Ahmed Mu'azu

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Ahmed Mu'azu
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya6 Septemba 1957 Dezie
Ebe ọmụmụGombe Dezie

Ahmed Tijani Mu'azu, OON, (amụrụ na ụbọchị isii nke ọnwa itoolu n’afọ 1957), bụ onye nlekọta isi oche gara aga nke Independent National Electoral Commission . Ọ nọchiri Mahmood Yakubu n'ụbọchị itoolu n'ọnwa itoolu n'afọ 2020 mgbe oge ọchịchị mbụ ya gwụrụ

Mmụta na ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Amụrụ Mu'azu na Gombe, Gombe Steeti . O nwere Mmụta ya na Gombe Steeti, Kaduna Steeti na Borno Steeti n'ime afo 1964 na afo 1975. N'ọnwa June afo 1976, ọ banyere ndị agha ụgbọ elu nke Naijiria ebe ọ nwere isi mbido ọzụzụ ndị agha ya na Ụlọ mmụta mgbachite Naijiria ruo ọnwa Disemba afo 1979 mgbe e nyere ya ọkwa onye ọkwọ ụgbọ elu. Site na-afo 1979 ruo afo 1991, ezigara ya ọrụ njikwa ụgbọ elu na ọdụ ụgbọ elu Murtala Muhammed na Mallam Aminu Kano International Airport . N’afọ 1988, Mu’azu mere ọrụ mmụta ya nke obere ndị ọrụ na ọdụ ndị agha na ndị isi ndị agha dị na Jaji . N'ime afọ 1991 na afọ 1992, ọ gara ọrụ ndị isi na ndị ọrụ na Ghana Armed Forces Staff College, dị n'obodo Teshie, Accra. [1] [2]

Site na 2003 ruo 2004, ọ bụ onye otu National War College, Ọmụmụ nke iri n'abụọ na National War College mgbe ahụ (ugbu a, National Defense College) . N'afo 2005, o nwetara MSc na mmụta usoro dị omimi na Mahadum nke Ibadan . [1]

Mu'azu nwetara ọkwa air vice marshal na-afọ 2007 wee laa ezumike nká n'onwe ya n'afọ 2013. N’afọ 2016, onye isi ala Naịjirịa, Muhammadu Buhari, họpụtara ya dịka kọmishọna National Independent National Electoral commissiont. [1] [3] [4]

Onye Nlekọta isi oche INEC[dezie | dezie ebe o si]

N'ụbọchi itoolu n'onwa iri n'otu nke afo 2020, a họpụtara Mu'azu dị ka onye nlekọta isi oche nke Independent National Electoral Commission iji nọchie Mahmood Yakubu onye oge ọchịchị mbụ ya gwụrụ. [5]

Ntụgharị[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 Sodiq (20 February 2019). CLOSE-UP: This is Ahmad Mu’azu, the man in charge of INEC logistics. TheCable. Retrieved on 19 November 2020.
  2. National Commissioners. Independent National Electoral Commission. Archived from the original on 26 November 2020. Retrieved on 19 November 2020.
  3. Yakubu hands over to Ahmed Mu’azu as acting INEC chairman. The Guardian Newspaper (9 November 2020). Retrieved on 19 November 2020.
  4. 2016 INEC Commissioners nominees. placng.org. Archived from the original on 27 November 2020. Retrieved on 19 November 2020.
  5. Sanni. "INEC appoints Mu’azu as Acting Chairman", Premium Times, 9 November 2020. Retrieved on 19 November 2020.