Albert Rakoto Ratsimamanga

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Professor

Albert Rakoto Ratsimamanga

Ratsimamanga in 1972
Malagasy ambassador to France
[[ Ambassador to Àtụ:CountryPrefixThe]]
In office
Àtụ:En dash range
Malagasy ambassador to China and USSR
[[ Ambassador to Àtụ:CountryPrefixThe]]
In office
Àtụ:En dash range
Personal details
Born28 December 1907
Antananarivo, French Madagascar
Died16 Sepụtemba 2001(2001-09-16) (aged 93)
Antananarivo, Madagascar
CitizenshipMadagascar, France
Spouse(s)Suzanne Urverg-Ratsimamanga
Àtụ:Infobox scientist

Albert Rakoto Ratsimamanga (28 Disemba 1907 - 16 Septemba 2001) bụ dọkịta Madagascar gụrụ biochemistry na onye nnọchi anya Madagascar na mba ọzọ. Onye amụrụ n'ezinụlọ eze nwere mmechu-ihu, a zụrụ Ratsimamanga dịka dọkịta nke ọgwụ dị iche iche dị oké ọnụ ahịa na French Madagascar nakwa France, ebe ọ sụrụ ụzọ n'ihe gbasara neutraceuticals nke oge a. Ratsimamanga laghachiri Madagascar ebe, ya na nwunye ya, Suzanne Urverg-Ratsimamanga, n'afọ 1957, guzobere ụlọ ọrụ Malagasy Institute of Applied Research nke na-ahụ maka ọgwụ mgbọrọgwụ na mkpá akwụkwọ.

Mgbe ọ nọ na France, Ratsimamanga tinyere aka na mbọ nnwere onwe Madagascar, mgbe nnwere onwe gasịkwaranụ, ọ ghọrọ onye nnọchi anya mbụ nke Mba Madagascar na France ma nye aka ịkpụzi ihe omume ya na mba ọzọ nke mba ahụ. A na-ewere Ratsimamanga dị ka otu n'ime ndị ọkàmmụta a ma ama na Madagascar ma nye ya nkwanye ùgwù orders of merits kachasị elu n'ime mba nakwa n'etiti mba na mba ụwa. Ọ bụkwa otu n'ime ndị guzobere The World Academy of Sciences (1983) na African Academy of Sciences (1985), a họpụtakwa ya dị ka Man of the Century nke Madagascar.

Mmalite Ndụ na Agụmakwụkwọ Ya[dezie | dezie ebe o si]

Ratsimamanga ka na-eto eto ca. 1924

A mụrụ Albert Rakoto Ratsimamanga na 28 Disemba 1907, na Antananarivo, Madagascar, nye Razanadrakoto Ratsimiamanga na Lala Ralisoa. [1] Ọ bụụrụ nwa nwa Prince Ratsimamanga, nwanne nna na onye ndụmọdụ nke Queen Ranavalona nke Atọ, onye e gburu n'afọ 1897 na mbido ọchịchị ndị France na Madagascar.[2] Mgbe Albert dịịrị naanị afọ iri na otu, nna ya nwụrụ n'afọ 1918 site na Ịñụbiga mmanya ókè.[3]

Ọ natara agụmakwụkwọ n'oge ọ bụ nwata ya na Ngalaba Ọmụmụ-ọgwụ, Mahadum Antananarivo, ruo mgbe ọ ghọrọ dọkịta n'isi ọmụmụ Indigenous Medicine n'afọ 1924. [4][3] Ratsimamanga sooro na òtù ndị nnọchi anya Madagascar na Colonial Exhibition agara na Paris n'afọ 1930,[5][2] bụ oge ọ nọ kpebie isonyere Mahadum Paris ịghọ Dọkịnta sayensị (MS) na Dọkịnta ọgwụ (MD). [6][7] Ọ gụsịkwara akwụkwọ na Institute of Exotic Medicine nakwa Pasteur Institut,[2] ma hiwe òtù Association of Malagasy Students na France.[3]

Ọrụ Ya[dezie | dezie ebe o si]

Ime Nnyocha[dezie | dezie ebe o si]

Ratsimamanga malitere ịrụ ọrụ ná French National Centre for Scientific Research (CNRS) n'afọ 1945 mgbe Frédéric Joliot-Curie, onye nduzi nnyocha nke CNRS na onye nwetara ihe nrite Nobel n'isi ọmụmụ Kemistry (1935), bịakwutechara ya.[4] Na CNRS, ọ bụ onye ọsụ ụzọ na ọmụmụ nke Usoro ọbara mmadụ, na ọgwụgwọ maka Ekpenta na ụkwara nta. [4] Ọrụ Ratsimamanga gosipụtara ọnụnọ nke homonụ na nri na ọrụ ha n'iwulite ahụ mmadụ, ka ha na-ewepụ ihe ndị na-eme ka mkpụrụ ndụ na-ewepụ nsị, ọkachasị na imeju.[8][9][10][11][4]

