Wunmi Mosaku

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Wunmi Mosaku
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria, Obodoézè Nà Ofú Dezie
Aha enyereWunmi, Oluwunmi, Olapeju Dezie
aha ezinụlọ yaMosaku Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya31 Julaị 1986 Dezie
Ebe ọmụmụZaria Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụomee, omee ihe nkiri, stage actor Dezie
ebe agụmakwụkwọRoyal Academy of Dramatic Art Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)2006 Dezie
Wunmi Mosaku

Wunmi Mosaku (amuru n’afọ 1986) bu onye Naijiria nke Britain ejiri ọrụ ihe nkiri na ịtị egwu wee mara.[1] A maara ya maka ọrụ ya dị ka Joy na ihe ngosi BBC Two bụ Moses Jones (2009) na Holly Lawson na ihe ngosi ITV bụ Vera (2011–12). O meriri 2017 BAFTA TV Award for Best Supporting Actress maka ọrụ ya dịka Gloria Taylor na ihe nkiri TV bụ Damilola, Our Loved Boy (2016). Na 2019, ọ putara n'usoro nke ise Luther.[2]

Ndụ mmalite[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Mosaku na Naijiria, ma o mechara kwaga Manchester, England, mgbe ọ dị otu afọ. Ọ gara Trinity Church of England High School na Xaverian Sixth Form College. Ọ gụrụ egwu ruo afọ iri na otu na otu ụmụ egwu nke Manchester Girls Choir. Ndị mụrụ ya bụ ndị prọfesọ na Naijiria mana ha enweghị ike ịrụ otu ọrụ ahụ na UK. Nne ya bidoro ọrụ azụmahịa na nna ya mechara laghachi Naịjirịa.[2]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Mosaku gụsịrị akwụkwọ na Royal Academy of Dramatic Art na 2007 wee mee ọrụ ihe nkiri mbụ ya na Arcola Theatre na mmepụta nke Pedro Calderón de la Barca ' The Great Theatre of the World. Kemgbe ahụ ọ pụtawo na Rough Crossings, nke Rupert Goold duziri ma dabere na akwụkwọ Simon Schama na Lyric Hammersmith; The Vertical Hour nke David Hare na Truth & Reconciliation, ha abụọ gosiri na Royal Court Theatre; Mules na Young Vic. Na 2009, ọ pụtara na Katrina, ejije nke gosipụtara akụkọ mmadụ isii banyere ọgụ ha maka idị ndụ mgbe Hurricane Katrina mebiri obodo New Orleans na August 2005. Mosaku mere dị ka Sophie na ihe ngosi nke Ruined nke Lynn Nottage duziri ma gosi na ụlọ ihe nkiri nke Almeida Theatre.

Na 2008, ọ pụtara na mmepụta izizi nke UNDEREXPOSED na National Portrait Gallery, ezubere iji bulie mmata ndị dị ojii a n'asọpụrụ ma na-agbapụta ikike dị n'etiti obodo ndị dị ojii na Britain. Foto ya pụtara na Commerce Way, Peckham, London. Na 2009, ọ pụtara na uhe ngosi nke BBC Two bụ Moses Jones, nke o meriri Best Actress in a Miniseries na mmemme Roma Fiction Festival.

O gosipụtara na mkpuchi ihu akwụkwọ nke Screen International magazin June – July 2009 dị ka otu n'ime UK Stars of Tomorrow, na 2011 ọ pụtara na mbipụta Nylon Magazine nke afọ 2011.

N’afọ 2010, akpọrọ Wunmi Mosaku otu n’ime ihu ndị ohuru asaa na mmemme Toronto International Film Festival, maka ọrụ ya na ihe nkiri nke I Am Slave, [3] Ọ na-mere dịka Malia; nwa agbọghọ a tọọrọ n'obodo ya na Sudan, ma resị ya ịbụ ohu. Maka ọrụ ya Mosaku nwetara akara ngosi dịka Nwaanyị ọrụ ihe nkiri Kachasị Mma na Birmingham Black Film Festival, Ọrụ ihe nkiri kacha mma na mmemme Cultural Diversity Awards na Okachasi mma nwaanyị ọrụ ihe nkiri na Screen Nation Awards. Na 2011, Mosaku sonyeere ndị ọrụ maka ihe nkiri Vera, ebe ọ meere dịka Holly Lawson, mana ọ hapụrụ ihe nkiri ahụ ka otu afọ gachara.

