Aminat Adeniyi

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ


 

Aminat Adeniyi
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
obodo maka egwuregwuNaijiria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya21 Eprel 1993 Dezie
Ebe ọmụmụAkure Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụamateur wrestler Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)2010 Dezie
ụdị egwuregwuwrestling Dezie

Aminat Oluwafunmilayo Adeniyi (amụrụ n'abalị iri abụọ na otu n'ọnwa Eprel n'afọ 1993) bụ nwanyi onye Naijiria na-agba mgba.[1] O sonyere na asọmpi ụmụ nwanyị freestyle 58 kg n'afọ 2014 Commonwealth Games ebe o ritere ihe nrite ọla edo.[2][3]

Ọ bụ onye mmeri mba Naijiria na ịgba mgba na Naịjirịa kemgbe afọ 2009 ruo taa, onweghị onye ọ bụla ọzọ na Naịjarịa gáfèrè ya. N'afọ 2010, ọ sonyeere na Junior African Championship na Egypt ebe o ritere ihe nrite ọla edo. Ọ gara n'ihu na-achọ otuto mgbe ọ na-asọmpi na Senior African Wrestling Championship na Morocco, na 2012 ebe ọ bụ onye nrite ọlaọcha.

N'afọ 2013, Aminat Adeniyi bụkwa onye nnọchi anya ụmụ nwanyị Naijiria na Commonwealth Championship na South Africa, ebe o ritere ihe nrite ọlaọcha. O sonyere na Senior African Wrestling Championship na Tunisia, 2014, ebe e chiri ya onye mmeri Afrịka nke ụdị ya. Ihe mba ụwa ọ rụzuru n'èzí ụsọ oké osimiri Afrịka bụ na Commonwealth Championship n'otu 2014 Glasgow, Scotland, ebe ọ meriri ma rite kwá ọla edo.

Ọ bụkwa onye na-eme egwuregwu sonyere na Senior African Wrestling Championship na Egypt, 2015, ebe ọ mechara asọmpi ahụ dị ka onye nwetara ọlaọcha. N'afọ 2015, egwuregwu Africa niile nke iri na otu na Congo Brazzaville, ọ bụ onye nnọchi anya Naijiria na ngalaba ya dị ka onye mgba ma merie rite kwá ọla edo. Otu afọ mgbe e mesịrị, 2016, ọ sonyeere na Senior African Wrestling Championship nke emere na Egypt ebe ọ meriri nrite ọla edo. N'otu afọ ahụ 2016, o ritere ihe nrite ọlaọcha na asọmpi Olimpik na Algeria nke mere ka ọ ruo eru dị ka onye na-eme egwuregwu na ihe omume Olimpik nke Rio 2016. O sonyere na Grandprix nke Spain na 2016, ebe o ritere ọla nchara.

N'afọ 2017, ọ bụ onye mmeri Afrịka na nnukwu ụdị nke asọmpi ịgba mgba nke emere na obodo Morocco. N'otu afọ 2017, ọ lụrụ ọgụ na Wrestling World Championship na France ebe ọ ghọrọ Number eight(8) n'ụwa. N'afọ 2018, o sonyere na Senior African Wrestling Championship nke emere na Port-Harcourt, Rivers State, Nigeria ma merie nrite ọla edo.

Onye bụbu onye isi ala Goodluck Jonathan nyere ya nsọpụrụ mba, Member of Order of Niger, MON na 2014 iji kwado nnukwu ihe ọ rụzuru n'egwuregwu.

Ọ bụ otu n'ime ndị Naijiria, dị ka onye na-agba mgba n'efu, na 2019 African Games nke emere na Rabat, Morocco ebe ọ meriri Etane Ngollo B. si Cameroon na mmeri, n'enyeghị ihe n'oge mmeri ikpeazụ, iji nweta ọla edo nke 62kg nke mere ka ọ bụrụ onye mmeri mgbe niile.

Ọ gara Mahadum Adekunle Ajasin, Akungba Akoko, Ondo Steeti, Nigeria ebe ọ nwetara akara ugo mmụta mbụ na sayensị ndọrọ ndọrọ ọchịchị, n'afọ 2012. Mgbe ọ nọ na mahadum, ọ bụ onye nduzi egwuregwu nke ngalaba sayensị ndọrọ ndọrọ ọchịchị n'etiti afọ 2010- 2011. A họpụtakwara ya n'enweghị onye na-emegide ya dị ka onye nduzi egwuregwu nke ngalaba nke sayensị mmekọrịta na njikwa nke Mahadum Adekunle Ajasin n'etiti afọ 2011-2012, ọfịs ọ nọ na ya ruo mgbe ọ gụsịrị nzere mbụ ya na 2012.

N'afọ 2020, o ritere ihe nrite ọlaọcha na ihe omume ụmụ nwanyị nke 62 kilogram na 2020 African Wrestling Championships.[4][5] O ruru eru na 2021 African & Oceania Wrestling Olympic Qualification Tournament iji nọchite anya Naijiria na 2020 Summer Olympics na Tokyo, Japan.[6][7] O sonyere na asọmpi ụmụ nwanyị nke 62 kilogram.

Ebemsidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. Glasgow 2014 profile. Archived from the original on 21 October 2014. Retrieved on 16 October 2014.
  2. "Commonwealth Games: Adekuoroye, Adeniyi win wrestling gold", 360 nobs website, 31 July 2014.
  3. Akhidenor. "Louisa Porogovska wins bronze in women's 55kg wrestling", The Cable, 30 July 2014. Retrieved on 16 October 2014.
  4. Olanowski. "Adekuoroye Climbs to World No. 1 After Winning Fifth African Title", United World Wrestling, 8 February 2020. Retrieved on 9 February 2020.
  5. 2020 African Wrestling Championships Results Book. United World Wrestling. Archived from the original on 16 June 2020. Retrieved on 16 June 2020.
  6. Shefferd. "Hosts Tunisia claim four more Tokyo 2020 berths on day two of UWW Africa and Oceania Olympic qualifier", InsideTheGames.biz, 3 April 2021. Retrieved on 3 April 2021.
  7. 2021 African & Oceania Wrestling Olympic Qualification Tournament Results Book. United World Wrestling. Archived from the original on 5 May 2021. Retrieved on 5 May 2021.