Ratsimamanga bụụrụ onye isi ntụziaka mmalite nke ụlọ ọrụ Malagasy Institute of Applied Research (IMRA) n'afọ 1957. [12][10] IMRA lekwasịrị anya na Iji mgbọrọgwụ na mkpa akwụkwọ agwọ ọrịa (phytotherapy) iji jiri osisi ndị dị na gburugburu ebe obibi na omume ọdịnala dị iche iche gwọọ ọrịa, ya bụ, pharmacopoeia n'ụzọ ọdịnala.[13][14] IMRA mechara gaa n'ihu n'iji osisi Syzygium cumini dị ka ihe na-egbochi ọrịa shuga,[15] na imepụta ọgwụ ndị ọzọ megide ịba,[16][17] Ekpenta, ụkwara ume ọkụ, lithiasis, ọbara mgbali elu, ịba ọcha n'anya na ọnọdụ ndị ọzọ a na-ahụkarị.[18][4][19]

Ratsimamanga bụụrụ onye isi ụlọ akwụkwọ Malagasy National Academy, nakwa Ọkammụta larala ezumike nka nke Faculty of Medicine, Mahadum Antananarivo. Ọ bụụrụ otu n'ime ndị guzobere World Academy of Sciences n'afọ 1983, [20] na African Academy of Sciences n'afọ 1985. [21] Ọ bụụrụ onye òtù Royal Academy for Overseas Sciences, Institut de France (1966), na Académie Nationale de Médecine (1967).[2][6]

Na Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị[dezie | dezie ebe o si]

Ratsimamanga mgbe ọ na-ekwu okwu na 1948 World Congress Intellectuals in Defense of Peace

Ratsimamanga bụ onye na-eme udo na onye na-arụsi ọrụ ike na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, n'oge ọ na-agụ akwụkwọ, ya na ndị ụbụrụ na-aghọ nkọ nakwa ndị ji ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke France nwere mmekọrịta chiri anya. Mgbe ọ nọ na France, ya na Jacques Rabemananjara, Joseph Raseta na Joseph Ravoahangy Andrianavalona guzobere njikọ nke ụmụ akwụkwọ Malagasy nọ na France nakwa òtù w:Democratic Movement for Malagasy Renovation (MDRM) n'afọ 1946. MDRM duziri ngagharị iwe megide mwufu ọbara nke Mgbukpọ Madagascar nke afọ 1947.[7]Kpọpụta njehie: Closing </ref> missing for <ref> tag[22] Emechara maa Jacques Rabemananjara, Joseph Raseta na Joseph Ravoahangy Andrianavalona ikpe ịnọ n'ụlọ mkpọrọ oge ndụ ha niile mana e nyere ha mgbaghara n'afọ 1958. [23] Ratsimamanga kwuru na ọ maghị banyere nnupụisi ahụ, ya mere, o soghi na ya. [7] Ka e mesịrị n'afọ 1949, Ratsimamanga guzobere Kansụl Mba Madagascar, Gọọmentị nọ n'ebe ọ gbagara zoo. O mechara daa. [7]

N'abalị iri abụọ na isii n'ọnwa Ọgọstụ n'afọ 1948, Ratsimamanga nọchitere anya Madagascar na World Congress of Intellectuals in Defence of Peace, nke mere n'etiti ụbọchị iri abụọ na ise n'ọnwa irị n'afọ 1948 na Mahadum Sayensị na Teknụzụ nke Wrocław, Poland, ma rụọ ọrụ n'ịhazi ike ndị Kọmunist dị ka ndị na-akwado udo, na n'akụkụ nke ọzọ, na-egosi West dị ka ihe iyi egwu nye udo.

Ratsimamanga bụ onye otu ndị nnọchi anya kwurịtara maka nnwere onwe Madagascar site na France. [3] [2]% nke ndị Madagascar vootu maka nnwere onwe na ntuli aka nke afọ 1958, [1] ma mgbe nnwere onwe gasịrị, a họpụtara Ratsimamanga ka ọ bụrụ onye nnọchi anya Mba Madagascar na France site na 1960 ruo 1972. [23] Mgbe 1972 Coup [24]'état gasịrị, na 14 Disemba 1972, a họpụtara ya ka ọ bụrụ onye nnọchi anya mbụ nke mba Madagascar na China na Soviet Union. [25][26] mechara guzobe ụlọ ọrụ nnọchiteanya na West Germany, North Korea, na Sierra Leone. [1] [2]

