Babalola Chinedum Peace

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Jump to navigation Jump to search
Professor Babalola Chinedum Peace

Babalola Chinedum Peace (nee Anyabuike) FAS, FAAS bu nnukwu ada Naijiria, onye oke nmuta na ime ogwu eji azo ndu nke ana akpo profeso na olu oyibo. Obu kwazi nwanyi mbu na ulo akwukwo mahadum di na Ibadan, Naijiria nwetalu onodua. Ebe onwere nmasi na ihe nmuta ya na ihe gbasara ogwu bu na nnyocha ogwu, PK/PD famakojenitiks, famakojenomiks, famasitikal na bayotiks. Obukwa ya na ahukota akuku ihe gbasara nkuzi maka ogwu na mahadum nke Ibadan. Nwanyi a bukwa ya choputara ihe ana akpo na oyibo Hai-pefomance likwid kromatografy. Uzo esi amarazi maka ogwu kwunin nime bayometriks. Nchoputa nwanyi a choputara nyere aka na imata ihe gbasara ogwu iba nke ana akpo maleria na ahu ndi oji. Obukwa ya na ndi otu ya bukwa ndi mbu choputara ihe mere ndi na aya oya sikul cell nwere gin CYP2C19 na aru adghi agbali ogwu nke oma. 

Ogugu Akwukwo[mèzi | mèzi mkpụrụ]

Chinedum nwetalu asambodo nke Famacy (B,Pharm) na afo 1983 n'ulo akwuko mahadum nke di na Ife, nke ana akpozi Obafemi Awolowo Univasiti. Ozo bukwa nnukwu asambodo nke dokita (PH.D) na ogugu akwuko nke Famacoloji na ofu ulo akwukwo ahu na afo 1997. Ojekwara na mahadum obodo oyibo di na British Columbia, obu na ebea ka onwetara asambado ana akpo pri-doctoral feloship.

Ije Olu Aka[mèzi | mèzi mkpụrụ]

Chinedum maritere olu dika onye nnukwu nkuzi na mahadum nke Ibadan na afo 1998, ofu aho oji were weta asambodo dokita ya (PH.D) na ulo akwukwo mahadum Obafemi Awolowo. Okuzirikwara nkuzi na ulo akwukwo Obafemi Awolowo tupu ogaba na mahadum nke Ife. Obukwa na ulo mahadum nke Ife ka emere onye nnukwu nwanyi mbu nke anakpo Profeso na olu bekee na afo 2006. Ochikotara ngalaba Famasitikal Kemistri ugboro abua tupu ebulie ya ka oburu nwanyi mbu na afukota maka ndi nile na agu maka ihe gbasara ogwu.