Adeola Fayehun

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Adeola Fayehun
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereAdeola Dezie
aha ezinụlọ yaFayehun Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya6 Julaị 1984 Dezie
Ebe ọmụmụNaijiria Dezie
Asụsụ obodoAsụsụ Yoruba, Bekee Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaAsụsụ Yoruba, Bekee, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ntaakụkọ, onye na-emeputa ihe onyoyo Dezie
ụdị ọrụ yareporter Dezie
onye were ọrụCUNY TV, Sahara Reporters Dezie
ebe agụmakwụkwọOlivet College, CUNY Graduate School of Journalism, CUNY Graduate School and University Center Dezie
isi agụmakwụkwọoru nta akuko Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)2011 Dezie
Ụcha ime anyaagba aja aja Dezie
ụcha ntụtụ isiNtụtụ ojii Dezie
ihe omume dị ịrịba amainterview Dezie
usoro ederedeLatin script Dezie
webụsaịtịhttps://www.adeolafayehun.com/ Dezie

Added databox

Adeola "Eunice" Oladele Fayehun onye a mụrụ ka ọnwa Julayị dị na mkpụrụ ụbọchị isii, n'afọ1984. ọ bụ onye nta akụkọ na Nigeria. Nta akụkọ ya gbadoro ụkwụ na ihe gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị di n'etiti nkewa otu zone isii mejupụtara obodo Nigeria, mmekọrịta na ihe gbasara ego obodo any, otu ihe ndia si emetụta ndi Afrika niile di na mba ụwa. [1] [2] A maara ya nke ọma site na ajụjụ ọnu o na agbara n'ụzọ n'afọ 2015 bụ nke na ebure okwu na ụka. [3] ọ bụ ebe ya na onye nta akụkọ ibe ya si na Sahara TV bụ Omoyele Sowore jụrụ Zimbabwean onye isiala Robert Mugabe kedụ mgbe ọ ga-aritu n'ọkwa dika onyeisi ala. [4] [5] N'afọ 2013, ọ jụkwara onye isi ala Nigeria Goodluck Jonathan n'okporo ụzọ nke ọbọdo New York, kedụ ihe ọ na-eme banyere mwakpo ndị otu Boko Haram [6] Fayehun nọ na New York City arụrụ ndị Sahara Reporters ebe ọ na-ede maka otu esi eme ndọrọ ndọrọ ọchịchị obodo na mba Afrịka. Ọ na-emepụtakarị ihe akụkọ ntọ ọchị maọbụ akụkọ akaje na YouTube nke akpọrọ 'Keeping it real with Adeola' Ọ bu ndị SaharaTV na-akwado ma ebipụta nke a na YouTube.

Ndụ mbido[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Fayehun ka Adeola Eunice Oladele na Nigeria . Nne na Nna ya bụ, Rev. Dr. Solomon Ajayi Oladele na Margaret Ibiladun Oladele (aha nna ya bụ Abolarin), rụrụ ọrụ dị ka ndị nkuzi na mgbasa ozi nke ụka bekee na Nigeria. O bụ nwa ikpe azụ ụmụnne ya ise tọrọ ya. [7] O si n’agbụrụ ndị Yoruba nke di na Nigeria, Ọ na-asukwa asụsụ Yoruba nke ọma. [1]

Adeola bidoro agụmakwụkwọ kọleji na Naịjirịa ma na-agba kwọ n'efu nke ndị mbọ ịga Mahadum inweta digiri na Linqwistics. N'afọ 2003 ka ọ dị afọ iri na iteolu, ọ gara mba Amerika ije gụchapụ Kọleji site n'ọnyinye ịgụ akwụkwọ n'efu nke ndị National Association of Congregational Christian Churches nyere ya. Ọ gụchara ma nweta digiri n'afọ 2007 na Mahadum Olivet College dị na Olivet, Michigan .Ọ gụrụ maka nzikọrita ozi nakwa ịchụ nta akụkọ.. Mgbe ọ gụrụ na Olivet ọ rụrụ ọrụ na redio ma bụrụ onye odee ederede nke akwụkwọ akụkọ nke Olivet College. Dịka ihe ụmụ akwụkwọ ji egosi aka ọrụ na mmụta o bidoro ihe a kpọrọ 'Olive College TV Studio'. [8] n’afọ 2008, Fayehun nwetara nzere Mastas site na CUNY Graduate School of Journalism, Ọ gụrụ ihe gbasara ịgụpụta akụkọ ndị nta akụkọ chụtara. [9]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Mgbe ọ gụchara Mahadum ọ ruru ọru n'ụlọ ọrụ CUNY TV dị ka onye na-ahụ na akụkọ a na-akọ gara nke ọma ma bụrụ kwa eziokwu. N'oge a ọ dere ma kwado ka emepụta ihe ngosi na Sahara Reporters's Omoyele Sowore bụ onye nke o mechara jee ya na ya rụkọo ọrụ na nke akpọrọ 'behind the scenes' na Sahara Reporters . [9]

N’ọnwa Nọvemba n' afọ 2011, Fayehun bidoro akụkọ ntọ ọchị maọbụ akụkọ akaje akpọrọ 'keeping it real with Adeola. Akụkọ ihe nkiri a di nkeji iri atọ na-egosi ebe Fayehun na-eji agwa di iche iche akọ akụkọ ụfọdụ ihe na-eme na mba Afrika. [10] Mbunobi ihe ngosi a bụ iji na-akọwapụta nsogbu maọbụ ihe nhiaahụ na-esite na ndọrọ ndọrọ ọchichi nke Afrika bụ nke ga na-amasi ndị nọ mba Ofesi. [4] [11] N'ihe dike ihe ngosi otu nari na iri ise emepụtara n'afọ atọ Fayehun bu onye na-ede, ahazi ma na-akwado ihe ngosipụta ndị ahụ. [1]

