Ade Olufeko

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Ade Olufeko
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNjikota Obodo Amerika Dezie
Aha enyereAde Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1980 Dezie
Ebe ọmụmụMinneapolis Dezie
Ọrụ ọ na-arụdesigner Dezie
onye were ọrụIBM Dezie
ebe agụmakwụkwọMetropolitan State University, St. Gregory's College Dezie
nnọchiaha nkeonweL485 Dezie

Ade Olufeko (a muru 1980) bụ ọkaibe n'ihe gbasara ichepụta echiche, ọmụmụ teknụzụ dị icheiche nakwa iji ego achụ nta ego na ngalaba metụtara ndị mmadụ. O keela, jikwaa ma mepụtakwa ahụmahụ ndị ahịa dị omimi maka weebụ, ahịa mbugharị na maka ebe ọha na eze. A bịa n'ahịa ọlọrọọhụrụ ndị ka na-apụta apụta, Olufeko arụọla ọrụ n'ogo onye ndụmọdụ nkà nye ụlọọrụ ndị nke onwe nakwa ndị nke ọha na eze. Ọkachamara ọ bụ na ngalaba dị icheiche mere ka ehiwe Visual Collaborative n'afọ 2007, nke bụ ebe emume na mgbasaozi maka mmekọrịta mmadụ na ibe ya na maka ime ihe n'ụzọ dị ọhụrụ. Ugbu a, ọ na-arụzi ọrụ dịka onye isi nke ya bụ ụlọọrụ. Ọ rụkwara ọrụ n'oge gara aga dịka onye ndụmọdụ n'ihe banyere njikwa nke cognetive design maka ụlọọrụ IBM.[1][2]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Olufeko akụziela nkụzi n'emume na n'ọgbakọ dị icheiche gburugburu ụwa n'ihe banyere mgbasaozi ọlọrọọhụrụ nakwa teknụzụ ndị ka na-eto eto, n'ụlọakwụkwọ dịka Mahadum Oxford, Ụlọakwụkwọ Azụmahịa nke Harvard, Mahadum Georgetown, Mahadum Yale, nakwa Ụlọakwụkwọ Azụmahịa nke Lagos. N'afọ 2017, o kwuru okwu dịka ọkaokwu pụtara ìhè n'ọgbakọ akụ na ụba mba ụwa, YGL, e mere n'Abuj; o kwukwara okwu n'ụzọ pụrụ iche na TEDX, Lagos. Ọ natara nzere nke ndị IBM Gerstner dịka onye ahịa pụrụ iche n'oge ahụ e nwere ọgbaghara kọmputa malware n'afọ 2003. Ntinye aka ya n'Afrika abụrụkwala ihe nta akụkọ nye ndị ụlọọrụ mgbasaozi dị icheiche dịka Voice of America, Thisday News, the Guardian, New Telegraph, TVC News, Vanguard nakwa ndị ọzọ.

Mgbe o biri na Minneapolis, Minnesota na New York City, a kwụrụ ya ụgwọ ka ọ kwadoo ọrụ dijital maka ọtụtụ ndị Amerịka a ma ama n'ụlọọrụ mgbasaozi. Adeolu gụrụ kọmputa sayensị; tinye uche karịchaa na multimedia, na mahadum Metropolitan steeti n'ime St Paul; ọ bụkwa otu n'ime ndị gara akwụkwọ na St Gregory College nwere ùgwù nke dị na Obalende, Lagos.

N'afọ 2007, nchọpụta o mere na njikọta design na omenaala mere ka amalite njem n'ime Sungbo's Eredo, bụ́nke weghachitara akụkọ ahụ gbasarala agbasa azụ n'etiti ndị mmadụ.[3]


Ebe Nsinweta[dezie | dezie ebe o si]

  1. Ibiwoye Dotun. "The future is considerably female— Ade Olufeko", March 28, 2017. Retrieved on May 28, 2017.
  2. Ade Olufeko speaks at Yale University, collaborates with Bahia Shehab, others in new collective. New Telegraph (April 2, 2019). Archived from the original on April 12, 2019. Retrieved on April 11, 2019.
  3. Sungbo's Eredo Monument Back to Awareness. Retrieved on 28 June 2020.