022. Retrieved on 9 March 2022.
  4. 4.0 4.1 4.2 Nabiruma. PEOPLE: Some collect stamps, Nalongo Namusisi collects children (en-gb). The Observer – Uganda. Archived from the original on 16 October 2022. Retrieved on 9 March 2022.
  5. National Steering Committee. cec.vcn.bc.ca. Retrieved on 9 March 2022.
  6. Changing the World One Child at a Time — Victoria Nalongo Namusisi (en-US). Carlow University (10 October 2013). Retrieved on 9 March 2022.
  7. Carlow University Names Three to Receive Honorary Degrees at May Commencement (en-US). Carlow University (8 March 2019). Retrieved on 9 March 2022.

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]