Aishah Ahmad

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Aishah Ahmad
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya26 Ọktoba 1976 Dezie
Ebe ọmụmụNaijiria Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye ọrụ ụlọ akụ Dezie
ebe agụmakwụkwọUniversity of Abuja, Mahadum nke Lagos, Cranfield University Dezie
Ebe obibiAbuja Dezie
affiliation stringCentral Bank of Nigeria Dezie
so naIMF 2019 Annual Meetings Dezie

Aishah Danieliusa Ahmad CFA (amụrụ n'abalị iri abụọ na isii n'ọnwa Ọktoba n'afọ 1976) bụ onye na-ahụ maka ego na Naijiria. [1][2]Ọ bụbu osote gọvanọ nke Central Bank of Naijiria ebe a họpụtara ya na mkpụrụ abalị isii na-ọnwa Ọktoba 2017, na-anọchi Sarah Alade, onye lara ezumike nká na Maachị 2017. [3][4][5]Ndị omeiwu Naijiria kwadoro ya na mkpụrụ ụbọchị iri abụọ na abụọ na n'ọnwa Maachị 2018.[6]

Mmalite na agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Aishah na Lagọs, n'ezinụlọ onye Nupe Muslim sina Bida, na mkpụrụ ụbọchị iri abụọ na abụọ n'ọnwa Ọktoba 1976. [1][2]Ọ gara akwụkwọ na St. Catherine's Primary School, Surulere Lagọs, nakwa Zarumai Primary School, Minna Niger Steeti, tupu ọgaba Federal Government Girls' College, Bida, maka agụmakwụkwọ sekọndrị ya. Aishah nwetara nzere BSc na Accounting na Mahadum Abuja wee gaa n'ihu nweta MBA na Finance na Mahadum Lagọs na MSc na Finance na Management na Cranfield School of Management. [7][8]Ọ bụ onye Daịrectọ INSEAD Certified Board na onye natara asambodo mmepe akụ na ụba site na Harvard Kennedy School. Ọ bụkwa Chartered Alternative Investment Analyst (CAIA) na Chartered Financial Analyst (CFA).[9]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Tupu ahọpụta ya na Central Bank of Nigeria na-afọ 2018, ọ bụ onye na-ahụ maka ụlọ akụ, onye njikwa ego, ọkachamara n'ihe gbasara ego na onye isi ụlọ ọrụ. N'oge na-adịbeghị anya, ọ rụrụ ọrụ dị ka onye isi nchịkwa, Retail Banking na Diamond Bank Plc.[3]

Ọ malitere na ngalaba nke onwe dị ka onye nyocha na Z.O. Ososanya & Company, wee bụrụ Chief Financial Officer na Manstructs Group Ltd.[10]

Ọrụ ya n'ụlọ akụ malitere na 2001 na First Interstate Bank (Naịjiria) Plc., ebe ewere ya n'ọlụ dịka Executive Assistant, Treasury Group, mgbe nke ahụ gasịrị ọ gara na NAL Bank Plc dị ka onye isi nke Private Banking ebe ọ rụrụ ọrụ ruo 2005. [9]Mgbe e mesịrị, ọ bụ Onye isi nke Retail Banking (Energy Group) na Onye isi otu (Asset Management Business Development) na Zenith Bank Group. Site na 2009 ruo 2014, ọ rụrụ ọrụ dị iche iche na Stanbic IBTC Bank Plc nke gụnyere ịbụ Onye isi, Ndị Ahịa Onwe Onye / Ndị Nweta Dị Elu, tupu ọ gaa Diamond Bank iji bụrụ onye ndu na-azụmahịa ya. [9]Ọ lara ezumike nká dị ka onye isi nchịkwa, Retail Banking na Diamond Bank Plc mgbe a họpụtara ya irụ ọrụ na CBN. [11]Ọrụ ndị ọzọ ọ rụrụ n'oge gara aga gụnyere ọrụ ya na Bank of New York Mellon na Synesix Financial Limited.

Ọ bụ onye isi oche nke bọọdu maka SOS Children's Villages, otu ụlọ ọrụ mmepe mba ụwa nke nweere onwe ya, nke na-abụghị nke gọọmentị nwere, otu na-anaghị achọ uru nke na-ahụ maka mmepe mba ụwa bụ nke owepụtara onwe ya kemgbe 2017. [12]Ọ rụkwara ọrụ dị ka onye isi oche nke ndị isi kansụl nke Women in Management, Business and Public Service (WIMBIZ), otu na-enweghị uru nke dị na Naijiria ebe ọ bụ otu onye nime ndị tọrọ ntọala ahụ na 2001.[8][13][14]

Ka ọ dị ugbu a, Aishah Ahmad bụ osotere Gọvanọ maka nkwụsi ike nke usoro ego na Central Bank of Nigeria. [3]Ọ bụ onye otu CBN Governing Board, Monetary Policy Committee, Financial System Stability Committee na Committee of Governors. [3][15][16]Ọ bụkwa Onye isi oche nke bọọdụ nke Nigeria Interbank Settlement System (NIBS), Nigeria Commodity Exchange (NCX) na Financial Institutions Training Centre (FITC).[17][18][19]