Ọtụtụ mgbe a na-atụnyere ya Jon Stewart onye mkpa ọchị, Fayehun na-eji mkpa ochi na akaje maọbụ njakịrị akọwapụta akụkọ mere eme bụ nke oji aka ya mepụta. [1] Fayehun na-arụkwa ọrụnnọchite anya mba ofesi n'ụlọ ọrụ The Nation ụlọ ọrụ akwụkwọ akụkọ Lagos, Nigeria [12] .

Fayehun guzobere ebe nweta ozi site n'igwe ịntanet a kpọrọ, African Spotlight. [13]

Ajụjụ ọnụ eji mara ya[dezie | dezie ebe o si]

  • N'afọ 2013: ajụụ ọnụ ọ jụrụ onye isiala bu Goodluck Jonathan gbasara ndi omekome Boko Haram nakwa Sovereign wealth fund [6]
  • N'afọ 2015: Ajụjụ ọnụ ọ gbara onye isi ala Nigeria Muhammadu Buhari gbasara oke mpụ na aghụghọ dị na Nigeria banyere akụnụba ala anyị, [14]
  • N'afọ 2015: Osote onye isi ala bụ Yemi Osinbajo [15]
  • N'afọ 2015: Onye isi ala Zimbabwe Robert Mugabe banyere mgbe ọ ga-arịtu n'ọkwa, [3] nke a mere mgbe ọ biara maka inye Muhammadu Buhari oche dika onyeisi ala Nigeria ka ọnwa Mee dị na mkpụrụ ụbọchị iri abụọ na iteolu.

Nkwanye ugwu na onyinye[dezie | dezie ebe o si]

  • N'afọ 2008 ndị otu Foreign Press nke New York nyere ya 'Outstanding Academic And Professional Achievement' [7]
  • N'afọ 2014: Ethiopian Satellite News Network (ESAT), Washington DC, nyere ya 'Excellence In Journalism For A Democracy Award' [16]
  • N'afọ 2015:CUNY Graduate School of Journalism "nyere ya 'Best one Woman Show' [1]

Obibi ndụ ya[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 2011, Fayehun lụrụ Victor Fayehun ka di ya na Nigeria. Fayehun na di ya guzobere otu na achọghị nrite uru nke a kpọrọ KIRWA. Otu a na-enyere ndi nwere ọria anaghị agwọta agwọta aka na mba Africa. [17]

Nsinweta[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 1.4 "Meet Adeola, Nigeria's Jon Stewart: An interview with Adeola Fayehun, the host of Nigeria's Keeping It Real with Adeola", Lenny Letter, 9 March 2016. Retrieved on 9 March 2016.
  2. "Straight Talk Africa: Adeola Fayehun, Host of Sahara TV's "Keeping It Real with Adeola"", Voice of America News, 13 May 2015. Retrieved on 14 March 2016.
  3. 3.0 3.1 SaharaReporters Crew Encounter With Pres. Robert Mugabe In Nigeria. SaharaTV (31 May 2015). Retrieved on 9 March 2016.
  4. 4.0 4.1 "Nigeria's favourite satirist goes global after ambushing Robert Mugabe", Daily Maverick - Guardian Africa network, 5 June 2015. Retrieved on 9 March 2016.
  5. "How a Nigerian television reporter brought Robert Mugabe to account: TV journalist Adeola Fayehun ambushes Zimbabwean leader and asks why him he hasn't stepped down", The Daily Telegraph, 3 June 2015. Retrieved on 9 March 2016.
  6. 6.0 6.1 SaharaTV Interview with Goodluck Jonathan On The Streets Of New York. SaharaTV (24 September 2013). Retrieved on 9 March 2016.
  7. 7.0 7.1 Scholarship Winners 2008. Archived from the original on 10 March 2016. Retrieved on 9 March 2016.
  8. Career Spotlight: Adeola Fayehun, Journalist (25 November 2015). Retrieved on 14 March 2016.
  9. 9.0 9.1 "Meet the Nigerian Face Behind one of Africa's Most Popular News Satires", 24 August 2013. Retrieved on 9 March 2016.
  10. Adeola Fayehun, the 'bad girl' of Nigerian TV. Inspirational Bursts: Darasimi Oshodi (27 January 2014). Retrieved on 14 March 2016.
  11. "Straight Talk Africa: Adeola Fayehun, Host of Sahara TV's "Keeping It Real with Adeola"", 5 March 2014. Retrieved on 14 March 2016.
  12. Meet the woman who embarrassed Mugabe in Nigeria (2015-06-02).
  13. About. Archived from the original on 9 March 2016. Retrieved on 9 March 2016.
  14. Adeola Fayehun Interviews President Buhari (29 September 2015). Retrieved on 14 March 2016.
  15. SaharaTV Exclusive Interview With Vice President Yemi Osinbajo (1 June 2015). Retrieved on 14 March 2016.
  16. Ethiopia: Adeola speech at ESAT 4th year anniversary (21 May 2014). Retrieved on 9 March 2016.
  17. About. Archived from the original on 10 March 2016. Retrieved on 9 March 2016.