Abiola Odejide

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Abiola Odejide
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereAbiola Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya17 Eprel 1946 Dezie
Asụsụ obodoAsụsụ Yoruba Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụsụ Yoruba, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụacademic Dezie
onye were ọrụMahadum nke Ibadan Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum nke Ibadan Dezie

Abiola Odejide bụ Emeritus Prọfesọ nke Nkwurịta Okwu na nka Asụsụ na Mahadum nke Ibadan . Ọ bụbu onye osote onye isi ọchịchị na mahadum ahụ,nakwazị nwanyị mbụ nwetara ọkwa dị otú a n'afọ iri ise na asatọ mahadum ahụ dị. [1]

Mmalite ndu ya na mmuta[dezie | dezie ebe o si]

Odejide nwetara nzere mahadum mbụ ya n'asụsụ Bekee, ka ọ gụsịrị ma jiri klaasị nke abụọ dị elu na Mahadum nke Ibadan n'afọ 1968. O mechara gaa Mahadum nke Leeds i ji nweta nzere masta n'asụsụ na nkuzi asụsụ Bekee, nke ọ gụchara dịka ọpụrụiche n'afọ 1974. O mechara akwukwo ederede nke Dọktọreti ya n'agụmgụ umuaka na Ibadan n'afọ 1986. Ọ ghọrọ prọfesọ zuru oke na Mahadum nke Ibadan n'afọ 1991. [2]

Mbipụta[dezie | dezie ebe o si]

N'edemede e dere n'afọ 2014 a kpọrọ "What can a woman do?" Gender norms in a Nigerian university e dere maka Feminist Africa, Odejide kwuru na ịkpa oke nwoke na nwanyị megidere iwu nke mahadum ka bụ ihe a na-ahụkarị n'ụlọ akwụkwọ. O choputara uche ndi kpọrọ ndi nwanyi ndi ''esemokwu'', “ndi e nwechaghị oninye mmuta akwụkwọ”, “ndi anaghị eche echiche miri emi” na “ndi ekworo” dika ihe kpatara nkwenye n'esemokwu a di n'etiti ndi nwoke na ndi nwanyi. O kwukwara na n'agbanyeghi mmuta nke agụmakwụkwọ dika otu ụlọ akwụkwọ nke Mahadum nke Ibadan, ndi bi n'ime ya ka na-ekwe ka omenala ndi na-akpa oke n'etiti na nwanyị na-ekere òkè buru ibu na mmekọrịta ha. N'ime ndụmọdụ ya, ọ tụrụ alo nke usoro achụmnta ego nke ga-eme ka ụmụ nwanyị nwee afọ ojuju. Ọ kwadoro atumatu dị irè site na nchịkọta nke ga-akwalite nha nke nwoke na nwanyị. [3]

N’afọ 2017, Odejide nyere nkuzi n'ihu ọha n’ọgbakọ a kpọrọ Thirty Years on: What Do Women Want, What Should Women Want? . N’okwu ya, ọ dụrụ gọọmentị Naịjirịa ọdụ ka ha mee mkpebi dị iche iche iji kwalite iha nha nke nwoke na nwanyị. Ọ nyere ọmụmaatụ ụmụ nwanyị ndị isi ala n'ụwa niile dịka otu Nigeria ga-esi dị nma mgbe e nyere ụmụ nwanyị ohere. Ọ katọrọ ụlọ omebe iwu nke onye isi ala dịka onye nwere pasentị pere mpe nke ụmụ nwanyị karịa ndị bu ya ụzọ, na-ekwupụta na ọ gosipụtara enweghị okwukwe n'ụmụ nwanyị.

Ọkwa nchịkwa[dezie | dezie ebe o si]

Odejide bụ nwanyị mbụ bụ osote onye isi na Mahadum nke Ibadan . [4] Na mgbakwunye, o nweela ọkwa dị iche iche na mahadum tinyere onye isi nke Distance Learning Center. Ọ lara ezumike nká n'ọnwa Nọvemba n'afọ 2011 [5]

Ebem si dee[dezie | dezie ebe o si]