Ibrahim Lamorde

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Àtụ:Infobox Politician

Ibrahim Lamorde
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereIbrahim Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya20 Disemba 1962 Dezie
Ebe ọmụmụMubi Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum Ahmadu Bello Dezie

Ibrahim Lamorde (amụrụ n'ụbochị iri abụọ n'ọnwa Decemba, afọ 1962) bụ onye uwe ojii Naijiria bụ onye aghọpụtara dịka onye na-anọchi onyeisi oche nke ụlọ ọrụ mpụ akụ na ụba na ego akpọrọ (EFCC) n'ụbọchị iri abụọ n'ọnwa Novemba, afọ 2011 mgbe Onyeisi ala bụ Jonathan chụrụ onyeisi oche ụlọ ọrụ a bụ Farida Waziri . [1] Ndi Sineti kwadoro ya dịka onye isi ocha n'ụbọchi iri na ise n'ọnwa Febụwarị afọ 2012.

Ọrụ mmalite[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Lamorde n'ụbọchị iri abụọ n'ọnwa Disemba, afọ 1962 na Mubi Mubi, di na Adamawa Steeti . Ọ gara Mahadum Ahmadu Bello, Zaria, Ọ gụchara akwụkwọ nweta asambodo BA na Sociology na-afọ 1984. O sonyeere ndị uwe ojii Naijiria na-afọ 1986, site na-afọ 1987 ruo afọ 1988 Ọrụrụ ọrụ n'ụlọ ọrụ ndị uwe ojii dị na Minna Steeti Niger . [2] Site na n'afọ 1988 ruo afọ 1989 Ọrụrụ ọrụ dịka onyeisi nkewa mpụ ndị uwe ojii na Rijau, Niger Steeti. Ọ mechara rụkwaa ọrụ dịka onye uwe ojii na-ahụ maka mmekọrịta ọha na eze maka ndị uwe ojii Niger steeti site na-afọ 1989 ruo afọ 1993.

Na-afọ 1993 a họpụtara Lamorde ka ọ bụrụ onyeisi ụlọ ọrụ ọhụrụ nke nkeji wayo pụrụ iche (Special Fraud Unit) (SFU) nke ndị uweojii na Naijiria, na-eje ozi na ngalaba nke eboro nyocha n'ihu ego ruo afọ 2002. Otu n'ime ndị otu ọrụ Lamorde na SFU bụ Farida Waziri. Mgbe ọ nọ na SFU, site na-afọ 2000 ruo afọ 2001 ọ bụ onye ndị uweojii nke abụọ nke ndị nkịtị na United Nations na Ermera District nke East Timor dị ka onye isi nyocha. Lamorde bụ onye isi ngalaba na-ahụ maka ndị uwe ojii na Oyo steeti tupu e ziga ya n’isi ụlọ ọrụ ndị uwe ojii dị na Abuja .

EFCC[dezie | dezie ebe o si]

Emepụtara EFCC na-afọ 2003, nke, Nuhu Ribadu na-achị, E mere Lamorde onye nduzi arụmọrụ mgbe Tiyamiyu Oluwagbemiga lara ezumike nká dị ka onye nduzi ọsụ ụzọ mbụ ma ọ bụ arụmọrụ na atụmatụ na-afọ 2006. N'ọnwa Disemba afọ 2007, onye isi ala bụ Umaru Musa Yar'Adua wepụrụ Ribadu n'ọkwa ya, ka onwe ike gaa ọzụzụ n'ezie. Lamorde nọchiri dịka onye na anọchi anya onye isi oche na-ọnwa Jenụwarị afọ 2008, o jidere ọnọdụ a ruo mgbe a họpụtara Farida Waziri dịka Onye isi oche nọnwa May afọ 2008. E zigakwara ya Ningi na Bauchi Steeti . Na-ọnwa Disemba afọ 2010, Lamorde laghachitere na EFCC, ọzọ  dika Onye nduzi Arumọrụ. Ọ nọchiri Stephen Otitoju, onye nọchiri onye nduzi arụmọrụ

Mgbe a chụrụ Farida Waziri n'ọrụ n'ụbọchị iri na atọ n'ọnwa Nọvemba afọ 2011, a họpụtara onye isi ndị uwe ojii na-elekọta ndị uwe ojii (ACP) Lamorde ka ọ bụrụ onye nọchiri Onye isi oche. E kwuru na ọtụtụ ndị isi ndị uwe ojii ndị ọzọ na-azọ ọkwa onye isi oche EFCC. Mkpakọrịta Lamorde na Waziri kemgbe SFU nwere ike ịbụ nkwarụ. Otú ọ dị, A kwadoro Lamorde dị ka onye isi oche nke EFCC n'ụbọchị  nke iri na ise n'ọnwa Febụwarị, afọ 2012.

Iche[dezie | dezie ebe o si]

Lamorde bụ onye otu Ụlọ akwụkwọ njikwa nke Naijiria na Ụlọ akwụkwọ njikwa mmekọrịta ọhaneze nke Naijiria .

Buharị Chụrụ ya[dezie | dezie ebe o si]

N'ụbọchị itoolu n'ọnwa Novemba afọ 2015, Onye isi ala bụ Buhari chụrụ Ibrahim Lamorde, were Ibrahim Magu dochie ya dị ka onye isi oche ọhụrụ nke EFCC.

Ebensidee[dezie | dezie ebe o si]

 

  1. Waziri’s Sack And The Future Of EFCC. P.M. News (28 November 2011). Retrieved on 22 December 2011.
  2. Obiora Ifoh (25 November 2011). The man Ibrahim Lamorde, Acting Chairman of EFCC. National Mirror. Archived from the original on 11 June 2012. Retrieved on 22 December 2011.