Bilkisu Funtuwa

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Bilkisu Funtuwa
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1960 Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaAsụsụ Hausa, pidgin Naịjirịa Dezie
Asụsụ ọ na-edeAsụsụ Hausa Dezie
Ọrụ ọ na-arụode akwukwo ifo, Odee akwụkwọ Dezie
Ebe obibiFuntua Dezie
okpukpere chi/echiche ụwaOkpukpere Alakụba Dezie
nnọchiaha nkeonweL484 Dezie

Hajiya Bilkisu Salisu Ahmed Funtuwa bụ onye ode akwụkwọ Naijiria . Ọ na-ede akwụkwọ ọgụgụ na Awụsa na-elekwasị anya n'ụmụ nwanyị Alakuba bụ ndị isi . [1] Ọ bu otu n’ime ndi a mara akuko banyere akwukwo ha ama dika “Kano market literature” ma obu Littattafan Soyayya - “books of love”.

Akwụkwọ akụkọ ya jikọtara isiokwu nke ị kwalite ụmụ nwanyị na i nye nwanyị oke ha nke metụtara ndị Awụsa na Alakụba, nke sitere na ahụmịhe nke ya dịka onye otu ndị otu a. [2] Bilkisu Funtuwa na-akwusi ike n'ọrụ a na-atụ anya n’aka ya na omume okpukpe nke ịlụ karịa otu nwanyị bụ nke bụ ndụ nke ụmụ nwanyị Awụsa, na-edekwazị banyere etu a ga-esi luso ọnọdụ ndị a agha. Ọrụ Funtuwa na-elekwasị anya na ndị isi nwanyị na-eji agụmakwụkwọ ha yana ofufe okpukpe ha bulie onwe ha elu nke ọma. Ndị a na-arụ ọrụ nke ndị ọka ikpe, ndị dọkịta, na ndị ọrụ gọọmentị ma na-ebikwazị ndụ dịka ndị ọchụnta ego bara ọgaranya. Otu n'ime isiokwu akọwapụtara nke ọma n'ọrụ ya bụ ịhụnanya miri emi. N'ime ọrụ ya, di na nwunye na-emekọrịta mmekọrịta juputara na nkwanye ugwu, mmekọrịta chiri anya, na ihe ụtọ oge ha abụọ. [3] Na-ilekwasị anya na ụmụ nwanyị ị na-achịkwa ezinụlọ ha, akwụkwọ akụkọ ya na-agbakwa ụmụ nwanyị Alakuba ume ka ha lekwasị anya na agụmakwụkwọ ma na-ejigide okwukwe ha. [1]

Funtuwa na ezi na ụlọ ya bi na Funtua,na Katsina Steeti, na Naijiria .

Akwụkwondị o dere[dezie | dezie ebe o si]

  • 1994: 'Allura Cikin Ruwa ( Needle in a Haystack )
  • 1996: Wa Ya San Gobe ( Who Knows Tomorrow Will Bring?)
  • 1997:)

Ebem si dee[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 Sheldon, Kathleen E. (2005). Historical Dictionary of Women in Sub-Saharan Africa. Scarecrow Press, 88. ISBN 0-8108-5331-0. 
  2. Sheme, Ibrahim (7 April 2007). Bilkisu Funtuwa Interview. author. Bahaushe Mai Ban Haushi! blog. Retrieved on 30 July 2009.
  3. Whitsitt, Novian (April 2003).