Ratsimamanga mgbe o gosipụtara asambodo ya na 14 Disemba 1972 na USSR

[22][27], Ratsimamanga na-anọchite anya mba Madagascar na European Economic Community, UNESCO, na Food and Agriculture Organization. [28] ghọkwara osote onye isi oche nke UNESCO nke Executive Council . [1]

Ndụ onwe onye na ọnwụ Ya[dezie | dezie ebe o si]

Ratsimamanga lụrụ Suzanne Urverg-Ratsimamanga na 23 Maachị 1963. [22] Ọ bụụrụ onye French Ashkenazi Jụụ gụrụ biochemistry, [29] onye òtù World Academy of Sciences (1989), [20] na African Academy of Sciences (1987) [21] na onye isi oche IMRA [30] na onye mmekọ kacha nso Albert ya na ya na-arụkọ. [22] Site na njikọaka ya na Albert, ha guzobere "Albert na Suzanne Rakoto Ratsimamanga Foundation" n'ime IMRA.[31][32] Ratsimamanga nwụrụ na 16 Septemba 2001, ka ọ gbachara afọ iri itoolu na atọ, na Antananarivo, Madagascar. Kpọpụta njehie: Invalid parameter in <ref> tag

Ihe Nrite na Nkwanye Ùgwù Ya[dezie | dezie ebe o si]

E nyere Ratsimamanga Grand Cross ihe nrite Grand Cross of the Malagasy National Order, [33] nakwa Grand Cross n'ógó nke mbụ nke Order of Merit nke mba Germany, [34] Grand Officer nke Legion of Honor nke France, [35] Grand Officer nke National Order of Scientific Merit nke France, [35] National Order of the Lion of Senegal, ref name=":10" /> Commander of the Ordre des Palmes académiques [35] Commander of The Order of Merit of Congo - Brazzaville, [33] Commander of the Ordre National du Mèrite of France, [35] na Grand Prize sitere na Royal Academy for Overseas Sciences [34][7] A họpụtara ya dị ka Man of the Century nke Madagascar n'afọ 1999.[33][34][35]

Ratsimamanga bụ onye òtù guzobere World Academy of Sciences (FTWAS) n'afọ 1983, [20] na African Academy of Sciences (FAAS) n'afọ 1985. [21] E nyekwara ya nzere ọkankuzi site na Mahadum Cheikh Anta Diop n'afọ 1973.[36]

Ihe Ncheta Ya[dezie | dezie ebe o si]

stampụ ncheta Ratsimamanga

A na-ewere Albert Rakoto Ratsimamanga dị ka otu n'ime ndị ọkà mmụta ama ama na Madagascar.[37] A Commemorative Stamp ka ewepụtara maka ncheta ya n'afọ 2002, nakwa Institut de France bipụtara ego n'ụdị ụtụ na ncheta Ratsimamanga. [38]Enwere ike ịhụ ihe ncheta Ratsimamanga dị ka

