Zhang Haidi

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Zhang Haidi
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịChina Dezie
Aha enyereHǎi, Di Dezie
aha ezinụlọ yaZhang Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1955 Dezie
Ebe ọmụmụJinan Dezie
Ọrụ ọ na-arụOdee akwụkwọ, onye ntughari asusu Dezie
Ọkwá o jimember of the National Committee of the Chinese People's Political Consultative Conference Dezie
ebe agụmakwụkwọJilin University Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịChinese Communist Party Dezie
Ọnọdụ ahụikeparaplegia Dezie
Onye òtù nkeChina Writers Association Dezie

Zhang Haidi (amụrụ ya na ọnwa Septemba n'afọ 1955) bụ onye edemede China, onye ntụgharị okwu, onye na -ekwu okwu mkpali, yana onye isi oche nke ụlọ ọrụ na ahụ maka egwuregwu maka ndị nwere nkwarụ na China nke a n'akpọChina Administration of Sports for Persons with Disabilities na asụsụ bekee ma ọ bụ CASPD na aha ịchafụ. Ọ bụkwa ya bụ onye isi Kọmitii nke na ahụ maka nsonye ndị nkwarụ na egwuregwu Olympics nke bụ Paralympic maka mba China. Ọ bụ onye nwere nkwarụ kemgbe ọ bụ nwata, a na -akpọ ya Helen Keller na Pavel Korchagin nke China. [1] Kemgbe mbido afọ 1980, a na -eto ya dị ka ihe nlereanya maka ndị nwere nkwarụ na maka ndị ntorobịa China n'ozuzu ya, onye nke bụ " Lei Feng nke 80s". [2]

Ndụ mbido[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Zhang Haidi na ọnwa Septemba n'afọ1955 na Jinan, Province Shandong. [1] Ọ ghọrọ onye nwere ahụ mkpọnwụ mgbe ọ dị afọ ise. N'ihi ọnọdụ ọrịa na arịa ọbara ya na nke ọkpụkpụ azụ ya, a wara ya ahụ ugboro isii iji wepu efere ọkpụkpụ n'azụ ya nke mere na ewepụrụ ihe njikọ ọkpụkpụ azụ ya isii n'etiti afọ1960 na afọ1976. Nke a mere na ọ kpọnwụrụ akpọnwụ n'ahụ ya na mgbada nke mere na ọ nweghị ike ịga ije ma ọ bụ megharia ahụ ala ya. [2]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

N'ihi na ọnweghị ike ịga ụlọ akwụkwọ n'ihi nkwarụ ya, ọ kuziri onwe ya akwụkwọ ma ruo ọkwa nke na ọ mụtara ihe ndị mahadum. Ọ mụtara ọtụtụ asụsụ nke mba ọzọ, gụnyere Bekee, Japanese, German, na Esperanto, wee bụrụ onye ntụgharị okwu na onye edemede. Na afọ 1993, Mahadum Jilin nyere ya nzere masta na nkà ihe ọmụma maka ọrụ ya. [1] [2]

Zhang rụrụ ọrụ n'ụlọ ọgwụ Chengguan dị na Shen County, mpaghara Shandong. Ọrụ kwara ọrụ dị ka onye na -arụzi igbe okwu redio maka ụlọ ọrụ mgbasa ozi n'dị mpaghara ahụ. [3] Na mbido afọ 1980 wee ga'niru, ọ gara gburugburu China n'ekwu okwu mkpali, na nke ọgba ume, wee bụrụ onye ama ama na obodo niile. Ndị Kọmunist nke China (CPC) hụrụ n'ime ya ihe nlereanya ọhụrụ maka ndị ntorobịa China, wee mee mkpọsa mba niile iji kpọsaa akụkọ ndụ ya. [2] O sonyeere otu ndọrọndọrọ ọchịchị CPC na aha ịchafụ na ọnwa Disemba n'afọ 1982. [3]

O dere ọtụtụ akwụkwọ, gụnyere Bekee mara mma (Beautiful English), nke edere n'asụsụ Chinese na Bekee. [2] E bipụtala akwụkwọ akụkọ ya Nrọ na oche nkwagharị na obodo Japan na obodo Korea. [4] Ọ tụgharịkwara ọtụtụ ọrụ akwụkwọ ndị ọdịda anyanwụ dere n'asụsụ Chinese. Ntụgharị ya nke Modal Ralph Helfer : Ezi Akụkọ banyere Enyí Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ nwetara ihe nrite mba maka ọrụ ntụgharị asụsụ. [2] Ọ bụ onye otu ndị na Ọde akwụkwọ nke China, bụrụkwa ọkà mmụta nleta na Internationales Künstlerhaus Villa Concordia na Bamberg, obodoGermany site na afọ 2007 ruo afọ 2008. [4]

Zhang Haidi abụrụla onye so na ọtụtụ nnọkọ nke Kọmitii Mba nke ọgbakọ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ndị China (CPPCC), bụrụkwa onye na akwado ikike ndị nwere nkwarụ, ma ewelite olu n'akpọ maka nnweta dị mma dị mfe yana ikike ndị nwere nkwarụ ịnya ụgbọ ala. [1] [2] Na afọ 2002, China Central Television gbasara mmemme nke bụ maka ya. [2] Na ọnwa Nọvemba n'afọ 2008, a họpụtara ya ka ọ bụrụ onye isi oche nke China Disabled Persons 'Federation (CDPF), [3] ọ wee nọchie Deng Pufang onye nọ bụ na ọkwa ahụ. [2]

Na afọ 2013, Mahadum York nyere ya nzere doctorate nsọpụrụ maka ọrụ ya . [4]

Nkeonwe[dezie | dezie ebe o si]

Zhang Haidi n'alụ Wang Zuoliang (王佐良). [1]

Ntụrụaka[dezie | dezie ebe o si]

 

  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 1.4 Zhang Haidi. Women of China (15 June 2011). Archived from the original on 10 June 2015. Retrieved on 31 August 2021.
  2. 2.0 2.1 2.2 2.3 2.4 2.5 2.6 2.7 2.8 Song (2013). Biographical Dictionary of the People's Republic of China. McFarland. ISBN 978-0-7864-3582-1. 
  3. 3.0 3.1 3.2 "Zhang Haidi", Xinhua. Retrieved on 6 June 2015. (in zh)
  4. 4.0 4.1 4.2 Zhang Haidi. China Disabled Persons' Federation (21 November 2013). Archived from the original on 10 June 2015. Retrieved on 31 August 2021.

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]