Adepeju Jaiyeoba

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Usòrò:Adepeju Jaiyeoba 1.jpg
Adepeju Jaiyeoba
Adepeju Jaiyeoba

Adepeju Opeyemi Jaiyeoba (a mụrụ n'ọnwa Nọvemba n'afọ 1983) bụ nwafọ Naijiria bụ onye ọchụnta ego e ji elekọta mmadụ nakwazị ọnụ na-ekwuru onye a na-emegbu, guzobere Brown Button Foundation nakwa Mother's Delivery Kit nke na-emepụta oherenlekota ahụike dị ọnụ ala na akọrọngwa e ji a mụ nwa nye ndị nne na-atu anya ị mụ nwa na Naijiria .

Ndụ[dezie | dezie ebe o si]

Jaiyeoba mụrụ ọrụ dị ka onye ọka ikpe ma gaa Mahadum nke Obafemi Awolowo dị na Ile-Ife. [1] O nwekwara ọzụzụ na azụmaahịa na Mahadum nke Texas na Austin dị na mba Amerịka nakwazị Coady International Institute,dị na Kanada. [2]

Ọrụ Jaiyeoba i ji belata ọnwụ nne na nwa bụ ka ọnwụ nke ezigbo enyi n'oge ịmụ nwa gachara n'afọ 2011 na akụkọ nke ndị ọzọ. Ọ chọpụtara na ụmụ nwanyị 145 na-anwụ ị mụ nwa, na ụmụaka 2,300 na-anwụ tupu ha eruo afọ ise na Naijiria. [3]

Brown Button ntọala kit

Barack Obama kpọrọ Jaiyeoba aha na adreesị ya n'afọ 2014 na Young African Leaders Presidential Summit na Washington [4] ma nabatakwa ya na White House n'afọ 2015. [1] N'afọ 2014, ha malitere ị ke akọrọngwa e ji a mụ nwa ka ha hụtachara mmebi nwere ike ị dị n'ihi enweghị ihe na-adịghị ọcha dịka mma na-ataghị nchara e ji ebibi eriri jịkọrọ nne na nwa mgbe a na-amụ nwa. Ka a na-eru n’afọ 2015, ha ekesaala akọrọngwa 8,000 [3] nakwazi akọrọngwa 300,000 ka afọ 2017 ruru. [5]

N'afọ 2017 o kwuru okwu na TEDx .

O kwuola okwu n'ọtụtụ ihe omume obodo Naijiria nakwa nke ụwa ma na-aga n'ihu na-akpali ndị ntorobịa nke Afrịka i me ihe.

Ihe nrite[dezie | dezie ebe o si]

  • Ọ bụ White House Emerging Global Entrepreneur
  • Ọ bụ PATH International Innovation Champion
  • 2018 USADF na onye mmeri nke ihe ngosi Citi Foundation Venture [6]
  • Onye mmeri Frost and Sullivan African Sterilized birth kit innovation award
  • Otu n’ime 2017 100 most inspiring women in Nigeria
  • Onye nrite 2017 Crans Montana Young Leader of Tomorrow
  • JCI top 10 Outstanding Young Persons of the World awardee 2017
  • JCI top 10 Outstanding Young Person of Nigeria awardee 2017
  • D-Prize awardee in Global Health
  • 2018 Unilever Young Entrepreneurs Awards Winner [7]
  • 2014 Mandela Washington Fellow [8]
  • Fellow of the Unreasonable Institute
  • Women in Successful Careers (WISCAR) member
  • 2015 Young Innovator of the World Innovation Summit for Health (WISH) [5]
  • Africa's top 10 female entrepreneur for Diaspora Demo day
  • 2015 YNaija top 10 most influential Nigerians under 40 (Advocacy) [9]
  • 2015 Cordes Fellow.
  • Commonwealth Point of Light Award Winner [10]
  • HRH Prince of Wales Young Sustainability Entrepreneur Prize Winner in 2018. [11]
  • Opportunity Desk June 2015 Young Person of the month. [12]

Okwu Ihu Ọha[dezie | dezie ebe o si]

E gosipụtara Jaiyeoba n'ọtụtụ nhiwe dị elu. O kwuru okwu na Africa Shared Value Summit nke afọ 2020; [1] The Platform Nigeria - beyond politics n'afọ 2018; [13] Social Media Week Lagos n'afọ 2018; [14]

Ebe m si dee[dezie | dezie ebe o si]