Amy Goodman

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Amy Goodman
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNjikota Obodo Amerika Dezie
aha n'asụsụ obodoAmy Goodman Dezie
Aha enyereAmy Dezie
aha ezinụlọ yaGoodman Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya13 Eprel 1957 Dezie
Ebe ọmụmụWashington, D.C. Dezie
nwanneSteven N. Goodman, David Goodman Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Spanish Dezie
Asụsụ ọ na-edeBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ntaakụkọ Dezie
ebe agụmakwụkwọRadcliffe College, Bay Shore High School, College of the Atlantic Dezie
Onye òtù nkeAmerican Academy of Arts and Sciences Dezie
has written forThe Nation Dezie
Amy Goodman

Amy Goodman (Amụrụ n'April 13, 1957) bụ onye nta akụkọ mgbasa ozi America, onye na-ede akwụkwọ akụkọ, onye na'ime akụkọ nyocha, na onye edemede. Ọrụ odeakụkọ nyocha ya gụnyere mkpuchi banyere mmegharị nnwere onwe nke East Timor, mmeri Morocco na Western Sahara, na ọrụ Chevron Corporation na Naịjirịa.

Kemgbe afọ 1996, ọ bụ onye isi na-akwado Democracy Now!, mmemme akụkọ zuru ụwa ọnụ na-aga n'ihu na redio, telivishọn na Ịntanetị. Ọ natala onyinye maka ọrụ ya, gụnyere Thomas Merton Award n'afọ 2004, Right Livelihood Award n'afọ 2008, na Izzy Award n'afọ 2009 maka "ihe pụrụ iche ọ rụzuru na mgbasa ozi onwe ya".

N'afọ 2012, Goodman natara onyinye udo Gandhi maka "onyinye dị mkpa maka ịkwalite udo mba ụwa na-adịgide adịgide". Ọ bụ onye dere akwụkwọ isii, gụnyere afọ 2012 The Silenced Majority[1]: Stories of Uprisings, Occupations, Resistance, and Hope, n'afọ 2016 Democracy Now!: Twenty Years Covering the Movements Changing America.[2] N'afọ 2016, e boro ya ebubo mpụ maka ọgba aghara n'ihe metụtara mkpuchi ya banyere ngagharị iwe nke pipeline Dakota Access.[3] Kọmitii Na-echebe Ndị nta akụkọ katọrọ omume a. Ọ bụ onye ọka ikpe mpaghara North Dakota jụrụ ebubo ahụ n'ụbọchị iri na asaa nke ọnwa Ọktoba n'afọ 2016.[4]

Ebenside[dezie | dezie ebe o si]

  1. The Silenced Majority: Stories of Uprisings, Occupations, Resistance, and Hope at Haymarketbooks.org. Retrieved March 23, 2013.
  2. Goodman (April 12, 2016). Democracy Now!: Twenty Years Covering the Movements Changing America, 1st, Simon & Schuster, 384. ISBN 978-1501123580. 
  3. Grueskin. "Defense attorney questions prosecutor in Amy Goodman case", Bismarck Tribune, October 13, 2016. Retrieved on October 14, 2016.
  4. Merlan. "Judge Rejects Proposed Riot Charges Against Democracy Now! Host Amy Goodman", Jezebel. Retrieved on October 21, 2016. (in en-US)