Vinette Ebrahim

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ


Vinette Ebrahim
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịSouth Africa Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya21 Febụwarị 1957 Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụomee ihe nkiri Dezie

Vinette Ebrahim (amụrụ n'abalị iri abụo na otu nke ọnwa Febrụwarị,na 1957) bụ ome ihe nkiri na odee nke South Africa amaara maka ọrụ ya dịka Charmaine Meintjies na SABC 2 soap opera 7de Laan . [1] Ọ bụ nwanne nwanyị ome ihe nkiri bụ Vincent Ebrahim . [2]

Mmalite Ndụ[dezie | dezie ebe o si]

Ebrahim bụ nwanne nwanyị onye na-eme ihe nkiri South Africa-British bụ Vincent Ebrahim. [3] Nwanne-ya nwoke, ji afọ isi wee tọta ya we kpọ aha-ya Ebrahim. [3]

Nna Ebrahim rụrụ ọrụ dịka onye nkuzi na Woodstock, nke dị na Cape Town, South Africa, onye bụkwa onye na-eme ihe nkiri, ode akwụkwọ na onye nduzi. [3] N'ọgwụgwụ afọ 1950, ọ kwagara ezinụlọ ya na Coventry, England, maka ọrụ ya dị ka onye njikwa nkwago. [3] Ezinụlọ ahụ mesịrị laghachite South Africa. [3]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Ebrahim ekwuola na ọ mụtara ime ihe nkiri "na odụrụkọ" na Cape Town, ịrụ ọrụ dịka onye na-enyee aka na nkwago ihe nkiri, onye na-eme ihe nkiri na ọrụ ndị ọzọ na ụlọ ihe nkiri. [3]

Ebrahim rụrụ ọrụ kasị nke Charmaine Beukes Meintjies na telivishọn soap opera nke South Africa 7de Laan kemgbe 2000. [1]

Ebrahim egosịpụtala n'ụlọ ihe nkiri na n'ememme ihe nkiri na South Africa dum, gụnyere Suidoosterfees [4] na Klein Karoo Nasionale Kunstefees . [5] N'ememme Klein Karoo na 2007, ọ rụrụ na mmepụta asụsụ Afrikaans nke ihe omume Athol Fugard, Boesman en Lena . [5] Ọ natara awọd Kanna nke nwanyị ihe nkiri kacha mma bụ Best Actress maka ọrụ ya dị ka Lena. [6]

Na 2013 Naledi Theater Awards, Ebrahim meriri nturu ugo maka ịrụ ọrụ kacha mma na ihe omume dị ka onye (Nwanyị) ọrụ ya kacha maka Naam / Name bụ Ellen Pakkies. [6] Ihe omume a a na-akọ akụkọ ndụ n'ezie nke otu nwanyị South Africa nke a mara ikpe igbu nwa ya nwoke iñụ ọgwụ ike maarala ahụ mgbe o nwela ntachi obi na mmegbu ọtụtụ afọ. [7]

Ebrahim edela ọtụtụ ihe omume, gụnyere Die Ongelooflike Reis van Max en Lola, ọrụ nwere agwa abụọ ya na onye na-ede ihe omume nke South Africa na onye ntụzi Hugo Taljaard dere. [7] Ebrahim kwadoro ihe omume a n'akụkụ enyi ogologo oge ya na onye ome ihe nkiri South Africa bụ Chris van Niekerk nwere. [8] N'ime ihe omume na ndụ n'ezie,bụ enyi dị n'etiti nwoke na-acha ọcha na nwanyị nwere agba nọgidere na-adị, ọbụna site n'oge Apartheid . [8] Ebrahim ekwuola na n'oge Apartheid, Van Niekerk ga-aga otu sinima, ebe ọ na-aga ọzọ, na "mgbe ahụ, anyị ga-ezukọta ọnụ mee ihe nkiri stukkies". [8]

N'mmemme Klein Karoo na 2016, ọ rụrụ ọrụ na Invisible, ihe omume ọzọ o dere na Bekee na Afrikaans. [9] Na Invisible, ọ gosipụtara otu nwanyị na-enweghị ebe obibi nke bụbu onye bi na Cape Town District nke isii . [10]

Ebrahim mekwara ihe ngosi otu nwanyị gbasara ndụ ya, Praat Die Storie Smaak Kry (Let's Spice It Up), nke o megoro n'asụsụ Afrikaans na bekee na South Africa niile dịka akụkụ nke mmemme ụbọchị ụmụ nwanyị mba . [11]

N'ọnwa Julaị afọ 2019, a mara ọkwa na Ebrahim ga-ahapụ ọrụ abụọ ya nke Charmaine na nwanne ya nwanyị ọjọọ Vivian n'ihi na "akụkọ niile dị mkpa na Charmaine na Vivian agwụla". [12] Ebrahim kwụsịrị nsonye afọ iri na iteghete ya n'ihe nkiri ahụ n'abalị iri abụọ na anọ n'ọnwa Octoba 2019. [12] N'ajụjụ ọnụ e bipụtara na magazin South Africa nụ Kuier, Ebrahim kwuru na a manyere ya ịhapụ 7de Laan. [13] O kwuru na ya echerela ụzọ ọpụpụ ya ruo oge ụfọdụ, na ọ rụrụ ụka na o nweghị ọgwụgwọ akụkọ maka agwa Charmaine ọzọ. [13]

N'abalị asaa nke ọnwa Nọvemba 2019, Ebrahim malitere ọrụ ngosi onye ọbịa izu isii na rival South Africa, Binnelanders . [13]

Ihe nrite[dezie | dezie ebe o si]

A họpụtara Ebrahim maka ma nweta ọtụtụ onyinye maka ọrụ nka ya.

