Yahia Abdel Mageed
| Ụdịekere | nwoke |
|---|---|
| Mba o sị | Sudan |
| Ụbọchị ọmụmụ ya | 1925 |
| Ụbọchị ọnwụ ya | 2020 |
| Ọrụ ọ na-arụ | onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị |
| Ọkwá o ji | minister |
| Ihe nrite | Fellow of the African Academy of Sciences |
Yahia Abdel Mageed FAAS (Templeeti:Lang-ar, 1925–13 Disemba 2020) bụ onye minista Sudan na odeakwụkwọ ukwu nke Ọgbakọ Mmiri nke United Nations nkw mbụ.
Mmalite Ndụ na Agụmakwụkwọ Ya
[dezie | dezie ebe o si]Yahia gụsịrị akwụkwọ dịka injinia ọrụ ọrụ site na Gordon Memorial College (bụzi Mahadum Khartoum ugbua) n'afọ 1950, wee nweta nzere ya n'isi ọmụmụ hydrology site na Imperial College of Science and Technology. [1]
Ọrụ na Ime Nnyocha Ya
[dezie | dezie ebe o si]Yahia sonyeere Ministri Irrigation and Hydro-Electric Power nke Sudan wee bụrụ onye Minista ya site n'afọ 1971 ruo 1976, na site n'afọ 1977 ruo 1980. N'ime afọ asatọ ndị a, o nyere aka n'iwu Roseires Dam, Khashm el-Girba Dam, na ọrụ ogbu mmiri ndị ọzọ. Ọ bụ onye ama ama maka imegide owuwu nke mgbidi Kajabr nke nwere mmetụta ọjọọ na mpaghara ahụ.[2][3] Kurt Waldheim, onye odeakwụkwọ ukwu nke UN n'oge ahụ, họpụtara Yahia ka ọ bụrụ odeakwụkwọ ukwu nke nzukọ mmiri UN (UNWC), na Mar del Plata, Argentina, na ngwụcha Mee 1976. Yahia weghaara ọchịchị n'aka onye bu ya ụzọ, onye hapụrụ ya obere ego na akụkọ ihe mere eme nke nrụrụ aka.[4][5] Iji nyere UNWC aka n'inyere Mageed aka n'ọnọdụ ya, Mostafa Kamal Tolba nyere ego United Nations Environment Programme (UNEP) gbagoterenụ.[6] Yahia nyere aka mere ka UNWC bụrụ otu n'ime ọgbakọ zuru ụwa ọnụ nke na-aga nke ọma na nke dị irè, nke UN enweela mgbe ya na ndị ya nabatara, site na nghọta ya bara uru banyere mmiri, ịbụ mmadụ dị gara gara, na nkà nlekọta mara mma. N'okwu mmeghe ya nye UNWC, Mageed kwuru:[7][8]
Agaghị atụle ọgịga nke ọma nke ọgbakọ a, ọ bụghị ebe a na Mar del Plata, ọ bụghị site n'aka anyị, kama site n'ụmụ ọmụmụ anyị ha n'ime afọ iri abụọ na-abịanụ.
Site na ụkpụrụ ndị a, ọ bụ nke na-enweghị onyinyo nke ajụjụ mgbagwoju anya na UNWC nwere nnukwu ihe ịga nke ọma. Tụnyere mgbe ọ bịarutere, Mageed hapụrụ UN n'ọnọdụ ka mma nke ukwuu.[9]

Yahia, Mostafa Kamal Tolba, na Asit K. Biswas mere ka ahụta afọ ndị 1980 dịka afọ iri nke na-eweta mmiri na Mkpocha nke mba ụwa (IWSSD), bụ mgbe akụkụ buru ibu nke ndị bi n'ụwa ga-enweta mmiri dị ọcha na gburugburu ebe obibi dị ọcha. Oge ole na ole ka UNWC kwusịchara, Tolba họpụtara Mageed, Gilbert White, na Biswas isonye na International Water Resources Association (IWRA). Ruo mgbe Tolba hapụrụ UNEP n'afọ 1992, bọọdụ a na-enwekarị nnọkọ, ihe dị ka ọnwa itoolu ọbụla. Yahia tolitere wee bụrụ onye nkwado siri ike nke IWRA. O nwere nnukwu ọrụ na ọgbakọ mmiri dị iche iche n'ụwa nke IWRA nwere na Ottawa, Cairo, na Rabat. O meriri Ntuli aka emere maka osote onye isi nke IWRA.[4]
Ọ laghachiri Sudan dị ka onye ndụmọdụ gọọmentị[11][12] na UNESCO[13] na Water Resources na Hydrology gụnyere esemokwu mba ụwa gbasara Osimiri Nile.[14][15][16]
Ọnwụ Ya
[dezie | dezie ebe o si]Yahia nwụrụ na Khartoum, Sudan, site na mkpatara osinachi, na mgbede nke 13 Disemba 2020, ọ gbara afọ iri itoolu na ise.[17]
Ihe Nrite na Nkwanye Ùgwù Ya
[dezie | dezie ebe o si]Yahia bụ onye tọrọ ntọala nke African Academy of Sciences (1985)[18] enyekwara ya IWRA Crystal Drop Award n'afọ 1991. [4]
Akwụkwọ Ndị O Bipụtara Ahọpụtara
[dezie | dezie ebe o si]- M Falkenmark, G Lindh, RG Tanner, YA Mageed (2019). Water For a Starving World. doi:10.4324/9780429267260.
- YA Mageed. The Nile Basin: Lessons from the Past. Water Resources Management Series:2,1page 56-185.
- Yahia Abdel Mageed (1993-01-01). Environmentally sound water management and development. International Journal of Water Resources Development. 9 (2): 155–165. doi:10.1080/07900629308722581. ISSN 0790-0627.
- Yahia Abdel Mageed (1984). The Jonglei canal: A conservation project of the Nile. International Journal of Water Resources Development. 2 (2–3): 85–101. doi:10.1080/07900628408722316. ISSN 0790-0627.
Hụkwa
[dezie | dezie ebe o si]Ịgụrụ Gawa
[dezie | dezie ebe o si]Biswas, Asit K. (2021-05-19). Yahia Abdel Mageed (1925–2021). Water International. 46 (4): 626–627. doi:10.1080/02508060.2021.1932976. ISSN 0250-8060
Edensibia
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ Lua error in package.lua at line 80: module 'Module:Citation/CS1/Suggestions' not found.
- ↑ Lua error in package.lua at line 80: module 'Module:Citation/CS1/Suggestions' not found.
- ↑ Lua error in package.lua at line 80: module 'Module:Citation/CS1/Suggestions' not found.
- 1 2 3 Lua error in package.lua at line 80: module 'Module:Citation/CS1/Suggestions' not found.
- ↑ Templeeti:Cite book.
- ↑ Templeeti:Kpepụta akụkọ.
- ↑ Lua error in package.lua at line 80: module 'Module:Citation/CS1/Suggestions' not found.
- ↑ Templeeti:Cite akwụkwọ

- ↑ Templeeti:Ce akwụkwọ