Àtụ:Blockquote  

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. Généalogie de Prof. Rakoto Albert Ratsimamanga (fr).
  2. 2.0 2.1 2.2 2.3 2.4 Universalis, Encyclopædia. ALBERT RAKOTO RATSIMAMANGA (fr-FR).
  3. 3.0 3.1 3.2 3.3 Ratsimamanga, Albert Rakoto (en) (2014). DOI:10.1093/acref/9780195301731.013.50370.
  4. 4.0 4.1 4.2 4.3 4.4 Wambebe, Charles (2018-01-29). African Indigenous Medical Knowledge and Human Health (in en). CRC Press, 118–120. ISBN 978-1-351-71049-7. 
  5. Osseo-Asare, Abena Dove (2014-01-13). Bitter Roots: The Search for Healing Plants in Africa (in en). University of Chicago Press. ISBN 978-0-226-08616-3. 
  6. 6.0 6.1 Albert Rakoto Ratsimamanga (1907-2001) (en).
  7. 7.0 7.1 7.2 7.3 7.4 Ravalitera, Pela (2012-11-30). Madagascar, l'IMRA devient la Fondation Albert et Suzanne Rakoto Ratsimamanga.
  8. Giroud, A.; Ratsimamanga, A. R. (1936). "Distribution de la vitamine C chez les invertebres.". Bulletin de la Société de Chimie Biologique 18: 375–383. 
  9. (2006-11-01) "Hormones in bovine milk and milk products: A survey" (in en). International Dairy Journal 16 (11): 1408–1414. DOI:10.1016/j.idairyj.2006.06.007. ISSN 0958-6946. 
  10. 10.0 10.1 (2010-12-13) "Harnessing biodiversity: the Malagasy Institute of Applied Research (IMRA)". BMC International Health and Human Rights 10 (Suppl 1): S9. DOI:10.1186/1472-698X-10-S1-S9. ISSN 1472-698X. PMID 21144080. 
  11. Daniel Schaffer, Peter McGrath, Gisela Isten, Tasia Asakawa. Malagasy Institute for Applied Research. TWAS. 
  12. Madagascar pushes untested herbal coronavirus remedy on its neighbors (en-US) (2020-05-14).
  13. Goodman, Steven M. (2022-11-15). The New Natural History of Madagascar (in en). Princeton University Press. ISBN 978-0-691-22262-2. 
  14. (2022-08-04) "Ethnogynaecological Knowledge of Traditional Medicinal Plants Used by the Indigenous Communities of North Waziristan, Pakistan" (in en). Evidence-Based Complementary and Alternative Medicine 2022: e6528264. DOI:10.1155/2022/6528264. ISSN 1741-427X. PMID 35966728. 
  15. (2001) Official Gazette of the United States Patent and Trademark Office: Patents (in en). U.S. Department of Commerce, Patent and Trademark Office. 
  16. (2000-05-01) "Reversal activity of the naturally occurring chemosensitizer malagashanine in Plasmodium malaria" (in en). Biochemical Pharmacology 59 (9): 1053–1061. DOI:10.1016/S0006-2952(99)00400-1. ISSN 0006-2952. PMID 10704934. 
  17. (1992-09-01) "Medicinal plants used to treat malaria in Madagascar" (in en). Journal of Ethnopharmacology 37 (2): 117–127. DOI:10.1016/0378-8741(92)90070-8. ISSN 0378-8741. PMID 1434686. 
  18. Eddouks, Mohamed (2016-02-02). Phytotherapy in the Management of Diabetes and Hypertension (in en). Bentham Science Publishers. ISBN 978-1-68108-161-8. 
  19. Albert Rakoto Ratsimamanga Inventions, Patents and Patent Applications - Justia Patents Search.
  20. 20.0 20.1 20.2 Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; no text was provided for refs named :7
  21. 21.0 21.1 21.2 Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; no text was provided for refs named :8
  22. 22.0 22.1 22.2 22.3 Galibert, Didier (2012). "Cosmopolitisme impérial et nationalisme: La vie circulaire d'Albert Rakoto Ratsimamanga (1907-2001)". French Colonial History 13: 175–187. DOI:10.1353/fch.2012.0004. ISSN 1539-3402. 
  23. 23.0 23.1 (2007) Representations of Justice (in en). Peter Lang. ISBN 978-90-5201-349-7. 
  24. (1973-05-16) Current Background (in en). American Consulate General. Retrieved on 2022-11-23. 
  25. China) (1973). Survey of China Mainland Press (in en). American Consulate General.. Retrieved on 2022-11-23. 
  26. Service. Translations on Sub-Saharan Africa (in en). Retrieved on 2022-11-23. 
  27. Conference (1972). Records of the General Conference of the United Nations Educational, Scientific and Cultural Organization (in fr). Unesco, 768. Retrieved on 2022-11-23. 
  28. Resolutions and decisions adopted by the Executive Board at its sixty-fourth session, Paris, 13-14 December 1962. unesdoc. Archived from the original on 2022-11-18. Retrieved on 2022-11-18.
  29. DE LA POUSSIÈRE À L'ÉTOILE - Itinéraire d'une scientifique Suzanne Ratsimamanga, Hai Viet Ho (fr).
  30. (1992) Profiles of African Scientific Institutions (in en). African Academy of Sciences and Network of African Scientific Organizations. ISBN 978-9966-831-11-8. 
  31. Artemisia et plantes médicinales : le " Covid-Organics ", symbole de la recherche malgache – Jeune Afrique (fr-FR) (30 April 2020).
  32. (2011) "Pharmacological screening of some traditionally-used antimalarial plants from the Democratic Republic of Congo compared to their ecological taxonomic equivalence in Madagascar" (in en). International Journal of Biological and Chemical Sciences 5 (5): 1797–1804. DOI:10.4314/ijbcs.v5i5.3. ISSN 1997-342X. 
  33. 33.0 33.1 33.2 Grand-Croix de l'Ordre national (fr-FR) (30 September 2019).
  34. 34.0 34.1 34.2 Albert Rakoto Ratsimamanga : Un hommage incontournable (fr).
  35. 35.0 35.1 35.2 35.3 35.4 Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; no text was provided for refs named :11
  36. Université Cheikh-Anta-Diop. Liste des docteurs honoris causa de l'UCAD (fr). Archived from the original on 24 December 2015. Retrieved on 28 December 2023.
  37. Six personnalités qui ont fait ou font Madagascar (fr) (2013-12-12).
  38. iNumis - Mail Bid Sale 32 Lot 1558 (fr).

Ịgụ ihe ọzọ[dezie | dezie ebe o si]