Adenike Osofisan

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Adenike Osofisan
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereAdenike Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya11 Maachị 1950 Dezie
Ebe ọmụmụOsogbo Dezie
Asụsụ obodoAsụsụ Yoruba Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụsụ Yoruba, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụacademic, university teacher Dezie
onye were ọrụMahadum nke Ibadan Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum Obafemi Awolowo, Georgia Tech, Mahadum nke Ibadan Dezie
onye ndụmọdụ doctoralAdebayo Dada Akinde Dezie
doctoral studentBamidele Ayodeji Oluwade, Babatunde Opeoluwa Akinkunmi Dezie
Academia.edu profile URLhttps://ibadan.academia.edu/AdenikeOsofisan Dezie

{{ Added photo

''Bold textAdenike Osofisan (a mụrụ n'ụbọchị nke 11 n'ọnwa Maachị n'afọ 1950) bụ onye Naịjirịa bụ prọfesọ nke Sayensị Kọmputa, onye ọkachamara na ngwuputa data na nchịkọta ihe mmụta . O bu nwanyi Naijiria nke mbụ nwetara nzere dọktọreti na Sayensị Kọmputa, ihe ọ mere n’afọ 1989. N'afọ 2006, ọ ghọrọ prọfesọ zuru oke na Mahadum nke Ibadan, nkwalite nke mere ka ọ bụrụ nwanyị Afrịka mbụ ghọrọ prọfesọ nke sayensị Kọmputa. [1]

Mmalite ndu ya na mmuta[dezie | dezie ebe o si]

Osofisan gụrụ akwụkwọ sekọndrị na Fiwasaiye Girls' Grammar School, dị n'Akure na Comprehensive High School, dị n'Ayetoro (1968). N’ime afọ 1971 n'afọ1976, ọ nwetara nzere bachelọ ya na Mahadum nke Ile-Ife, ma nweta akwụkwọ n'efu gọọmentị etiti n’ọtụtụ n’ime afọ mahadum ya. O mechara gaa Georgia Institute of Technology n'afọ 1978, nweta nzere masta na Information and Computer Science n'afọ 1979. Ederede nzere nke dọktọreti ya na Data Processing Model for Multi-access Computer Communication Network ka o mechara n'afọ 1989 na Mahadum nke Obafemi Awolowo n'okpuru nlekọta nke Adebayo Akinde . N'afọ 1993, ọ gụzuru Master of Business Administration na <a href="https://en.wikipedia.org/wiki/Financial_accounting" rel="mw:ExtLink" title="Financial accounting" class="cx-link" data-linkid="64">Accounts and Finance</a> na Mahadum nke Ibadan, ya na ederede nzere ya na Asset Portfolio Management Model for Nigerian Banks Banks: A Case Study, nke ọ gụchara dị ka nwata akwụkwọ kacha mma nke nzere MBA n'afọ ahụ. [2]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Ọrụ nkuzi[dezie | dezie ebe o si]

Osofisan malitere ọrụ nkuzi ya na Polytechnic,nke Ibadan n'afọ 1979. N'ime afọ ole na ole sochirinụ, o biliri bụrụ onye isi ngalaba sayensị na otu ụlọ akwụkwọ ahụ. N’afọ 1999, ọ banyere na Mahadum nke Ibadan were bido ọrụ dika onye isi ngalaba nke sayensị kọmputa. N'afọ 2003, o nwetara ọkwá dị ka osote prọfesọ. O nwetara prọfesọ zuru oke n'afọ 2006. O nweela mgbe ọ gara rụọ dịka ọkachamara na Mahadum nke Legos Steeti .

Otu Ndi Okachamara[dezie | dezie ebe o si]

* Onye otu Board of Trustees of Nigeria Internet Registration Association (NIRA)

* Onye bụbu onye otu na Nigeria Mathematical Center na Nigeria Institute of Management (NIM) Councils na ugbu a

* Onye otu n'ime ndị otu na-ahụ maka agụmakwụkwọ.

* Onye otu Africa Academic Board of SAP Academic Board (Systems, Applications, and Products in Data Processing).

Ugbu a, Adenike bụ Daịrekọ University of Ibadan School of Business (UISB) dị ka onye isi ntọala. A hoputara ya dika First Female Provost Nigeria Computer Society College of Fellows n'ọnwa Julayị n'afọ 2017.

Onyinye Mmata[dezie | dezie ebe o si]

Dịka nwanyị bụ ọsụ ụzọ na ngalaba agụmakwụkwọ ya, Osofisan bụ onye nnata nke ọtụtụ otu mmụta gụnyere "Nigeria Institute of Management" (1997), "Computer Association of Nigeria" (1998) na "Nigeria Computer Society" (onye otu na ndụ ya niile, 2014). [3] Ọ bukwa onye isi mbụ nke "Nigeria Women in Information Technology" (2003). Site n'afọ 2005 rue n'afọ 2009, ọ ghọrọ onye isi nwanyị mbụ na onye isi oche nke kọmitii na-achị achị "Computer Professionals Registration Council of Nigeria" [4] Edenyere ya na Nigeria Women Hall of Fame n'ụbọchị nke 10 n'ọnwa Juunu , n'afọ 2019 n'Abuja.

Mbipụta na nkọwa[dezie | dezie ebe o si]

Otu nnyocha e mere n'afọ 2009, nke lekwasịrị anya na nkewa dijitalụ dị ugbu a n'ihe banyere ozi teknụzụ na Naijiria bụ nke edepụtara na Google Scholar, nnyocha ya gachihara ihe ị ma aka chere nnabata teknụzụ dijitalụ na Naijiria ihu, n'ihe metụtara ihe a na-eme na mba ndị mepere emepe. Ọ tụkwara alo maka usoro na atụmatụ ga-eme ngwa ngwa ị nabata na mmejuputa iwu ụkpụrụ dijitalụ na gburugburu ebe obibi Naijiria. E bipụtara nnyocha ahụ na "International Journal of Global Business". [5]

Na osiso ọdịda akụ na ụba n'ihi ndabere na mbupụ mmanụ na ọdịda ọnụ ahịa dọla, Osofisan gbara gọọmentị Naịjirịa ume ka ha jiri ngalaba ICT n'ihi na o nwere ọtụtụ ihe inye aka na akụ na ụba Naijiria ma ọ bụrụ na etinye ego n'ime ya, o kwuru na agbanyeghị ihe ịma aka na-eche Naijiria ihu, e kewapụtara ọrụ nde 12 na mpaghara a site n'afọ 2012 ruo n'afọ 2016. E kwuru okwu a na 9th Annual Forum of Laureates of the Nigerian National Order of Merit n'Abuja. [6]

Ebe m si dee[dezie | dezie ebe o si]