Abimbola Abolarinwa

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Abimbola Abolarinwa
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1980 Dezie
Ebe ọmụmụEngland Dezie
Asụsụ obodoAsụsụ Yoruba Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụsụ Yoruba, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụurologist Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum nke Ibadan Dezie
agbụrụNdi Yoruba Dezie
Onye òtù nkeWest African College of Surgeons Dezie

Abimbola Ayodeji Abolarinwa (a mụrụ n'afọ1979) bụ dibia bekee Naịjirịa . Ọ bụ nwanyị izizi na Naijiria n'ọkà mmụta na ọgwụgwọ na-ahụ maka akụkụ ahụ mmadu e ji anyụ nwamịrị (urologist).

Ndụ ya[dezie | dezie ebe o si]

Nne ya bụ onye Ọkaikpe na nna ya bụ onye otu Nigerian Air Force, ma bụrụkwa Sọjion (dọkịta na-awa ahụ mmadụ), mụrụ ya na England bụ United Kingdom. Abolarinwa bụ nwa afọ Illofa, nke dị na okpuru ọchịchị ime obodo Oke Ero nke Kwara Steeti . Ọ gụrụ akwụkwọ ogo nke praịmarị n'ụlọ akwụkwọ praịmarị ndi Air Force, dị na Kaduna, ma gụkwazie ogo akwụkwọ sekọndịrị n'ụlọ akwụkwọ ụmụ nwanyị ndị Air Force, dị na Jos, tupu ọ gụọ maka ahụike na Mahadum nke Ibadan, dị n'Ibadan, nke ọ gụchara n'afọ 2004. [1] Mgbe ọ gụchara akwụkwọ, ọ rụrụ ọrụ n'ụlọ ọgwụ Nigeria Air Force, dị n'Ikeja, na Legos Steeti, ma mechaa mechaa ọrụ mmanye National Youth Service Corps n'ụlọ ọgwụ Nigerian Army Reference, dị na Kaduna ebe ọ rụrụ ọrụ dịka onye ọrụ ahụike. N’afọ 2009, ọ nwetara ọrụ n’ụlọ ọgwụ nkuzi nke Lagos State University, ebe ọ na-arụ ọrụ ugbu a, maka ọzụzụ obibi ya na ịwa ahụ mmadụ. N'ọnwa Ọktọba nke afọ 2013, ọ ghọrọ onye a gbaara ama n'ọkà mmụta na ọgwụgwọ na-ahụ maka akụkụ ahụ mmadu e ji anyụ nwamịrị ka ọ gafere ule agba nke 2 West African College of Surgeons . Ọ bụ onye na - enweta ihe nrita izizi nke akpọrọ Zakilo Awards maka ndị ọsụ ụzọ na mpaghara mbọ ha na Jenụwarị 2019. [2] Ọ bụ onye nkuzi na Lagos State University College of Medicine na Onye Ndụmọdụ Asọpụrụ n'ụlọ ọgwụ nkuzi Lagos State University, dị n'Ikeja [3]

Ebe m si dee[dezie | dezie ebe o si]