Aya Nakamura
| Ụdịekere | nwanyị |
|---|---|
| Mba o sị | France, Mali |
| Aha ọmụmụ | Aya Coco Danioko |
| Aha enyere | Aya, Coco |
| Aha ezinụlọ ya | Nakamura, Danioko |
| Aha pseudonym | Aya Nakamura |
| Ụbọchị ọmụmụ ya | 10 Mee 1995 |
| Ebe ọmụmụ | Bamako |
| Dị/nwunye | Niska, Vladimir Boudnikoff, RK |
| Asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | French, Asusu igbo |
| Ọrụ ọ na-arụ | odee egwu, onye na-abụ abụ |
| Oge ọrụ ya (mmalite) | 2014 |
| Ngwa egwu | olu egwụ |
| Diskografi | Aya Nakamura discography |
| A gụrụ aha | Hiro Nakamura |
| Ụdị | Afrobeat, French contemporary R&B, pop urbaine, zouk, reggaeton |
| Akara ndekọ | Warner Music France, Rec. 118, Parlophone |
| Ihe nrite | OkayAfrica 100 Women, 22nd annual NRJ Music Awards, Victoires de la Musique – Female artist of the year |
Aya Coco Danioko (amụrụ 10 Mee 1995), nke a maara dị ka Aya Nakamura, bụ onye French na Malian na-agu egwụ. Egwu ya Brisé nwetara traction na YouTube, yana duet ya na onye na-agụ egwú Fababy, Love d'un voyou, rụpụtara na eserese ya na France na nke mbụ ya. O weputara album izizi ya, Journal intime, na 2017, sochiri na 2018 site na Nakamura, nke enyerela asambodo diamond na France ma ree ihe karịrị 1.2 million n'ụwa niile. Album ahụ weputara egwụ Djadja na Copine weru malite ọrụ onye ọbụ abụ na mba ụwa. N'otu afọ ahụ, ọ meriri ndekọ Edith Piaf nwere kemgbe 1961 dị ka nwanyị francophone kacha ege ntị na Netherlands.[1]
Ndụ mbido ya
[dezie | dezie ebe o si]A mụrụ Aya Nakamura na Bamako, Mali, na 10 May 1995. O sitere na ezinụlọ ndị a na po griot, ha wu ndị na-akọ akụkọ na West Africa na ndị na-ede uri nke omenala ọnụ. Ya na ezinụlọ ya kwagara France mgbe ọ bụ nwata. Ọ bụ ya bụ ọkpara n'ime ụmụnne ise.[2]
Aya Nakamura gụrụ ejiji na La Courneuve. O mechara malite n'egwu n'okpuru aha ogbo bụ Aya Nakamura, ka agwa Hiro Nakamura nke ndị dike akụkọ ihe nkiri sayensị America.[3]
Ọrụ
[dezie | dezie ebe o si]Mgbe ọ dị afọ 19 ọ malitere ibipụta egwu ya n'ịntanetị, na-enweta ndị na-eso ya na egwu Karma na J'ai mal. Na 2016, o mere abụ Brisé wee soro ya Love d'un Voyou nke na-egosi rapper Fababy. Ya na onye egwu Naijiria Davido gbara egwu.
N'April 2018, Nakamura wepụtara Djadja - nke mbụ sitere na album nke abụọ ya Nakamura.[4]
Na Julaị 2020, Nakamura wepụtara otu Jolie nana, site na album studio nke atọ ya, Aya.
Na 2022, o wepụtara Dégaine na Mechante, na 2024 weputara Hypé na-esote remix na mmekorita ya na Ayra Starr.[5][6]
Ihe nketa na onyonyo ọha
[dezie | dezie ebe o si]Aya Nakamura emeriela ọtụtụ ihe nrite na nkwanye ugwu.[1][7]
Na 23 Febrụwarị 2025, vidiyo egwu ya "Djadja" ghọrọ egwu asụsụ French nke anọ karịrị otu ijeri nlele na YouTube. Ọ bụ onye egwu Afrịka izizi nwere vidiyo nwere ihe karịrị otu ijeri nlele.[4]
A kọwawo ya dị ka onye nkwuwa okwu dabere na egwu ya.[3]
Tupu egwuregwu nke 2024 na Paris, a na-anụ kepu kepu na ọ ga-eme mmemme na emume mana ụfọdụ ndị na-akparị agbụrụ na France achọghị ya. Agbanyeghị, o mechara mee..[8]
Ndụ nke onwe
[dezie | dezie ebe o si]Ntụaka
[dezie | dezie ebe o si]- 1 2 Aya Nakamura, onye omenkà French kacha gee ntị na mba ofesi (fr) (11 May 2023).
- ↑ Oyiri, Christelle (13 November 2018). Aya Nakamura na-atụgharị iwu siri ike nke France, mara mma (en).
- 1 2 Amrani, Iman (23 January 2019). Aya Nakamura: ihu ike ike nke afroop na-achọghị (en).
- 1 2 Aya Nakamura : le clip de son tube "Djadja" dépasse le milliard de vues sur YouTube et bat des records (fr) (23 February 2025).
- ↑ Lachasse, Jérôme (7 January 2023). Aya Nakamura annonce la sortie de son prochain album, « DNK » (fr-FR).
- ↑ Lapointe, Thomas (8 March 2024). « Hypé » : Aya Nakamura dévoile son nouveau clip en compagnie de la star nigériane Ayra Starr (fr-FR).
- ↑ Les certifications (fr-FR).
- ↑ Dodman, Benjamin (15 March 2024). Mwakpo ịkpa ókè agbụrụ megide pop star Aya Nakamura nwalere ike France na-enwu na Paris Olympic (en).
- ↑ La chanteuse Aya Nakamura annonce la naissance de son deuxième enfant (fr-FR) (6 January 2022).