Anike Agbaje-Williams

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Anike Agbaje-Williams
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereAnike Dezie
aha ezinụlọ yaAgbaje Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya23 Ọktoba 1936 Dezie
Ebe ọmụmụAbeokuta Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụokoo akuko Dezie
ebe agụmakwụkwọSt Anne's School, Ibadan Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)1955 Dezie


Ndụ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Agbaje-Williams na Abeokuta na abalị iri abụọ na atọ nke ọnwa Ọktoba, 1936. Ọ bụ nwa nwanyị nke atọ a mụrụ nye Mr. Kuforiji, nna ya bu onye nketa Egba. Ọ gara ụlọ akwụkwọ praịmarị ya na ụlọ akwụkwọ junịọ sekọndrị na Lagos n'okpuru onye nlekọta ya, bụ Mrs Gbemisola Rosiji, nwunye nke Ayo Rosiji na Bishop na Mrs SC Philips. Ọ gara ụlọ akwụkwọ CMS Girls. N’afọ 1950, mgbe akwaara ụlọ akwụkwọ ụmụ nwanyị CMS ga Ibadan wee gụharia ya ụlọ akwụkwọ St Anne, ọ sokwara na nkwaharị ụlọ akwụkwọ ahụ ma gụchaa akwụkwọ ya n’Ibadan.

Mgbe ọ gụsịrị agụmakwụkwọ sekọndrị, ọ nwetara ọrụ na Nigerian Broadcasting Corporation na Ikoyi, Lagos na 1955. Ọrụ Abgaje-Williams dịka onye na-agụ akụkọ malitere site na onye ọrụ ibe ya abiaghị ọrụ. N'ụbọchị ahụ, otu onye ọrụ ibe ya nke na-ekwupụta ọkwa ma ọ bụ na-agụ obere ihe ọmụma na redio abịaghị, onye njikwa ụlọ ọrụ gwaziri ya ka ọ nọchie ya. Agbaje-Williams gụrụ ozi ahụ ma mgbe onye nlekọta ahụ nụrụ olu ya, ọ masịrị ya, mgbe ahụ a gwara ya ka ọ sonye na ngalaba mmemme dịka onye ọrụ na ama ọkwa ozi[1]

Mgbe e guzobere ụlọ ọrụ telivishọn na Ibadan, a gwara ya ka ọ gbaa ajụjụ ọnụ ma mesịa nye ya ọrụ na ọdụ ahụ. Agbaje-Williams bụ onye ọkaibe na-arụ ọrụ na WNTV, bụ ụlọ ọrụ telivishọn mbụ na Naịjirịa, ọ bụkwa nwanyị mbụ na-agbasa ozi n'ọdụ redio ahụ. O ruru ogo ịbụ onye na-emepụta ihe na onye nduzi nke mmemme na ụlọ ọrụ telivishọn tupu ọ laa ezumike nká na 1986.

Nrụtụaka[dezie | dezie ebe o si]