Amina Mama

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Amina Mama
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria, Obodoézè Nà Ofú Dezie
Aha enyereAmina Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya19 Septemba 1958 Dezie
Ebe ọmụmụKaduna Dezie
Dị/nwunyeNuruddin Farah Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụacademic, onye edemede Dezie
onye were ọrụUniversity of California, Davis, University of Cape Town, Mills College at Northeastern, International Institute of Social Studies Dezie
Ọkwá o jiPrince Claus Chair Dezie
ebe agụmakwụkwọLondon School of Economics and Political Science, University of St Andrews, Birkbeck, University of London Dezie
onye nlereranyaJean-Paul Sartre, Frantz Fanon, Edward Said, Simone de Beauvoir Dezie
nnọchiaha nkeonweL484 Dezie

Amina Mama (amụrụ 19 Septemba 1958) bụ onye odee akwụkwọ si n'ala Naijiria na British, ọ bụ onye na-alụ ọgụ gbasara ụmụ nwanyị ma bụrụ onye ụbụrụ na-ahọ nkọ ma abịa n'ihe agụmakwụkwọ [1] Isi ebe o lekwasịrị anya bụ mgbe post-kolonịalizm, ihe gbasara agha na okwu gbasara nwoke na nwanyị. O biri na ala Africa, Europe, na North America, ma rụọ ọrụ iji wulite mmekọrịta n'etiti ndị na-alụ gbasara ụmụ nwaanyị na mba ụwa niile.

A mụrụ Mama na Mgbago ugwu Naijiria [2] na 1958 n'ezigbo ụlọ. Nna ya bụ onye Naijiria na nne ya bụ onye Bekee. [3] Dị ka Mama si kwuo, ọnọdụ ezinụlọ ọ hụrụ onwe ya na nzụlite ya etolitela echiche ụwa ya. [4] Na 1992 ọ lụrụ Nuruddin Farah, [5] onye ya na ya nwere ụmụ abụọ. [6]

O tolitere na Kaduna, agbụrụ na okpukperechi dị iche iche mejupụtara Mgbago ugwu Nigeria. Ebe ndị nna nna si, ka-achọpụtara na ọ bu na obodoBida . [4] Ọtụtụ ndị ezinụlọ Mama tinyere aka na mmepe maọbu nkwalite agụmakwụkwọ nke post-kolonịal. [7] N'afọ 1966, ọ hapụrụ obodo ya na Naijiria n'ihi ọgbaghara megidere ndị Alakụba .

Mama si na Naijiria gawa UK wee gụkwuo akwụkwọ na Mahadum St. Andrews, Scotland (1980, nzere sayensị na ugwu n'ihe ọmụmụ saịkọlọjị), na London School of Economics and Political Science, University of London (1981, Masta na Sayensị n'ihe ọmụmụ Soshal saịkọlọjị) na Birkbeck College, University of London, ebe na 1987 o nwetara dọktọratiya na nhazi saịkọlọjị ya na ihe nchọpụta ya nke isiokwu ya bụ "Race and Subjectivity: A Study of Black Women". Ụfọdụ n'ime ọrụ mbụ ya gụnyere ịtụnyere ọnọdụ ụmụ nwanyị Britain na Naijiria. [8] Ọ kwagara Netherlands wee laghachi azụ Nigeria, naanị na o zutere n'afọ 2000. [9] Mgbe ahụ ka ọ kwagara na South Africa, bụ ebe ọ malitere ịrụ ọrụ na Mahadum Cape Town (UCT). Na UCT, ọ ghọrọ onye nduzi nke African Gender Institute (AGI) ma nyere aka chọta akwụkwọ akụkọ ya Feminist Afrịka . [9] Mama ka bụ onye nchịkọta akụkọ Feminist Afrịka .

N'afọ 2008, Mama nwetara ọkwa na Mills College na Oakland, California naUnited States. Mgbe ọ kwagara, o kwuru, sị: "Amụtala m na America abụghị naanị na oburu ibu kama ọ bụ isi ahụrụ kwaba okpu n'ihe ime ka mmadụ kwenyere ihe ọchọghị ikwenyere na ya." [10] Ọkà mmụtaMama ghọrọ Barbara Lee n'oche ugwu gbasara ọchịchị ụmụ nwaanyị na Mills— Mama bụ onye mbụ nwere ọkwa a. Ọ kụziri otu klas akpọrọ "Ezigbo iwu, ndọrọ ndọrọ ọchịchị n'ezie" na ọgbakọ ụmụ nwaanyị Lee na isiokwu gbasara ụmụ nwanyị Afrịka na Afrịka-Amerịka, gụnyere ọrụ nwoke na nwanyị, ịda ogbenye, HIV / AIDS, na ihe gbasara agha. Ọ bụkwa onye isi oche nke ngalaba mmụta gbasara nwoke na nwanyị na Mahadum California, Davis . [11]

Mama bụ Onye isi oche nke ndị isi ụlọ ọrụ maka Global Fund for Women, ma na-adụ ọtụtụ òtù mba ụwa ndị ọzọ ọdụ. Ọ soro bugo ndi isi ochenited Nations Research Institute for Social Development n'ọgbakọ ha.