Na 2015, Mosaku gosipụtara na-ọrụ nkiri dika Quentina, onye polis na-ahụ maka okporo ụzọ, ihe ngosipụta nke BBC Capital dabere na akwụkwọ akụkọ John Lanchester dere nke otu aha.[4] Na 2016, ọ pụtara na Playtest, ihe omume nke ngosi bụ Black Mirror.

Mosaku meriri 2017 BAFTA TV Award for Best Supporting Actress maka ime ka Gloria Taylor na ihe nkiri onyonyo bụ Damilola, Our Loved Boy .

Ndụ ya niime[dezie | dezie ebe o si]

Mgbe ajụrụ ya ka o depụta ndị ọ na-asọpụrụ, Mosaku gụnyere nne nne ya bụ Anike Adisa, bụ onye ọ kọwara dịka onye "kuziri m ọtụtụ ihe"; onye ọrụ ihe nkiri Albert Finney onye bụ onye gbara ya ume maka ịga Royal Academy of Dramatic Art; onye ọrụ ibe ya na onye nkụzi mbụ na RADA, William Gaskill; Paul Newman, onye ọ masịrị, ọ bụghị naanị maka ime ihe nkiri, kamakwa maka mbọ enyemaka ya site na Newman's Own; na Oprah Winfrey, onye Mosaku weere dị ka "nwaanyị siri nnukwu ike." [5]

Ndetu ihe nkiri[dezie | dezie ebe o si]

Ihe Ngosi[dezie | dezie ebe o si]

Afọ Ihe ngosi Dị ka Ndetu
2007 Sold Firefighter Episode #1.5
2008 Never Better Server Episode: "First Week Euphoria"
Doctors Nurse Kelly Strathairn Episode: "Who Do You Think You Are Kidding?"
The Bill Sophie Oduya Episode "Trial and Error: Part 1"
2009 Moses Jones Joy
2010 Silent Witness Charlie Gibbs
One Night in Emergency Beautiful Nurse
Father & Son Stacey Cox
Law & Order: UK Tamika Vincent
2011 Vera Holly Lawson
32 Brinkburn Street Joy
The Body Farm Rosa Gilbert
Jo Angélique Alassane
2013 Dancing on the Edge Carla
Truckers
2014 In the Flesh Maxine Martin
2015 Don't Take My Baby Belinda
Capital Quentina
2016 Black Mirror Katie Episode: "Playtest"
Damilola, Our Loved Boy Gloria Taylor BAFTA TV Award for Best Supporting Actress
2017 Fearless DCS Olivia Greenwood
The End of the F***ing World DC Teri Darego
2018 Kiri DI Vanessa Mercer
2019 Luther DS Catherine Halliday
Animal Babies: First Year on Earth Narrator 3 part wildlife series
Temple Mercy King
2020 Lovecraft Country Ruby Baptiste Main role
2021 Loki In production

Fim[dezie | dezie ebe o si]

Afọ Ihe nkiri Dị ka Onye nduzi
2006 The Women of Troy Helen of Troy Phil Hawkins
2010 Honeymooner Seema Col Spector
Womb Erica Benedek Fliegauf
I Am Slave Malia Gabriel Range
2011 Stolen Sonia Carney Justin Chadwick
Citadel Marie Ciaran Foy
2013 Philomena Young nun Stephen Frears
2016 Batman v Superman: Dawn of Justice Kahina Ziri Zack Snyder
Fantastic Beasts and Where to Find Them Beryl David Yates
2018 Leading Lady Parts Herself Jessica Swale
2019 Sweetness in the Belly Amina Zeresenay Berhane Mehari
2020 His House Rial Remi Weekes

Redio[dezie | dezie ebe o si]

Ebe m si dee[dezie | dezie ebe o si]

  1. TEN MINUTES WITH... WUNMI MOSAKU. Archived from the original on 23 September 2015. Retrieved on 23 November 2014.
  2. 2.0 2.1 "Wunmi Mosaku interview: Idris Elba's new Luther sidekick on how she got into acting by watching Annie". Retrieved on 6 January 2019.
  3. Peter J. Thompson. I AM SLAVE’S WUNMI MOSAKU ON BEING MENDE NAZER. Retrieved on 24 November 2014.
  4. BBC One: Capital. Retrieved on 24 November 2015.
  5. "Wunmi Mosaku: my heroes and heroines".

Njikọ dị na mpụga[dezie | dezie ebe o si]