Gaa na ọdịnaya

Vida Yeboah

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Vida Amaadi Yeboah
Member of parliament for Akwapim South Constituency
In office
7 January 1997  6 January 2001
Preceded byJohn Jerry Rawlings
Member of parliament for Akwapim South Constituency
In office
7 January 1993  6 January 1997
PresidentJohn Jerry Rawlings
Personal details
Born(1944-07-27) 27 Julaị 1944
Died27 Ọgọstụ 2006(2006-08-27) (aged 62)
NationalityGhanaian
Political partyNational Democratic Congress
Alma materUniversity of Ghana
OccupationPolitician
ProfessionTeacher, Civic Leader

Vida Amaadi Yeboah (1944-2006) bụ onye nkuzi Ghana, onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị na onye isi obodo.[1] Osote Minista nke Mmụta na Ọdịbendị site na afọ 1988 ruo afọ 1993, Yeboah nyere aka guzobe Forum for African Women Educationalists (FAWE) na 1992. A họpụtara ya ka ọ bụrụ onye omeiwu na 1992, Yeboah ghọrọ onye otu gọọmentị Jerry Rawlings, na-eje ozi dị ka minista njem nleta site na afọ 1997 ruo na afọ 2001.

Mbido ndụ na agụmakwụkwọ

[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Vida Yeboah na 27 Julaị, na afọ 1944 n'obodo nne ya na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ, nwa nwanyị nke Kate Oye Ntow Ofosu na Eric Perigrino Nelson. Ọ gụrụ akwụkwọ na Wesley Girls High School tupu ọ nweta BA ya na French na Mahadum Ghana . Ọ gụrụ maka MA na French na Mahadum Bordeaux na France, na diplọma post-graduate na agụmakwụkwọ na Mahadim Cape Coast.[2]

Ọ kụziri ihe afọ iri na anọ n'ụlọ akwụkwọ ụmụ nwanyị na Ghana, ọ ghọrọ onye isi ụlọ akwụkwọ sekọndrị ụmụ nwanyị Mfantsiman, tupu a họpụta ya dịka osote odeakwụkwọ maka agụmakwụkwọ n'afọ 1985.[3]

Site na afọ 1988 ruo afọ 1993 Vida Yeboah bụ osote minista nke agụmakwụkwọ na ọdịbendị.[4] Yeboah gbanwere usoro agụmakwụkwọ tupu mahadum, na-eme ka ọnụ ọgụgụ ụmụ agbọghọ na-aga.[5] N'afọ 1992, ya na ụmụ nwanyị anọ ndị ọzọ na-ahụ maka agụmakwụkwọ n'Afrịka guzobere Forum for African Women Educationalists: Fay Chung na Zimbabwe, Simone Testa na Seychelles, Paulette Moussavon-Missambo na Gabon, na Alice Tiendrebengo na Burkina Faso.[6]

Ndọrọ ndọrọ ọchịchị

[dezie | dezie ebe o si]

A họpụtara Vida ka ọ nọchite anya Akuapim South na nzuko omeiwu mbụ nke mba nke anọ nke Ghana na 7 Jenụwarị, na afọ 1993 mgbe a kwupụtara na ọ bụ onye mmeri na ntuli aka ndị omeiwu Ghana nke afọ 1992 nke e mere na 29 Disemba, na afọ 1992.

A họpụtara ya ọzọ n'ime ndị omeiwu nke abụọ nke mba nke anọ mgbe ọ nwetasịrị pasent 48 nke votu na ntuli aka afọ 1996.[7] A họpụtara ya na afọ 1997 dị ka Minista nke Njem ebe ọ jere ozi ruo afọ 2001, ọkwa minista na-abụghị nke Cabinet.[4]

Onyinye na mmata

[dezie | dezie ebe o si]

A na-echeta Vida Yeboah dị ka otu n'ime ndị guzobere Forum for African Women Educationalists (FAWE) Ghana's Chapter.[8]

Ebenside

[dezie | dezie ebe o si]
  1. Vida Yeboah (2006). "Foreword", in Dagron: Communication for Social Change Anthology: Historical and Contemporary Readings. CFSC Consortium, Inc.. ISBN 978-0-9770357-9-3. 
  2. The late Vida Amaadi Yeboah.
  3. New secretaries for education, Talking Drums, Vol. 2, p.25.
  4. 1 2 Martin K.I. Christensen (26 January 2010). Ghana Ministers. Worldwide Guide to Women in Leadership. Martin K.I. Christensen. Retrieved on 2010-05-31.
  5. Kamene Okonjo (1994). "Ghana: Women and the Evolution of a Ghanaian Political Synthesis", in Nelson: Women and Politics Worldwide. Yale University Press. ISBN 978-0-300-05408-8. 
  6. Williams (2011). "Forum for African Women Educationalists", in Stange: Encyclopedia of Women in Today's World. SAGE, 581–582. ISBN 978-1-4129-7685-5. 
  7. John Larvie (1996). Elections in Ghana 1996. Electoral Commission. ISBN 978-9988-572-49-5. 
  8. About FAWE Ghana. www.fawegh.org. Retrieved on 2016-10-27.

Ebe e si nweta ya

[dezie | dezie ebe o si]
  • Vida Amaadi Yeboah na African People Database