Mama na-eje ozi na bọọdụ ndụmọdụ maka agụmakwụkwọ ndị na-alụ ọgụ gbasara ụmụ nwanyị na akwụkwọ Meridians na signs. [12] [13]

Otu n'ime ọrụ ya a kacha mara amara bụ Beyond the Masks: Race, Gender and Subjectivity . Ọ na-etinyekwa aka n'ọrụ ihe nkiri. N'afọ 2010, o mebere ihe nkiri The Witches of Gambaga na Yaba Badoe . [14] [15]

Mama na-akọwa onwe ya dị ka onye na-alụ ọgụ nwanyị na ọ bụghị onye na-agba ụmụ nwanyị ibe ya azu,ọ mitere ndọrọ ndọrọ nkwenye re na ọgụ gbasara ụmụ nwaanyị malitere na Afrịka na ọgụ gbasara nwanyị ndị ọcha "enwebeghị ike ịbụ 'onye iro' - n'ụzọ dị otú ahụ, a pụrụ ile isi obodo ụwa anya dị ka onye iro ". [7] Ọ katọrọ okwu ụmụ nwaanyị na mmepe maka iwepụ ọmụmụ nwoke na nwanyị nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị bara uru. [16] Ọ rụkwara ụka na mahadum Africa na -aga n'ihu na-egosipụta ikike nna ochie gbanyere mgbọrọgwụ, n'ihe gbasara ma mmekọrịta nwoke na nwanyị na ụlọ akwụkwọ nwoke na nwanyị na ụlọ ọrụ. [17]

Akụkụ bụ ahughi ebule ma asi elia dike nke mmasị Mama metụtara bụ njirimara nwoke na nwanyị dịka ọ na-emetụta ihe gbasara agha. Ọ bụ onye nkatọ n'ezoghị ọnụ nke AFRICOM, nke ọ kọwara dị ka akụkụ nke mmịpụta akụ neocolonial na-eme ihe ike. [18]

Mbipụta[dezie | dezie ebe o si]

Edensibịa[dezie | dezie ebe o si]

  1. Correspondent (2020-09-19). Amina Mama Celebrates Her 62nd Birthday Today (en-GB). ABTC. Retrieved on 2020-11-01.
  2. "One-way ticket just isn't an option", Times Higher Education, 13 January 2006.
  3. Mama (1995). Beyond the Masks: Race, Gender and Subjectivity. Routledge, 79. ISBN 0415035449. 
  4. 4.0 4.1 Mama. GWS Africa – Amina Mama. GWS Africa. Archived from the original on 24 August 2010. Retrieved on 27 October 2012.
  5. "Farah, Nuruddin", Encyclopedia.com.
  6. Dinitia Smith, "A Somali Author as Guide to a Dantean Inferno", New York Times, 19 May 2004.
  7. 7.0 7.1 Amina Mama interviewed by Elaine Salo, "Talking about Feminism in Africa", reproduced in Women's World from Agenda, "African Feminisms I", no. 50 (2001).
  8. See editor's preface to Mama's "Black Women, the Economic Crisis, and the British State", reprinted in Modern Feminisms (1992), ed. Maggie Humm, p. 150.
  9. 9.0 9.1 Karen MacGregor, "One-way ticket just isn't an option", Times Higher Education, 13 January 2006. Accessed 16 November 2012.
  10. Andrea Wolf, "Scholar describes issues facing African women", Contra Costa Times, 22 May 2008.
  11. "Amina Mama" on SSRC (Social Science Research Council), accessed 24 October 2012.
  12. Indiana University Press - Meridians - IU Press Journals (en). Indiana University Press. Archived from the original on 2018-09-16. Retrieved on 2017-08-22.
  13. "Masthead", Signs: Journal of Women in Culture and Society, 2012-08-22. Retrieved on 2017-08-22. (in en-US)
  14. Yaba Badoe interviewed by Paul Boakye: "Women in Film: Yaba Badoe on The Witches of Gambaga", Colorful Times, 1 October 2010.
  15. "The Witches of Gambaga: About", accessed 24 October 2010.
  16. Thandika Mkandawire (ed.), "Introduction" to African Intellectuals: Rethinking Politics, Language, Gender and Development, London: Zed Books and CODESRIA, 2006.
  17. Candes Keating, "Universities riddled with gender bias, says UCT prof", Cape Argus, 9 August 2007.
  18. Amina Mama, "Where we must stand: African women in an age of war", opendemocracy, 15 April 2012 (originally published September 2011).