Zanda Zakuza
Zandile Zakuza, onye makwaara dị ka Zanda Zakuza bụ onye South Africa na onye na-agụ egwu kwaito ma bụrụkwa onye na-ede egwu. A mụrụ ya ma zụlite ya na Umlazi, ọ nwetara ọmụma mgbe ọ gosipụtara na egwu "Skeleton Move" nke Master KG na "Club Controller" (2019) nke Prince Kaybee.
Ndụ na ọrụ
[dezie | dezie ebe o si]A mụrụ Zakuza ma zụlite ya na Durban, KwaZulu-Natal mana ezinụlọ ya bu ndị Bizana na Eastern Cape.
Ọ gara ụlọ akwụkwọ sekọndrị ụmụ nwanyị nke Pinetown ma mesịa banye na Mahadum nke KwaZulu-Natal, ebe ọ gụrụ mmụta gbasara egwu, nke nlekwasị anya na jazz. Zanda hapụrụ n'afọ nke abụọ ya iji chụsoo ọrụ egwu; Otú ọ dị, o mechara laghachi na kọleji iji mụọ njikwa azụmahịa na human resources.[1]
Mgbe ọ dị obere, ọ na-ahọrọ ịgba egwú na egwuregwu karịa ma mesịa tinye uche na egwu mgbe ọ nọ n'ụlọ akwụkwọ sekọndrị. N'oge ihe omume ngosi ọ na-eme, ndị mmadụ nọ na ihe omume ahụ na-ehisi anya mmiri n'ihi ụdị obi ọ na-eji eme ihe mgbe niile.[2]
Ọrụ egwu
[dezie | dezie ebe o si]Mgbe ọ hapụsịrị mahadum, o mere ka o doo anya na ọ nọrọ ọtụtụ oge na-enweghị ọrụ ma tupu ya enwee ihe ịga nke ọma na egwu.[3][4] Ọ sonyeere ụlọ ọrụ ahụ n'afọ 2015 wee bịanye aka na nkwekọrịta ndekọ na Open Mic Productions. N'abalị́ iri abụọ na ise nke ọnwa Mee afọ 2018, ọ wepụtara abọm studio mbụ ya Synthia The Journey, . Abọm ahụ na-akọwa ndụ nne ya na nkwado ọrụ egwu ya. Abọm ahụ gụnyere Mgbakwunye sitere na Bongo Beats, Spirit Banger, Dr Moruti na Doc Shebeleza. N'abalị́ atọ nke ọnwa Ọktoba afọ 2020, e wepụtara egwu ya bụ "Khaya Lam" nke gosipụtara Master KG na Prince Benza.[5]
N'abalị́ iri abụọ na anọ nke ọnwa Septemba afọ 2021,e wepụtara egwu ya bụ"Afrika" nke gosipụtara Mr Six21 DJ, Bravo De Virus na Fallo SA.[6] Ọ natara nhọpụta maka Best Female Artist na South Africa na All Africa Music Awards .[7]
Njem
[dezie | dezie ebe o si]Isi okwu
[dezie | dezie ebe o si]- Jerusalem Live Concert (2021) (ya na Master KG)[8]
Ndepụta egwu
[dezie | dezie ebe o si]Abọm studio
[dezie | dezie ebe o si]- Synthia The Journey (2018)
Onyinye na nhọpụta
[dezie | dezie ebe o si]Afọ | Onyinye | Ụdị | Nsonaazụ | Ref. |
---|---|---|---|---|
2020 | Ihe nrite ntụrụndụ KZN | Nwanyí nwere nka kacha mma | Ahọpụtara | [9] |
2021 | All Africa Music Awards | Nwa nwere nka ihe omume kacha mma na South Afrika | Pending | [10] |
Edensibia
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ Karen (2019-04-26). Top Zanda Zakuza facts: Age, Songs, Albums, Parents and Videos (en). Briefly. Retrieved on 2020-07-14.
- ↑ Matjebele. Zanda's rise and fall to stardom (en). Move. Retrieved on 2020-07-14.
- ↑ Maseko. Zanda’s music making waves (en). News24. Retrieved on 2020-07-14.
- ↑ PressReader.com - Your favorite newspapers and magazines.. www.pressreader.com. Retrieved on 2020-07-14.
- ↑ Siyabonga. Zanda Zakuza – Khaya Lam Ft. Master KG & Prince Benza. Retrieved on 3 October 2020.
- ↑ Zanda Zakuza - Afrika Ft. Mr Six21 DJ, Bravo De Virus & Fallo SA. Ubetoo. Retrieved on 23 September 2021.
- ↑ Hansen. All Africa Music Awards 2021: All the nominees | Music In Africa. Music In Africa. Retrieved on 23 September 2021.
- ↑ Israel A (19 July 2021). Master KG (Jerusalema) Live In The UK Concert With Zanda Zakuza Excludes Nomcebo Zikode. Ubetoo. Archived from the original on 11 June 2023. Retrieved on 17 June 2022.
- ↑ Talent overload: All the winners from the first KZN Entertainment Awards. The South African.
- ↑ Hansen (23 September 2021). All Africa Music Awards 2021: All the nominees | Music In Africa. Music In Africa. Retrieved on November 21, 2021.