Ahịa ụlọ akụ Polaris[dezie | dezie ebe o si]

Na Disemba 2022, Peoples Gazette kwuru na Oriakụ Ahmad nyere aka mee ka ire Polaris Bank dị mfe na ọnụahịa dị mma ka a tụlee ya maka ọkwa Gọvanọ nke Central Bank of Nigeria (CBN) . [20]CBN gọnahụrụ ebubo ndị a ma kwuo na ire Polaris Bank bụ mkpebi ụlọ ọrụ nke kọmitii ndị isi nnọchiteanya nke Asset Management Corporation of Nigeria (AMCON) na CBN na-elekọta. A na-ejikọkwa nkwụsị ahụ na ndị ndụmọdụ iwu na ego n'èzí ma kwado ya site n'aka ndị ndu na bọọdụ nke Polaris Bank na onye zụrụ ya, Strategic Capital Investment Limited. CBN kwuru na ọ dịghị otu ọzọ kwetara ịzụrụ ụlọakụ a na-ọnụ ahịa dị elu dị ka Peoples Gazette kwuru.[21][22]

Ndụ onwe onye[dezie | dezie ebe o si]

Aishah Ahmad lụrụ Abdallah A. Ahmad, onye Brigadier General lara ezumike nká na Ndị agha Naijiria. [1]Di na nwunye ahụ nwere ụmụ abụọ.[2]

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

 

Edensibịa[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 Jaafar (5 October 2017). Profile of Aishah Ahmad, Buhari’s nominee for CBN deputy governor. Daily Nigerian. Archived from the original on 15 November 2022. Retrieved on 30 October 2023.
  2. 2.0 2.1 2.2 Bella Naija) (6 October 2017). Buhari nominates Aisha Ahmad as Central Bank Deputy Governor. BellNaija.com (Bella Naija). Retrieved on 12 October 2017.
  3. 3.0 3.1 3.2 3.3 Mrs. Aishah N Ahmad. Central Bank of Nigeria. Retrieved on 26 November 2022.
  4. "PROFILE; New CBN deputy governor Aishah Ahmad", Premium Times, 5 October 2017. Retrieved on 21 March 2019.
  5. "As Sarah Alade bows out", This day, 6 April 2017. Retrieved on 21 March 2019.
  6. Busari (22 March 2018). Senate confirms two CBN deputy governors. Retrieved on 23 March 2018.
  7. Buhari nominates Aisha Ahmad as Central Bank Deputy Governor. BellaNaija (2017-10-06). Retrieved on 2023-06-01.
  8. 8.0 8.1 "Exclusive Profile of Aisha Ahmad Nee Ndanusa, The New CBN Deputy Governor", NTA, October 6, 2017. Retrieved on March 21, 2019.
  9. 9.0 9.1 9.2 Omololu Ogunmade (6 October 2017). Nigeria: President Taps Aishah Ahmad As CBN Deputy Governor Nominee. Retrieved on 12 October 2017.
  10. "Meet CBN's New Deputy Governor, Aishah Ahmad," This Day Live, retrieved November 14, 2022.
  11. "'Women Themselves Must Be Inspired To Take Their Place in Leadership'- Aishah Ahmed, CBN’s Newly Appointed Deputy Governor," Hermaze, retrieved November 20, 2022.
  12. "International Senate," SOS Children's Village, retrieved December 15, 2022.
  13. Team Detail Home / Aishah Ahmad. wimbiz. Archived from the original on March 21, 2019. Retrieved on March 21, 2019.
  14. tchikay (2017-10-06). Aishah Ahmad Biography: Facts About The New Central Bank Deputy-Governor (en-US). BuzzNigeria - Famous People, Celebrity Bios, Updates and Trendy News. Retrieved on 2019-03-21.
  15. Monetary Policy Committees. Central Bank of Nigeria. Retrieved on 9 December 2022.
  16. About CBN. Central Bank of Nigeria. Retrieved on 8 December 2022.
  17. About NIBSS. Nigeria Inter-Bank Settlement System Plc. Retrieved on 9 December 2022.
  18. Collins Olayinka (7 January 2022). Nigeria Commodity Exchange gets new board, management. The Guardian.
  19. Musa (1 November 2022). FITC links cybercrime uptick to digitisation of banking services. The Guardian.
  20. Chukwuemeka (31 December 2022). EXCLUSIVE: In plot to be CBN governor, Aishah Ahmad rejects N1 trillion bid for Polaris; sells bank N50 billion to Mamman Daura, Tunde Sabiu, Auwal Gombe. Peoples Gazette.
  21. Nwanisobi (4 January 2023). Sale of Polaris Bank: CBN Sets Record Straigh. CBN.
  22. Adegboyega (4 January 2023). Sale of Polaris Bank followed due process – CBN. Premium Times.