  • N'afọ 2007, Ebrahim nwetara ihe nrite Kanna nke onye na-eme ihe nkiri kacha mma maka arụmọrụ ya na Boesman en Lena na mmemme nka Klein Karoo. [14]
  • Na 2008, Ebrahim nwetara ihe nrite Rapport/City Press Prestige Award maka ntinye aka ya na nka. [15]
  • N'afọ 2013, Ebrahim meriri ihe nrite Naledi Theater Award maka ezi arụmọrụ ya na ngosipụta àgwà nwanyị kacha na àgwà ọrụ na ihe omume My Naam/Name is EllenPakkies.

Esemokwu[dezie | dezie ebe o si]

Ebrahim dọtara nkatọ sitere n'aka ndị na-akpa ókè agbụrụ na mbido January 2015 mgbe o kwuchara okwu na ndetu Facebook site n'aka Onye ọcha bụ onye mgbachi the nyere ndị ka ibe ha akpọrọ Supremacist Sunette Bridges, bụ nke Bridges rụrụ asị banyere ọnụ ọgụgụ dị ka ebubo nke ndị ọrụ ugbo ndịọcha egburu na 2014. Bridges kwukwara na mwakpo/ igbu ọchụ bụ ndị "ndị isi ojii" mere ya ,bụ nke bụ adị na ịkpa ókè agbụrụ. Okwu Ebrahim na ndetu gbasara ịkpa ókè agbụrụ nke Facebook mere ka nke ahụ pụta ìhè  ma dọtiaa okwu na ndị India na ndị ojii South Africa nwetara ọkwa dị elu nke mpụ ime ihe ike na nkezi (na igbu ọchụ nke ndị ọrụ ugbo ọcha ma ọ bụ onye otu ezinụlọ ha bụ naanị pacenti efu n'ụma atọ nke igbu ọchụ niile e dekọrọ na South Africa n'afọ ahụ) n'afọ ahụ. 2014. Ebrahim mekwara ka ozizi ịkpa ókè agbụrụ nke e ji wuo njirimara Afrikaan na enweghị mmasị nke ndị Afrikaan idoziharị mmehie ha mejọrọ South Africa na ndị obodo ya. [16] Nke a kpalitere nnukwu mkpagbu ịkpa ókè agbụrụ na soshal midia. Nkwụghachi azụ ịkpa ókè agbụrụ a butere ọtụtụ ndị Afrikaan gosipụtara isi okwu Ebrahim, site n'ikwu okwu mkparị megide onye na-eme ihe nkiri. Ebe ndị Afrikaan ndị ọzọ họọrọ iji ohere a enyere ha site na ịkpa ókè agbụrụ n'ụdị site n'ịgbalị ịwepu 7de Laan na mbọ ichetara Ebrahim ọnọdụ ya n'ime ndị isi ọchịchị nke ndị ọcha site n'ịnapụ ya ego. [17]

Nrụtụaka[dezie | dezie ebe o si]

 

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 Vinette Ebrahim: Bio. TVSA. Retrieved on 8 September 2017.
  2. "Kumars King of Small Screen", The Mercury (South Africa), Independent News and Media, 21 March 2009.
  3. 3.0 3.1 3.2 3.3 3.4 3.5 Cohen. "Kumars' Dad in New 'Material'", The Argus (Cape Town), Independent News and Media, 23 April 2011.
  4. Khan. "Suidoosterfees Celebrates People of Our City", Cape Argus, Independent Newspapers, 30 April 2016. Retrieved on 9 September 2017.
  5. 5.0 5.1 "KKNK - Soul Food for Theatregoers", Cape Argus, Independent News and Media, 23 May 2007.
  6. 6.0 6.1 de Beer. "Stars Shine Bright at Theatre Awards", Pretoria News, Independent Newspapers, 18 March 2014.
  7. 7.0 7.1 "Max and Lola in Charming Two-Hander", Cape Times (South Africa), Independent Newspapers, 16 January 2015. Retrieved on 8 September 2017.
  8. 8.0 8.1 8.2 "Age-Old Forbidden Friendship Laid Bare", Cape Argus, Independent Newspapers, 26 January 2015.
  9. "Giveaway", Weekend Argus (Cape Town), Independent Online, 23 April 2016.
  10. "Culture in the Klein Karoo", Cape Times (South Africa), Independent News and Media, 24 March 2016.
  11. Muston. "Vinette Brings Women's Day Show to Bay", The Herald (South Africa), BDFM Publishers, 7 August 2009.
  12. 12.0 12.1 It's the end of the Laan for twin sisters Charmaine and Vivian. TVSA: South Africa's TV Website. TVSA. Retrieved on 19 November 2019.
  13. 13.0 13.1 13.2 "Vinette Ebrahim slams '7de Laan' after forced exit", Channel 24, 24.com, 30 October 2019. Retrieved on 19 December 2019.
  14. De Beer. "KKnK Honours the Best with Kanna Awards", The Star (Johannesburg), Independent News and Media, 15 May 2007.
  15. Ncaca. "Prestige Awards to Honour Top Female Achievers", City Press (South Africa), 14 September 2008.
  16. van der Merwe (3 January 2015). Sepiester looi Sunette Bridges oor ras. Netwerk 24. Retrieved on 5 January 2015.
  17. Adams (5 January 2015). Local celebs in racist spat. iol News. Retrieved on 5 January 2015.