Gaa na ọdịnaya

Abimbola Abolarinwa

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Abimbola Abolarinwa
mmádu
Ụdịekerenwanyị Dezie
Mba o sịNaijiria Dezie
Aha n'asụsụ obodoAbimbola Abolarinwa Dezie
Aha enyereAbimbola Dezie
Aha ezinụlọ yaAbolarinwa Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1980 Dezie
Ebe ọmụmụobodo dị na ugwu ọdịda anyanwụ Europe, akụkụ nke United Kingdom Dezie
Asụsụ obodoAsụsụ Yoruba, pidgin Naịjirịa Dezie
Asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaEnglish, Asụsụ Yoruba, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụurologist, physician Dezie
Ụdị ọrụ yaphysician, urologist Dezie
Onye were ọrụLagos State University Teaching Hospital, Nigerian Air Force Medical Dezie
Ebe agụmakwụkwọUniversity of Ibadan Dezie
AgbụrụNdi Yoruba Dezie
Ụcha ntụtụ isiNtụtụ ojii Dezie
Ụcha ime anyabrown Dezie
Onye òtù nkeWest African College of Surgeons Dezie
Nnọchiaha nkeonweL484 Dezie

Abimbola Ayodeji Abolarinwa Audio(a mụrụ n'afọ1979) bụ dibia bekee Naịjirịa . Ọ bụ nwanyị izizi na Naijiria n'ọkà mmụta na ọgwụgwọ na-ahụ maka akụkụ ahụ mmadu e ji anyụ nwamịrị (urologist).

Ndụ ya

[dezie | dezie ebe o si]

Nne ya bụ onye Ọkaikpe na nna ya bụ onye otu Nigerian Air Force, ma bụrụkwa Sọjion (dọkịta na-awa ahụ mmadụ), mụrụ ya na England bụ United Kingdom. Abolarinwa bụ nwa afọ Illofa, nke dị na okpuru ọchịchị ime obodo Oke Ero nke Kwara Steeti . Ọ gụrụ akwụkwọ ogo nke praịmarị n'ụlọ akwụkwọ praịmarị ndi Air Force, dị na Kaduna, ma gụkwazie ogo akwụkwọ sekọndịrị n'ụlọ akwụkwọ ụmụ nwanyị ndị Air Force, dị na Jos, tupu ọ gụọ maka ahụike na Mahadum nke Ibadan, dị n'Ibadan, nke ọ gụchara n'afọ 2004. [1] Mgbe ọ gụchara akwụkwọ, ọ rụrụ ọrụ n'ụlọ ọgwụ Nigeria Air Force, dị n'Ikeja, na Legos Steeti, ma mechaa mechaa ọrụ mmanye National Youth Service Corps n'ụlọ ọgwụ Nigerian Army Reference, dị na Kaduna ebe ọ rụrụ ọrụ dịka onye ọrụ ahụike. N’afọ 2009, ọ nwetara ọrụ n’ụlọ ọgwụ nkuzi nke Lagos State University, ebe ọ na-arụ ọrụ ugbu a, maka ọzụzụ obibi ya na ịwa ahụ mmadụ. N'ọnwa Ọktọba nke afọ 2013, ọ ghọrọ onye a gbaara ama n'ọkà mmụta na ọgwụgwọ na-ahụ maka akụkụ ahụ mmadu e ji anyụ nwamịrị ka ọ gafere ule agba nke 2 West African College of Surgeons . Ọ bụ onye na - enweta ihe nrita izizi nke akpọrọ Zakilo Awards maka ndị ọsụ ụzọ na mpaghara mbọ ha na Jenụwarị 2019. [2] Ọ bụ onye nkuzi na Lagos State University College of Medicine na Onye Ndụmọdụ Asọpụrụ n'ụlọ ọgwụ nkuzi Lagos State University, dị n'Ikeja [3]

Ebe m si dee

[dezie | dezie ebe o si]