Aguluzigbo

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Aguluzigbo bụ obodo dị n'okpuru ọchịchị Anaocha n'Anambra Steeti, Naijiria . O nwere obodo isii: Iruowelle, Etuleze, Ihulu, Ufa, Ifite na Nduana . Obodo asaa gbara ya gburugburu ma bụrụ Agulu, Ora-eri, Akwaeze, Igbo-ukwu, Nanka, Obeledu na Umuona . E nwere ụdị echiche dị iche iche maka etu aha ahụ si mmalite. Otu n'ime ha kwuru na aha “Aguluzigbo” bụ ụzọ mkpirisi e si asụ “Agulu nke dị na uzo e si eje Igbo-ukwu” nke ma a sụgharịa n’asụsụ bekee ga-apụta “The Agulu which is along the route to Igbo-ukwu”. N'ụzọ doro anya, nkọwa a na-enyere aka ịmata ọdịiche dị na ya na obodo gbara ya gburugburu nke na-akpọkwa "Agulu".

Nkọwa[dezie | dezie ebe o si]

Obodo a nwere ụlọ nzi ozi ọgbara ọhụrụ, ụlọ ọgwụ na ebe ahụike. " Oyemma " na-eje ozi dị ka etiti obodo. Ọ nwere nnukwu ụlọ ahịa, ụlọ oriri na ọṅụṅụ, ụlọ ịchọ mma na ụlọ ahịa ndị na-akpụ isi.

Ememme ji ọhụrụ a na-ahazi kwa afọ adọtala ndị ama ama na ndị njem nlegharị anya si ma n'ime ma na mpụga Naijiria. Obodo a ma ama maka ọdịdị udo ya, ndị nwere omenala, nwekwa ezigbo okporo ụzọ echekwara nke ọma nakwa ezigbo atụmatụ obodo .

Aguluzigbo bụ otu n'ime obodo ole na ole e nyochara ma detuo akụkọ ha. Ọ bụ nwa afọ Agụluzigbo dere akwụkwọ a na- akpọ History of Aguluzigbo.

Ụmụ amaala ama ama gụnyere

1. Chief Sir Senator Victor Umeh, OFR, OHAMADIKE

2. Chief Barrister Chigbo Uzokwelu, EBUBEDIKE

3. Chief Ernest Anyaeche, OCHENDO

4. Chief Arinze Anyaora, IDE

5. Sir Joe Dimobi

6. Rtd Navy Commodore B.C. Adogu

7. Chief Sunday Ezenwobi

8 Chief J.P.C. Anaeto

9. Ọkammuta Achalu

10. Rev Fr Anyaora