Victoria Rusoke Businge

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

 

Victoria Rusoke Businge
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịUganda Dezie
Aha enyereVictoria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya3 Jenụwarị 1956 Dezie
Ebe ọmụmụUganda Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Rutoro Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị, onye nkuzi Dezie
Ọkwá o jimember of parliament, State Minister for Local Government Dezie
Mpaghara ntuli akaKabarole District Dezie
ebe agụmakwụkwọMakerere University, Kyambogo University Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịNational Resistance Movement Dezie

Victoria Rusoke Businge nke a makwaara dị ka Rusoke Victoria Businge (amụrụ na 3 Jenụwarị 1956) bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị na onye nkuzi Uganda.[1] Victoria jere ozi dị ka onye nnọchi anya ụmụ nwanyị nke mpaghara Kabarole na nke itoolu nke Nzukọ Ndị Omeiwu nke Uganda.[2] A họpụtara ya ọzọ dị ka onye otu ndị omeiwu nke iri na otu nke Uganda na ntuli aka Jenụwarị puku abụọ na iri na otu. Ọ nwere njikọ na National Resistance Movement . N'afọ 2018, Chief Justice, Hon. Justice Bart M. Katureebe na isi ụlọ ikpe na Kampala.[3][4]

Agụmakwụkwọ na nzụlite[dezie | dezie ebe o si]

O nwere Master of Education na Mahadum Makerere (2001) wee nweta Bachelor of Education na Маhadum Makerer na 1991. O nwere diplọma na agụmakwụkwọ onye nkuzi site na Institute of Teacher Education, Kyambogo (1986), asambodo onye nkuzi nke Grade II, Mahadum Makerere (1980), na 1977, e nyere ya asambodo agụmakwụkwọ nke East Africa.[2]

Nne Victoria enweghị ike ịkụziri ya ihe karịrị O-level ya mere o nweghị ike iru nrọ ya nke ịghọ onye ọka iwu kama ọ ghọrọ onye nkuzi.[1]

Ọ rụrụ ọrụ dị ka onye isi agụmakwụkwọ distrikti, Kabarole site na 2003 ruo 2010.[1] Site na Febụwarị ruo Julaị 2003, ọ rụrụ ọrụ dị ka onye isi nkuzi na Kalinaabiri Primary School ma bụrụkwa onye isi nkuchi nke Old Kampala Primary School site na 1997 ruo pụkụ abụọ na abuo. Ọ bụ onye isi nkuzi nke City Primary School site na 1994 ruo 1995. Ọ rụrụ ọrụ dị ka osote onye isi nkuzi nke Nakasero Primary School site na 1991 ruo 1993 na dị ka onye nkuzi na Kibuli TTC site na 1986 ruo 1990. Ọ rụrụ ọrụ dị ka onye nkuzi na Shimoni Demonstration School site na 1980 ruo 1985.[2] N'afọ 1978, ọ sonyeere ma rụọ ọrụ na Institute of Teacher Education Kyambogo (ITEK) nke bụzi Mahadum Kyambogo.[1]

  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 Baranga. Kabarole’s new brooms (en-gb). The Observer – Uganda. Archived from the original on 15 October 2022. Retrieved on 18 March 2021.
  2. 2.0 2.1 2.2 Kabarole expects a two-horse race between Businge and Mutuzo (en). Daily Monitor. Retrieved on 18 March 2021.
  3. CJ Swears in New UHRC Member. www.judiciary.go.ug. Retrieved on 18 March 2021.
  4. UHRC Commissioners (en-GB). Uganda Human Rights Commission (UHRC). Retrieved on 18 March 2021.